Satode Izu uka nke mbu n'oge ncheta ahuhu Kristi - Louise De Marillac - Violet

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Dt 26: 16-19
-
Abụọma na azịza ya
Ps 119: 1-2, 4-5, 7-8
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaMt 5: 43-48
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ: Dt 26: 16-19
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ditronomi
Mosis gwara igwe mmadụ ahụ sị: "Ụbọchị taa, Yahweh bụ Chineke unu na-enye unu iwu ka unu debe ụkpụrụ ya na iwu ya niile. Werekwa obi unu na mmụọ unu debe ha. Taa, unu ekwuputala na Yahweh bụ Chineke unu. Unu ekwela nkwa ịrụnyere ya isi, na idobe iwu ya niile, na ime ihe niile o nyere n'iwu. Taa, Yahweh anabatala unu dịka ndị nke ya, na dịka ọ kwere unu na nkwa. Ọ nyekwa unu iwu ka unu debe ihe niile o nyere n'iwu. Ọ ga-emekwa ka unu dị elu karịa mba niile ọ kere. Unu ga-ewetakwa aha ya otito na nsọpụrụ. Unu ga-adịkwa ya nso, bụrụkwa ndị nke aka ya dịka ọ kwere unu na nkwa."
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA: Ps 119: 1-2, 4-5, 7-8
Azịza: Ngozi dịrị ndị omume ha kwụ ọtọ, na-eso iwu nke Onyenweanyi.
1. "Ngozi dịrị ndị omume ha kwụ ọtọ,
na-eso iwu nke Onyenweanyi."
Ngozi dịrị ndị niile na-edebe ihe niile Chineke nyere n'iwu,
ndị ji obi ha niile achọ ya.
Azịza: Ngozi dịrị ndị omume ha kwụ ọtọ, na-eso iwu nke Onyenweanyi.
2. "I meela ka anyị mata iwu gị, ka anyị wee kwụdosie ike na ya.
O! Ka m kwụdosie ike n'idebe iwu gị."
Azịza: Ngozi dịrị ndị omume ha kwụ ọtọ, na-eso iwu nke Onyenweanyi.
3. "Aga m eji obi kwụ ọtọ wetoo gi,
mgbe m matara ikpe nkwụmoto gị.
O ga-amasị m idobe iwu gị niile.
O! Agbaghapụkwala m."
Azịza: Ngozi dịrị ndị omume ha kwụ ọtọ, na-eso iwu nke Onyenweanyi.
Mbeku:
Alleluia, Alleluia:
"N'ihi na Chineke hụrụ ụwa n'anya otu a,
nke na ọ nyere otu nwa ya ka onye ọbụla nke kwere na ya ghara ịla n'iyi."
Alleluia
OZIỌMA : Mt 5: 43-48
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị: "Unu anụrụ na e kwuru sị, 'Ị ga-ahụ onye agbataobi gị n'anya, ma kpọọ onye iro gị asị.' Ma ana m agwa unu; hụ ndị iro unu n'anya, na-ekpekwaranụ ndị na-emegbu unu ekpere, ka unu wee bụrụ ụmụ nke Nna unu bi n'eluigwe n'ihi na ọ na-eme ka anyanwụ ya chakwasi ma ndị ajọ mmadụ, ma ndị ezigbo mmadụ. Ọ na-emekwa ka mmiri na-ezoro ma ndị ọma ma ndị ọjọọ. Ọ bụrụ na unu na-ahụ naanị ndị enyi unu n'anya, kedu ụgwọ ọrụ pụrụ iche unu ga-anata n'aka Chineke? Ọ bụladị ndị na-azụ ụtụ na-eme otu ahụ. Ọ bụrụ na unu na-ekele naanị ndị nna gị n'anya, kedu ihe pụrụ iche unu mere karịa ndị ọzọ? Ọ bụ na ndị na-ekpe arụsị anaghị eme otu ahụ? Ya bụ, unu onwe unu ga-ezu oke dịka Nna unu nke bi n'eluigwe siri zuru oke."
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu