SONDE UKA NKE ABỤO N'OGE NCHETA AHỤHỤ KRISTI - Psalter Week 2 - Violet

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Gn 15: 5-12, 17-18
-
Abụọma na azịza ya
Ps 27: 1, 7-8, 8-9, 13-14
-
Ihe ọgụgụ nke abụọ
Phil 3: 17—4:1
- OziọmaLk 9: 28b-36
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ: Gn 15: 5-12, 17-18
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Jenesis
Chineke kpụpụtakwara Ebraham ezi na ụzọ sị ya: "Lelie anya n'igwe ma gụọ kpakpando dị na ya ọnụ, ọ bụ na i nwere ike; otu a ka ụmụ gị ga-adị." Abram tụkwasịrị okwukwe ya na Yahweh onye gụnyere ya nke a dịka eziomume. Ọ sịrị ya, "Abụ m Ọsebụrụwa Chineke onye kpụpụtakwara gị site n'ala Ur nke Kaldịa, inye gị ala a dịka oke nke gị." Abram jụrụ ya sị, "Onyenwe m Yahweh, olee otu m ga-esi mara na m ga-eketa ya?" Ọ gwara ya sị, "Wetere m otu nwa ehi gbara afọ atọ, otu nne ewu gbara afọ atọ, otu ebule gbara afọ atọ, otu nwa nduru na otu kparakụ." Ọ wetara ya ihe niile ndị a, gbuo ụmụ anụmanụ ndị ahụ abụọ abụọ ma debe otu isi n'ihu ibe ya; ma ọ kewaghị ụmụ nnụnụ ndị ahụ. Mgbe ọ bula ụmụ nnụnụ fere bịa iri ozu anụ ndị ahụ, Abram achụpụụrụ ha. Ugbu a, ka anyanwụ na-adaba, egwu jidere Abram, ọ wee daa na nnukwu ụra. Mgbe anyanwụ dara, ọchịchịrị gbara, ite ọkụ nke na-eku anwụrụ ọkụ, na mpanaka ọkụ ya na-enwu enwu gafere n'etiti ụzọ abụọ ahụ. N'ụbọchị ahụ, Yahweh na Abram gbara ndụ n'ụdị okwu ndị a: "Ụmụ gị ka m ga-enye ala site n'osimiri Ijipt ruo n'osimiri ukwu ahụ, iyi Yufretịs."
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA: Ps 27: 1, 7-8, 8-9, 13-14
Azịza: Onyenwe bụ ihe m na enyemaka m, onye ka m ga-atụ egwu?
1. Onyenwe bụ ebe obibi siri ike nke ndụ m, onye ka m ga-agbara ọsọ?
"Onyenwe m, nuru olu m mgbe m beụrụ gị. Mee ebere za m oku."
Ọ bụ gị ka obi m na-ekwupụta sị, "Chọọ ihu ya."
Azịza: Onyenwe bụ ihe m na enyemaka m, onye ka m ga-atụ egwu?
2. "Onyenwe m, ihu gị ka m na-achọ;
ezonahụkwa m ihu gị.
Ejikwala iwe chụpụ odibo gị.
Gị bụ onye enyemaka m."
Azịza: Onyenwe bụ ihe m na enyemaka m, onye ka m ga-atụ egwu?
3. "Ekwere m na aga m ahụ obi ọma
Onyenweanyi n'ala ndị dị ndụ.
Chekwube na ya; jisie ya ike; obi sie gị ike."
Azịza: Onyenwe bụ ihe m na enyemaka m, onye ka m ga-atụ egwu?
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ: Phil 3: 17—4:1
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Pọl dị asọ degaara ndị Filipians
Umunna m, soro na-enomi m. Na-elekọta ụfọdụ n'ime unu ndị na-eso ụkpụrụ anyị toro anya. Ọtụtụ n'ime ndị m na-agwa unu mgbe niile maka ha, bụ ndị m ji anya mmiri agwa unu ugbu a, na-ebi ndụ dịka ndị iro nke obe Kristi. Njedebe ndị dị otu a ga-abụ ịla n'iyi. Afọ ha bụ chi ha, ihe kwesiri ime ha ihere ka ha ji etu ọnụ. Ha na-etukwasi uche naanị n'ihe nke ụwa. Ebe obibi anyị dị n'eluigwe ebe anyị na-atụsi anya ike na onye nzọpụta anyị bụ Jesu Kristi ga-esi abịa, onye ga-agbanwe ahụ anyị dị ala ka ọ dị ka nke ya dị ebube site n'ike nke mere ka o dobe ihe niile n'okpuru ya. Umunna m, ndị m hụrụ n'anya, ndị agụụ ha na-agusi m ike, ndị bụ anuri m na okpueze m. Kwụdosienụ ike na Onyenwe unu ndị m hụrụ n'anya.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
Mbeku:
Alleluia, Alleluia:
"Olu nke Nna si n'urukpu igwe daa sị:
Onye a bụ Nwa m, m hụrụ n'anya. Gee ya ntị."
Alleluia
OZIỌMA : Lk 9: 28b-36
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Jesu kpọrọ Pita, Jemis, na Jọn wee rigoro n'elu ugwu ikpe ekpere. Mgbe Ọ na-ekpe ekpere, ihu ya enwuwo. Uwe ya bidoro chaa ọcha nke ukwu. Ma lee, ya na mmadụ abụọ na-akparịta ụka. Ndị ahụ bụ Mosis na Elaịja. Ndị pụtara n'otito wee kwuo okwu maka nlaghachi ya nke Ọ ga-emezu na Jerusalem. N'oge ahụ lira jide Pita na ndị ya na ha nọ nke ukwu; ha hụ ebube ya tinyekwara mmadụ abụọ ya na ha guzoro. Mgbe mmadụ abụọ ahụ na-ahapụ Jesu laba, Pita sịrị Jesu, "Nna anyị ukwu, ọ dị mma ka anyị nọrọ ebe a. Ka anyị rụọ ụlọikwuu atọ, otu maka gị, otu maka Mosis, otu maka Elaịja." Ma Pita amaghị ihe ọ na-ekwu. Ka ọ na-ekwu nke a, urukpu bịara kpugide ha; ha wee tọgbọrọ egwu ka urukpu ahụ na-ekpugide ha. Olu siri n'urukpu ahụ daa sị, "Nke a bụ Nwa m, onye m họọrọla, gee ya ntị!" Mgbe olu ahụ kwuchara, ha hụ naanị Jesu. Ma ha mechiri ọnụ ha; ha akọrọghị onye ọbụla n'oge ahụ akụkọ ọ bụla banyere ihe ha hụrụ.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu