EMUME Ncheta JOSEPH DI ASỌ, DI MARIA DI NGOZI :Solemnity – White

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
2 Samuel 7:4-5a, 12-14a, 16
-
Abụọma na azịza ya
Ps: 89:2-3, 4-5, 27 and 29
-
Ihe ọgụgụ nke abụọ
Romans 4:13, 16-18, 22
- OziọmaMt 1:16, 18-21, 24a
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ: 2 Samuel 7:4-5a, 12-14a, 16
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Samuel nke abuo
Yahweh ziri Natan, sị, “Jee gwa odibo m bụ Devid, na m sị ya, ‘Ọ bụ gị ga-arụrụ m ụlọ ebe m ga-ebi? Mgbe i nwuru, elie gị ebe e liri nna gị ha, aga m eme ka otu n'ime ụmụ gị ndị nwoke buru eze. Aga m emekwa ka alaeze ya guzosie ike. Ya onwe ya bụkwa onye ga-ewuru m ụlọ nsọ. Aga m emekwa ka ọchịchị ya dị ebeebe. Aga m abụ nna ya; ọ ga-abụkwa nwa m. Mgbe ọ bụla o mere ihe ọjọọ, aga m enye ya ahụhụ dịka nna si adụ nwa ya ọdụ site n’inye ya ahụhụ. Ezinụlọ gị na alaeze gị ga-adị ebeebe. Aga m akwudosie ocheeze gị ike ebeebe.’”
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA: Psalm 89:2-3, 4-5, 27 and 29
Azịza: Ochichi Nwa nke Devid ga-adịrị ebeebe ebeebe.
1. Aga m eji ụkwụ kwuputa ịhụnanya nke Onyenweanyi ebeebe ebeebe.
Bido na ndúndúgandụ ruo na ndúndúgandụ, aga m na-ekwuputa ntụkwasịobi gị.
N’ihi na ịhụnanya gị ga-adị ebeebe, ikwesi ntụkwasịobi gị ga-akwudosị ike dịka igwe.
Azịza: Ochichi Nwa nke Devid ga-adịrị ebeebe ebeebe.
2. Gi kwuru sị, “Mụ na onye m họọrọ agbalala ndụ, arụrụla m Devid odibo m iyi.
Aga m eme ka ọchịchị gị dị ebeebe, aga m emekwa ka ocheeze gị dịgide ruo na ndúndúgandụ niile.”
Azịza: Ochichi Nwa nke Devid ga-adịrị ebeebe ebeebe.
3. Ọ ga-ekwusi m sị, “Ị bụ nna m, Chineke m, na onye enyemaka m.”
Aga m hụ ya n'anya dịka ọgbụgba ndụ m, na ya ga-adịrị okpu.
Azịza: Ochichi Nwa nke Devid ga-adịrị ebeebe ebeebe.
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ: Romans 4:13, 16-18, 22
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Pọl dị asọ degaara ndị Rome
Nkwa Chineke kwere Abraham na agbụrụ ya na ha ga-eketa ụwa abụghị site n’idebe iwu, kama ọ bụ site n’okwukwe. N’ihi nke a, Chineke mere ka nkwa ahụ dabere n’okwukwe, ka ọ wee bụrụ ihe mmadụ ga-enweta site n’amara, ka ọ rutechaa agbụrụ Abraham niile; ọ bụghị naanị ndị na-edebe iwu, kama ndị niile nwere ụdị okwukwe Abraham, onye bụ nna anyị n’okwukwe. Dịka Akwụkwọ Nsọ si kwuo; “Emeela m gị nna nke ọtụtụ mba,” n'ihu Chineke, Abraham bụ nna anyị n’okwukwe, onye o tinyere okwukwe ya na ya, onye na-enye ndị nwụrụ anwụ ndụ, na-emekwa ka ihe adịghị adị dịrị. Abraham nọgidere n’okwukwe na olileanya, ọbụladị mgbe olileanya adịghị, o wee site na nke a ghọọ “Nna nke ọtụtụ mba.” N’ihi na otu a ka a gwara ya n’Akwụkwọ Nsọ, sị, “Mmụmụ si n’agbụrụ gị ga-adị ọtụtụ.” N’ihi nke a ka Chineke ji site n’okwukwe “gụọ Abraham n’onye eziomume.”
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
Mbeku:
Alleluia, Alleluia:
Ha bụ ndị agọziri agọzi,
ndị bi n'ụlọ gị na-ekwere gị. Ukwe otito oge niile.
Alleluia
OZIỌMA : Mt 1:16, 18-21, 24a
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Jekob mụrụ Josef, di Maria bụ nne Jesu, onye a na-akpọ Kristi. Otu a ka e siri mụọ Jesu Kristi: Mgbe ndị ikwenibe kwekọritara na Josef ga-alụ Maria nne Jesu, a hụrụ na Maria dị ime site na Mmụọ Nsọ tupu ha ebikọọ ọnụ. Ma di ya bụ Josef, bụ onye eziomume, ò chọghị imenye ya ihere kama ọ kpebiri ịchụ ya na nzuzo. Mgbe ọ na-atụle ihe ndị a n’obi ya, mmụọ ozi nke Onyenweanyi bịakwutere ya na nrọ, sị ya, “Josef, nwa Devid, atụla egwu ịkpọrọ Maria nwunye gị, n’ihi na nwa o dị ime ya sitere n’ike nke Mmụọ Nsọ. Ọ ga-amụ nwa nwoke, ị ga-akpọ ya Jesu, n’ihi na ọ ga-azọpụta ndị nke ya na njo ha niile.”
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu