Satode Izu uka nke mbu n'oge ncheta ahuhu Kristi Maria Josefa of the Heart of Jesus Violet

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Mi 7: 14-15, 18-20
-
Abụọma na azịza ya
Ps 103:1-2, 3-4, 9-10, 11-12
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaLk 15: 1-3, 11-32
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ: Mi 7: 14-15, 18-20
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Maika
Jiri mkpara onye ncheaturu chiga ndi nke gi n'ebe ahihia ha ga-eri di, duokwa igwe aturu a bu ihe nketa gi bu ndi bi n'ime oke ohia a, ala anaghi amita mkpuru. Mee ka ha taa nri n'obodo Bashan na Giled dika na mgbe ochie. Dika n'ubochi ahu unu siri n'Egypt pụta, aga m egosi ha ihe itunaanya. Kedu chi a ga-eji tunyere gi n'igbaghara njo na ileghara mmehie ndi nke ya anya? O naghi anogide n'iwu ebighịbi, kama o na-enwe mmasi n'igosi ìhunaanya di okpu. O ga-egosi anyi ebere ya ozokwa, kpochapu mmehie anyị niile, tunye njo anyị niile n'ala ala osimiri. Ị ga-egosi Jekob ntukwasiobi, gosikwa Abraham jhunaanya gi di okpu dika i si nuoro nna anyi ha n'iyi site na mgbe ochie.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA: Ps 103:1-2, 3-4, 9-10, 11-12
Azịza: Oseburuwa di ebere na ìhunaanya.
1. Gozie Onyenweanyi, mkpuruobi m,
gozie aha ya di nso, ihe niile di n'ime m! Gozie Onyenweanyi,
mkpuruobi m, echezokwala obi ebere ya niile.
Azịza: Oseburuwa di ebere na ìhunaanya.
2. Nke o ji gbaghara njo gi niile,
ma gwoo orja gi niile, nke o ji si n'olulu zoputa ndụ gi
nke o ji were jhunaanya na obi ebere kpube gi okpu eze.
Azịza: Oseburuwa di ebere na ìhunaanya.
3. Iwe ya anaghi adi ebeebe,
ikpo asi ya na-adi so nwa ntinti oge.
O naghi emeso anyi, o naghi ata anyi ahuhu,
dika amamikpe anyi na njo anyi si di.
Azịza: Oseburuwa di ebere na ìhunaanya.
4. Dika eluigwe siri di elu n'ebe uwa di otu ahu
ka ìhunaanya ya siri di ukwuu n'ebe ndi na-aturu ya egwu no.
O na-ewepu njo anyi n'ebe anyi no karja otu owuwaanyanwu si di anya n'odida ya.
Azịza: Oseburuwa di ebere na ìhunaanya.
Mbeku:
Alleluia, Alleluia:
Bjaghachinụ azu n'ebe Oseburuwa Chineke unu no,
n'ihi na o di ebere nwekwa obioma.
Alleluia
OZIỌMA : Lk 15: 1-3, 11-32
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Mgbe ahụ, ọtụtụ ndị onautu na ndi omenjo biakwutere Jesu ịnuru okwu ya. Ndi Farisii na ndi odeakwukwo tamuru na-asi, "Nwoke a na-anabata ndi omenjo sorokwa ha na-eri ihe." Jesu wee jiri ukabuilu a gwa ha okwu si, Jesu kwukwara si, "Otu nwoke nwere umunwoke abuo. Nke nta n'ime ha siri nna ha, 'Nnaa, kee ihe gi niile ugbu a, nye m nke m.' Nna ha kekwaara mmadu abuo a ihe o nwere. K'ubochi olemaole gachara, nke nta n'ime ha kpokotachara ihe niile o nwere gaa n'obodo ozo di anya, n'ebe ahụ ka o mefuchara ihe niile o nwere site n'ibi ndu nzuzu. Mgbe o mefuchara ihe niile, oke unwu dara n'obodo ahụ, o malite ino n'uko o gara nonyere otu onye obodo ahụ, onye zigara ya n'ubi ya jzu ézi. o gaara amasi ya iri nri umuezi ahụ riíoro, mana na o nweghi onye nyere ya ihe obula. Mgbe o matara onwe ya, o siri, 'Mmadu ole bu ndi oru ngo no n'ubi nna m na-eri, na-anu, na-eme ihe orù otu di ha mma, ma ano m ebe a na-anwu n'aguu! Aga m ebili, lakwuru nna m, aga masi ya: Nna, e mehiela m megide eluigwe, megidekwa gi, etosighi m ka a kpokwaa m nwa gi ozo, na-akpaso magwa dika otu n'ime ndi oru gi.' O biliri lakwuru nna ya. Mgbe o ka no ebe di anya, nna ya huru ya, nwee obi ebere n'ebe Q no, gbara oso, makuo ya susukwaa ya onu. Nwa ahụ siri ya, 'Nna m, emehiela m megide eluigwe ma megidekwa gi, etosighi m ka a kpokwaa m nwa gi ozo.' Mana nna ya siri umuodibo ya, 'Meenu osiso chiputanụ uwe mwuda kacha mma.Yibenu ya, gbawanu ya mgba aka na akpukpoukwu; kpuputanụ nwa ehi gbara abuba, gbuonu ya, ka anyi kpoonu oriri, nwekwaa anuri. N'ihina nwa m nke a anwuolarij bja dikwa ndu ozo, o fukwara efu, e wee hu ya. Ha bidoro nuriba onu." "Ma mgbe nke a na-eme, nwa nwoke ahụ nke okenye no n'ubi. Mgbe o bjaruru nso n'ulo, o nuru uda egwu na-akunu. O kporo otu nwodibo nna ya, juo ya ihe na-emenu. O zara ya si, 'Nwanne gi nwoke alotala, nna gi egbuola nwa ehi ahụ gbara abuba, n'ihina o lotara n'udo na ahuike.' Iwe were ya, nke na o choghikwa ibanye n'ulo. Nna ya putara rio ya. Mana o siri nna ya, 'Lee, ọtụtụ afo ndi a ka m no na-agbara gi odibo, o nweghi mgbe m nupuru isi n'iwu gi, o nweghi mgbe i kpunyere m, o buladi nwa ewu, ka mu na ndi enyi m rie, ma nurikwaa. Mana mgbe nwa gi nke a lotara, onye ya na umunwaanyi akwuna ripjachara ihe niile i nwere, i gbuuru ya nwa ehi ahụ gbara abuba.' Nna ya siri ya, 'Nwa m, mu na gi no mgbe niile, ihe niile m nwere bu nke gi. O kwesiri ekwesi ka anyi kpoo oriri ma nurikwaa, maka na nwanne gi anwuolarị ma dikwa ndu ozo, o fukwara efu, e were hukwa ya.'"
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu