Fraide Izu uka nke mbu n'oge ncheta ahuhu Kristi Nicholas de Flue Violet

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Gn 37:3-4, 12-13a, 17b-28a
-
Abụọma na azịza ya
Ps 105:16-17, 18-19, 20-21
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaMt 21:33-43, 45-46
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ: Gn 37:3-4, 12-13a, 17b-28a
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Jenesis
Izrel hụrụ Josef n'anya karịa ụmụnwaanyị niile, ọ bụ ezie na ọ bụ nwa o metara n'agadi; ọ kpọrọ Josef uwe mwuda nke nwere aka ogologo. Ma mgbe ụmụnne Josef hụrụ ka nna ha si hụ ya n'anya karịa ha, ọ wutere ha nke ukwuu, ha wee kpo ya asị. Ha anaghị agwa ya okwu ọma. Umunne ya gara izu aturu nna ha na Shekem. Izrel gwara Josef si, "Umunne gị gara izu aturu na Shekem. Bịa ka m ziga gị ebe ahụ." Ọ zara ya si, "Adị m nkwado." Nwoke ahụ gwara ya si, "Ha esila ebe a pụọ; ma anụrụ m ka ha na-asi ka ha gaa Dotan." Ya mere, Josef chọọrọ umunne ya gaa, chọta ha na Dotan. Mgbe ha hụrụ ya ka ọ na-abịa n'ebe dị anya, ha gbakoo gbaa izu ka ha ga-esi gbuo ya. Ha kwuru si, "Lee onye oronro ka ọ na-abja. Bịa ka anyị gbuo ya, tunye ya n'olulu mmiri. Anyị nwere ike ikwu na anụọhia tábụrụ ya. Ka anyị mara nke ọma ka nro ndị ahụ ọ roro ga-esi wee mee." Mana ka Ruben nụrụ izu a, ọ gbara mbo hụ na ha egbughị Josef, ọ gwara ha si, "Anyi agaghị egbu ya. Unu akwafula obara, kama tunyenu ya n'ime olulu mmiri a dị n'ikpa, mana unu egbukwala ya." Ihe ọ ji nye ha ndụmọdụ a bụ emechaa, ka ọ kpọrọ Josef kpọgara nna ha. Ya mere, ka Josef rutere n'ebe umunne ya nọ, ha jidere ya, yịpụ ya uwe aka ogologo ya, tunye ya n'olulu mmiri adịghị. Ha wee nọdụ ala malite iri nri. Mgbe ha lechiri anya, ha hụrụ ndị Ishmel si obodo Giled alota, inyinyaibu ha bụ: uda, mgborogwu osisi, na eso osisi na-esi isi uto na-aga Ejipt. Juda wee gwa umunne ya si, "Kedu uru anyị ga-erite ma anyị gbuo nwanne anyị, kpuchie obara ya? Ngwanu ka anyị kpuru ya, ree ndị Ishmel kama ime ya ihe ọjọọ. Mmasị unu, ọ bụ nwanne anyị onye anyị na ya bụ otu." Ha wee kwere n'ihe ọ kwuru. Ugbu a, e nwere ndị mgbere ahịa Midian na-agafeta. Ha adoputa Josef, ree ya ndị Ishmel. Ha rere ya iri olaocha abụọ. Ndị ahụ akpọrọ Josef gaa Ejipt.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA: Ps 105:16-17, 18-19, 20-21
Azịza: Chetara ọrụ ebube niile Onye nwe anyị rụrụ.
1. Mgbe o mere ka ugani daa n'ala ha,
mee ka nri ha niile gwu, o zipụrụ otu nwoke tupu ha eruo,
Josef, onye nke e ereere dika ohu.
Azịza: Chetara ọrụ ebube niile Onye nwe anyị rụrụ.
2. Ha ji agbuo merụọ ukwu ya ahụ,
ha were igwe nyanye ya n'olu;
Mgbe oge ruru, amụma Josef mere ka Ọ siri kwuo,
okwu nke Onye nwe anyị gbaara ya aka ebe
Azịza: Chetara ọrụ ebube niile Onye nwe anyị rụrụ.
3. Eze wee nye iwu ka a tohapu ya.
Onye nke na-achị mba niile wee zoputa ya,
o mere ya o buru onye isi ezi n'ụlọ ya,
onye na-elekọta akụ na ụba ya anya.
Azịza: Chetara ọrụ ebube niile Onye nwe anyị rụrụ.
Mbeku:
Alleluia, Alleluia:
Chọba ezi ihe kama ajọ ihe,
ka unu wee dị ndụ, ka
Yahweh nke igwe ndị agha wee nonyere unu.
Alleluia
OZIỌMA : Mt 21:33-43, 45-46
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Jesu gwara ndị nchuaja na ndị okenye chha mmadụ ahụ si, "Nụụrụ ukabuilu ọzọ. O nwere otu onye nwere ezinuulo, ọ kọrọ ugbo vajn, gbaa ya ogige gburugburu, bja wuo ulpelunche maka ugbo ya, o hanyere ya n'aka ndị nlekota, were gaa n'obodo ọzọ. Mgbe oge ịgho mkpụrụ ruru, nwoke ahụ zigara umuodibo ya ka ha gaa n'azụrị ọ. Ha jidere umuodibo nwoke ahụ, tie otu ihe, gbuo nke ọzọ ma tuokwa nke ọzọ okwute. Ozokwa, o zigara umuodibo dị otutụ karja ndị nke mbu, ma ndị nlekota ahụ mekwara ha otu ha si mee ndị nke mbu. E mechaa, o zigara ha nwa ya nwoke si, 'Ha ga-asopuru nwa m.' Ma mgbe ndị nlekota ọrụ ubi ahụ hụrụ nwa ya, ha gbaritara izu si, 'Onye a bụ onye ga-anọchi anya ya, bịa ka anyị gbuo ya ka akúnụụba nna ya buru nke anyị.' Ha jidere ya, kpopu ya n'ubi vain ahụ wee gbuo ya. Mgbe onye nwe ubi ahụ biara, olee ihe unu chere na o ga-eme ndị nlekota a? Ha zara ya si, 'O ga-ala ndị ọjọọ ahụ n'iyi, bia nyefee ubi ahụ n'aka ndị nlekota ọzọ, ndị ga-enye ya mkpụrụ ya mgbe oge ruru.' Jesu juru ha si, 'Ọ bụ na unu agụtabeghị ihe e dere n'ime Akwụkwọ Nsọ: Okwute nke ndị na-ewu ụlọ juru ajụ abụrụla ide ji ụlọ. Nke a bụ aka ọrụ nke Onye nwe anyị, o turu anyị n'anya.' Ya bụ agwa m unu, a ga-anapụ unu alaeze Chineke, were ya nyefee n'aka mba ga-amịpụta ezi mkpụrụ.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu