Ncheta emume St. Patrick- White

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
1 Pt 4:7-11
-
Abụọma na azịza ya
Ps: 95:1-3, 7-8, 10
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaLuk 5:1-11
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ: 1 Pt 4:7-11
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Pita dere
Ogwugwu ihe niile di nso. Nweenu uche zuru oke, nwekwaanu anya udo, ka unu nwee ike ikpe ekpere. Ma nke kachanu, hụrụ ibe unu n'anya nke ukwu, n'ihi na ihụnanya na-ekpuchi ọtụtụ mmehie. Na-eleritanu ibe unu ọnụ nke ọma n'atamughị ntamu. Unu niile, n'otu n'otu, natara onyinye amara nke Chineke. Werenu ya jeere ibe unu ozi dịka ezi ndị nlekọta nke onyinye ahụ dị iche iche nke Chineke nyere unu. Onye ọ bụla n'ime unu na-ekwu okwu Chukwu, ya kwuo naanị okwu si Chineke n'ọnụ pụta. Onye ọ bụla na-eje ozi, ya were ike Chineke nyere ya jeere ya ozi. Na-eme otú a ka e nye Chineke otito n'ihe niile site n'aka Jesu Kristi, onye nwe otito na ike niile mgbe ebighị ebi. Amen.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA: Psalm 95:1-3, 7-8, 10
Azịza: Kwuputa Oru Itunaanya nke Onyenweanyi n'ebe Mmadu niile
1. Kweere Onyenweanyi ukwe ọhụrụ. Uwa niile,
kweere Onyenweanyi ukwe.
Kweere Onyenweanyi ukwe, too aha ya.
Azịza: Kwuputa Oru Itunaanya nke Onyenweanyi n'ebe Mmadu niile
2. Kwuputa nzoputa ya ụbọchị niile.
Mee ka ụwa niile mara maka otito ya,
kwuputakwa ọrụ itunaanya nke Onyenweanyi n'ebe mmadụ niile nọ.
Azịza: Kwuputa Oru Itunaanya nke Onyenweanyi n'ebe Mmadu niile
3. Tọọnu Onyenweanyi, ezinụlọ niile dị n'ụwa,
tọọnu ebube ya na ike ya.
4. Nye Onyenweanyi otito kwesịrị aha ya.
Azịza: Kwuputa Oru Itunaanya nke Onyenweanyi n'ebe Mmadu niile
4. Kwusaa na ụwa niile na Onyenweanyi bụ eze.
O kwuwasịrị ruo na ụwa ike, e nweghị ike ibughari ya.
Ọ ga-eji ikpe nkwumoto kpee mba niile ikpe.
Azịza: Kwuputa Oru Itunaanya nke Onyenweanyi n'ebe Mmadu niile
Mbeku:
Alleluia, Alleluia:
Ma Jesu siri ha:
"Sobenu m, aga m eme unu ndị na-akụta mmadụ."
Alleluia
OZIỌMA : Luk 5:1-11
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Ka Jesu guzo n'ọdụ mmiri Genesaret, oke igwe mmadụ zukoro na-adagide ya ka ha nụrụ okwu Chineke, o hụrụ ụgbọ mmiri abụọ n'ọdụ mmiri ahụ; ma ndị okụazụ esịla n'ụgbọ ahụ pụọ na-asa ụgbọ ha. Ka Jesu banyere n'ime otu ụgbọ ahụ, nke bụ nke Sajmon, o gwara ya ka o si n'ala kwụọpụ ụgbọ mmiri ya ntakịrị. O wee nọdụ ala, si n'ụgbọ ahụ na-akuziri ndị mmadụ ihe.Mgbe Jesu kwụsịrị okwu, O gwara Sajmon si, "Nụpụ ụgbọ gị n'ọgbọ mmiri, wunye ugbu gị maka igbu azụ." Ma Sajmon zara sị, "Nna anyị ukwu, anyị dọliri abalị niile, n'enwetaghị ihe ọ bụla, mana otu i siri kwu, aga m awunye ugbu m niile." Mgbe ha mere nke a, ha kụtara oke igwe azụ nke mere na ọ dọpụtara ntakịrị ka ụgbọ ha dọkaa.Nke a mere ha ji kpoo ndị okụazụ ibe ha nọ n'ụgbọ mmiri nke ọzọ ka ha bia nyere ha aka. Ha bịara gbujuo ụgbọ abụọ ahụ azụ, nke mere na ụgbọ ha malitere imikpu. Ma mgbe Sajmon Pita hụrụ nke a, o dara n'ukwu Jesu na-ekwu sị, "Si n'ebe m nọ pụọ, n'ihi na abụ m onye ajọ omume, o Dinwenu m." N'ihi na o juru Pita na ndị ya na ha so anya ịhụ ọtụtụ azụ ndị a ha gbutere. Otú a ka o mekwara Jemis na Jon, ụmụ Zebedi ndị ha na Sajmon bụ ndị nnwekọ. Jesu zara Sajmon sị, "Ụjọ atụla gị, site ugbu a gaba, ị ga na-akụta mmadụ." Mgbe ha kwụsịrị ụgbọ ha n'elu ala, ha hapụrụ ihe niile, sobe ya.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu