Fraide Izu uka nke mbu n'oge ncheta ahuhu Kristi Matilda - Violet

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Ez 18: 21-28
-
Abụọma na azịza ya
Ps 130: 1-2, 3-4, 5-7a, 7bc-8
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaMt 5: 20-26
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ: Ez 18: 21-28
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Izikel
"Ma ọ bụrụ na ajọ mmadụ atugharia site na mmehie niile ọ mere, bia debe ihe m nyere n'iwu, na-eme kwa ihe ziri ezi na ihe dị mma, ọ ga-adịrị ndụ; ọ gaghị anwụ. Ọ dịghịkwa mmehie ọbụla ọ mere nke a ga-echeta iji megide ya. Ọ ga-adị ndụ maka eziomume niile nke o mere. Ọ na-amasị m bụ ọnwụ nke onye ajọ omume? Ọ bụ Yahweh Chineke na-ekwu, karịa ka ọ chịgharịrị n'ụzọ ya wee dị ndụ?
Ma mgbe onye eziomume hapụrụ eziomume ya, bịa mee ihe ọjọọ, na-eme kwa ihe arụrụala niile bụ nke onye ajọ mmadụ na-eme, ọ ga-adị ndụ? Ọ dịghị ihe ọma niile ọ mere nke a ga-echeta; ọ ga-anwụ n'ihi na o nweghị nkwụsi ike ya, na mmehie niile o mere." "Ma unu na-asi, 'Ụzọ nke Yahweh ezighi ezi!' Gee nti ugbu a, ụlọ Izrel: ọ bụ na ụzọ m ezighi ezi? Ọ bụ na ọ bụghị ụzọ unu bụ nke ezighi ezi? Mgbe onye eziomume si n'eziomume ya chịgharịa, mee ihe ọjọọ, ọ ga-anwụ maka ya; ọ ga-anwụ maka ihe ọjọọ nke o mere. Ma mgbe ajọ mmadụ si n'ajọ omume niile o mere chịgharịa bịa mee ihe ziri ezi, a ga-azọpụta ndụ ya. N'ihi na o chere echiche wee si na mmehie niile nke o mere chịgharịa, ọ ga-adịrị ndụ, ọ gaghị anwụ."
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA: Ps 130: 1-2, 3-4, 5-7a, 7bc-8
Azịza: O bụrụ na gị, o Onyenweanyi, na-agụ ajọ omume anyị ọnụ, Onyenweanyi, onye ga-eguzo?
1. O n'ugbu mmiri ka m na-akpọku gị, O Onyenweanyi,
Onyenweanyi, nuru akwa enyemaka m na-ebe,
chere nti n'arịrịọ m na-arịọ.
Mana i na-agbaghara anyị, n'ihi nke a, anyị na-asọpụrụ gị.
Azịza: O bụrụ na gị, o Onyenweanyi, na-agụ ajọ omume anyị ọnụ, Onyenweanyi, onye ga-eguzo?
2. Ana m eche Onyenweanyi;
mkpụrụ obi m na-eche ya na nkwa ya ka m nwere nchekwube.
Mkpụrụ obi m na-eche Onyenweanyi, karịa otu ndị nche si eche ụtụtụ.
Azịza: O bụrụ na gị, o Onyenweanyi, na-agụ ajọ omume anyị ọnụ, Onyenweanyi, onye ga-eguzo?
3. O Izrel, nwee nchekwube
n'Onyenweanyi! N'ihi na ịhụnanya Onyenweanyi dị okpụ,
'ime ya ka nnukwu nzọpụta dị! Ọ ga-azọpụta Izrel na ajọ ha niile.
Azịza: O bụrụ na gị, o Onyenweanyi, na-agụ ajọ omume anyị ọnụ, Onyenweanyi, onye ga-eguzo?
Mbeku:
Alleluia, Alleluia:
Agaghị m enwe anuri n'ọnwụ onye ajọ omume,
kama ka ọ si na ajọ ya pụta ma dị ndụ.
Alleluia
OZIỌMA : Mt 5: 20-26
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya si: "Ma ọ bụrụ na eziomume unu ekweghị karịrị nke ndị odeakwụkwọ na nke ndị Farisii, unu agaghị abata n'alaeze eluigwe. Unu anụrụ na a gwara ndị mgbe ochie sị, 'Unu egbula ọchị.' Onye ọbụla gburu ọchị a ga-ekpe ya ikpe. Ma mụ onwe m na-agwa unu si, onye ọbụla nke na-eburu nwanne ya iwe n'obi, a ga-ama ya ikpe. Onye ọbụla kporo nwanne ya 'onye nzuzu!' ga-abakwa n'okum mụọ.
Ya bụ, ọ bụrụ na ị na-eweta onyinye gị n'ekwụ nchu aja, ma cheta n'ebe ahụ na gị na nwanne gị adịghị na mma, hapụ onyinye gị n'ihu ekwụ aja. Buru ụzọ gaa ka gị mezie. Mgbe unu mezichara, bịa ka i nye onyinye gị. Mee ka gị na onye gbaara gị akwụkwọ kpezie ozugbo tupu unu agaruo n'ụlọ ikpe, ka ọ ghara inyefe gị n'aka onye ọka ikpe, onye ọka ikpe eduru gị nye n'aka ndị nche, ndị nche e wee tinye gị n'ụlọ mkpọrọ. N'eziokwu, agwa m gị, ị gaghị esi ebe ahụ pụta ruo mgbe i kwuchara ụgwọ gị niile."
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu