Tuzde Izu Uka nke Abụọ n'Oge Ncheta Ahụhụ Kristi St. Cyril of Jerusalem – Violet

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Isaiah 1:10, 16-20
-
Abụọma na azịza ya
Ps 50:8-9, 16bc-17, 21 and 23
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaMt 23:1-12
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ: Isaiah 1:10, 16-20
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Aizaya
"Ugbu a, nụru okwu nke Yahweh, unu ndị ọchịchị Sodom! Gee ntị na nkuzi nke Chineke anyị, unu ndị obodo Gomora! Sacha onwe unu, meenu onwe unu ka unu dị ọcha; wepụnụ ajọ omume unu n'ihu m, kwụsịnu ime njọ. Mụta ka e si eme eziomume, na-achọọkwa ikpe nkwụmoto; kwụsịnu mmegbu, chekwaanụ ụmụ ogbenye, na-ekwuchitenu ụmụnwaanyị ajadu. 'Ugbu a, bịa ka anyị tụkọọ uche,' Ọ bụ Oseburuwa na-ekwu; 'ọ bụrụ na njo unu na-acha ka uhie, a ga-eme ka ọ dị ọcha ka owu ọcha. Ọ bụrụ na unu ekwere rube isi, unu ga-eri ihe ọma nke si n'ala ahụ, ma ọ bụrụ na unu agbaa isi akwara, nọgide n'inupu isi, unu ga-anwụcha na mma agha.' Otu a ka Yahweh si kwuo."
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA: Psalm 50:8-9, 16bc-17, 21 and 23
Azịza: Aga m egosi nzọpụta nke Chineke n'ebe ndị eziomume nọ.
1. Ọ bụghị n'ihi aja unu ka m ji wee na-abara unu mba,
aja nsuruokụ unu nọ n'ihu m oge niile;
agaghị m anabata oke ehi ọ bụla nke si n'ụlọ unu,
ma ọ bụ ewu ọ bụla nke si n'ụlọ anụ unu.
Azịza: Aga m egosi nzọpụta nke Chineke n'ebe ndị eziomume nọ.
2. Kedu ikike unu nwere iji na-agụgharị iwu m,
iji na-ekwupụta maka ọgbụgba ndụ m?
N'ihi na unu jụrụ ịnabata nkuzi m, ma leghara okwu m anya.
Azịza: Aga m egosi nzọpụta nke Chineke n'ebe ndị eziomume nọ.
3. Unu na-eme nke a, chere na m ga-agba nkịtị? Unu chere na m dị ka unu?
Ugbu a, aga m abara unu mba, aga m eme ka ọ doo unu anya.
Onye ọ bụla na-achụnyere m aja-ekele na-asopụrụ m;
ma aga m egosi nzọpụta nke Chineke n'ebe ndị eziomume nọ.
Azịza: Aga m egosi nzọpụta nke Chineke n'ebe ndị eziomume nọ.
Mbeku:
Alleluia, Alleluia:
Tinye n'ime m mmụọ ọhụụ na nke siri ike,
nyeghachikwara m anụrị nke nzọpụta gị.
Alleluia
OZIỌMA : Mt 23:1-12
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Jisọs gwara igwe mmadụ ahụ na ndị na-eso ụzọ ya sị, "Ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii nọ n'okwa Mosis. Ya bụ, na-emeunu ma na-edebekwanyụ ihe niile ha na-agwa unu. Kama unu emekwala omume dịka ha, n'ihi na ha na-ekwu ma ha anaghị emepụta ya n'omume. Ha na-eke ibu siri ike, ọ bụbu bọ ndị mmadụ n'ubu, ma ha onwe ha agaghị emetụ ya ọbụladị otu mkpịsịaka.Ha na-arụ ọrụ ọma niile naanị ka ndị mmadụ wee hụ ha. Ha na-eme ka akwa e dere iwu ndị dị mkpa nke ha na-amado n'ihu na n'aka dị obosara, na-eme ka ọnụ uwe ha buru ibu. Ọ na-amasị ha ịnọ n'oche dị elu n'oriri, ịnọ n'ihu oche n'ụlọ nzukọ, ịnata ekele n'ọma ahịa, nakwa ka ndị mmadụ na-akpọ ha 'ndị nkuzi.'Unu ekwela ka a na-akpọ unu 'ndị nkuzi,' n'ihi na unu nwere naanị otu Onye Nkuzi. Unu niile bụkwa ụmụnne. Unu akpọla onye ọ bụla nna unu n'elu ụwa a, n'ihi na unu nwere otu Nna nke bi n'eluigwe. Unu ekwekwala ka a na-akpọ unu 'nnaukwụ,' n'ihi na unu nwere naanị otu nnaukwụ, ya bụ Kraịst. Ya bụ, onye ọ bụla kacha n'etiti unu ga-abụ ohu unu. Onye ọ bụla nke na-ebuli onwe ya elu, a ga-ebudata ya ala, ma onye ọ bụla nke wedara onwe ya ala, a ga-ebuli ya elu."
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu