Tozde Izu uka nke mbu n'oge ncheta ahuhu Kristi | Nicholas de Flue Violet

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Jer 17:5-10
-
Abụọma na azịza ya
Ps 1:1-2, 3, 4, and 6
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaLk 16:19-31
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ: Jer 17:5-10
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Jeremaya
Yahweh kwuru si, "Omuma ikpe dịrị onye nke tukwasara obi na mmadu, onye chekwubere naanị n'ike aka mmadu, onye obi ya jụrụ Chineke. Dịka obere osisi nke puru n'ikpa, enweghi ihe ọma ga-esi na ya pụta. O ga-anọ n'ala kporo nku nke ikpa ahụ, n'ala ahụ ụmụ mmadu ebighi. "Ngozi dịrị onye ahụ nwere nchekwube na Chineke, onye nchekwube ya bụ na Yahweh. Ọ dị ka osisi a kụrụ n'akụkụ mmiri, nke gbanyere mgbọrọgwụ na mmiri, ọ naghị atụ egwu okochi n'ihi na akwukwo ya na-adi ndu mgbe niile. Ọ dighịkwa atu egwu n'oge ụkọ mmiri, ọ na-amị mkpụrụ oge niile."Obi mmadu di aghughọ karịa ihe niile, o juputakwara n'ajo ihe; onye ga-aghotali ihe dị ya n'ime? "Mu n'onwe m, Yahweh, na-enyocha obi, na-atụlekwa echiche iji kwuo onye ọ bụla ụgwọ dị ka ọrụ ya siri di."
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA: Ps 1:1-2, 3, 4, and 6
Azịza: Anuri ga-adịrị ndị tukwasara obi na Dinwenu.
1. Anuri ga-adịrị nwoke ahụ nke anaghị eso ụzọ ndị ajọ omume,
ma ọ bụ na-akwughari n'uzo ndị ome njo,
ma ọ bụ nọdu n'otu ndị na-ekwuto Chineke;
kama ọ na-enwe anuri n'ebe iwu Onyenweanyi dị
ma na-achighari iwu ya n'obi ya ehihie na abali.
Azịza: Anuri ga-adịrị ndị tukwasara obi na Dinwenu.
2. Ọ dị ka osisi a kụrụ n'akụkụ iyi
nke na-amị mkpụrụ ya n'oge ya nke akwukwo ya anaghị akponwu akponwu,
ihe nile ọ na-eme na-aga ya nke ọma.
Azịza: Anuri ga-adịrị ndị tukwasara obi na Dinwenu.
3. O dighi otu a n'ebe ndi ajọ mmadụ nọ;
mba, n'ihi na ha dị ka áfụrụ oka nke ifufe na-ebugharị.
N'ihi na Onyenweanyi na-echekwa uzo ndi eziomume,
mana uzo ndi ajo mmadu na-eduba n'ila n'iyi.
Azịza: Anuri ga-adịrị ndị tukwasara obi na Dinwenu.
Mbeku:
Alleluia, Alleluia:
Abụ m mbilite n'onwu na ndu,
onye ọ bụla kwere na m,
agaghị anwụ ma ọ bụ nọọ na owuwa anyanwụ.
Alleluia
OZIỌMA : Lk 16:19-31
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Jesu gwara ndi Farisii si: "O di otu onye ogaranya nke na-eyi akwa uhie na akwa ọcha onye na-ano n'oriri na onunu ụbọchị niile. O nwere otu ogbenye onye onya juru n'ahu, a na-akpo ya Lazaros, nke na-atogbo n'onuzo ama ya. Ihe dị ya mkpa bụ iri iperipe nri si n'oche nri eze dapu. Ọ bụladị umu nkịta na-abịa aracha ya onya. Mgbe ogbenye a nwụrụ, ndi mmuooma buru ya buga n'akuku Abraham n'ala mmuo; ogaranya ahu nwụkwara, e lie ya. Mgbe o nọ n'okummuo na-ahuju anya, ọ letiri anya hu Abraham n'ebe dị anya ka Lazaros nọ n'akuku ya. Ọ tiri mkpu si, 'Nna anyi Abraham, biko, merem ebere. Zitenụ Lazaros ka ọ dete ọnụ mkpịsịaka ya na mmiri mejuo ire m, n'ihina anọ m n'ahụ ọkụ nke a.'Abraham zara ya si, 'Nwa m, cheta na mgbe ị nọ n'uwa, i nwetara ezi ihe nke gị, na Lazaros nwetara sosoro ahuhu. Ma ugbu a, a na-akasi ya obi n'ebe a, ma gị onwe gị nọ n'ahụ ọkụ.'"
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu