Tozde Izu uka nke mbu n'oge ncheta ahuhu Kristi Euphrasia - Violet

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Est 12: 14-16, 23-25
-
Abụọma na azịza ya
Ps 138: 1-2ab, 2cde-3, 7c-8
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaMt 7: 7-12
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ: Est 12: 14-16, 23-25
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Esta
N'oge ahụ, Ezenwaanyị Esta jupụtara na nnukwu egwu, were gbakwuru Chineke. Ọ yipụrụ uwe ezenwaanyị ya, were yirizie uwe ọpụpụ ya na iru uju. Ọ jụrụ ite ude isi ọma niile, ma jiri ánta na àpụ̀tị were kpuchie isi ya. Ọ hapụkwara inye ahú ya ezigbo mkpachapụ anya nke Ọ na-eji ntutu isi ya gba kwa agbako were mechie akụkụ ahụ ya ndị Ọ na-akpachapụghị anya.
Mgbe ahụ ka o rịọrọ Chineke nke Izrel arịrịọ si: "O Chineke m, naanị gị bụ Eze anyị; nyere m aka, mụ onye nọ naanị ya, na-enweghị onye enyemaka belụsọ gị. Maka na egwu ejidela m. Site n'oge a mụrụ m, anapụ m nụ ka ndị ala anyị na-ekwu na ọ bụ gị onwe gị, o Chineke, siri na mba niile were họrọ Izrel, họọrọkwa nna anyị ha n'ebe agbụrụ nna nna ha dị, ka ha bụrụ ihe nketa nke gị oge niile, ndị na-emezuru ihe niile ị kwere ha na nkwa.
Chetakwa, o Chineke; mee ka mba niile mara gị n'oge nke a anyị nọ na nsogbu. Gbaa m ume, o Eze nke chi niile na nnụnụ ike ochichi niile. Biko nye m onyinye ikwuputa okwu nke ọma mgbe m ga-akwụrụ n'ihu ọdụm, ma gbanwee mmụọ ya ka iwe ya dị ọkụ n'ebe onye ahụ na-alụso anyị ogu nọ, ka ọ were hụ njedebe nke ndụ ya na nke ndị niile dunyere ya ukwu. Ma zopụtakwa anyị, nyere m aka, n'ihi na anọ m naanị m, na-enweghị onye enyemaka ọbụla belụsọ gị, o Chineke. Ị ma zuo ihe niile."
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA: Ps 138: 1-2ab, 2cde-3, 7c-8
Azịza: Onyenweanyi, n'ụbọchị m kpọkụrụ gị, ị zara m.
1. Eji m obi m niile na-ekele gị, Onyenweanyi, n'ihi na ị nụrụ ekpere m!
N'iru ndị mmụọ ozi niile aga m ekwere gị ukwe;
Aga m akpọ isiala n'ụlọnsọ gị, nye gị ekele.
Azịza: Onyenweanyi, n'ụbọchị m kpọkụrụ gị, ị zara m.
2. N'ihi ihunanya na nkwụsi ike gị; n'ihi na aha gị na nkwa gị kacha dị elu.
N'ụbọchị m kpọkụrụ gị, ị zara m, mee ka ike m bawanye.
Azịza: Onyenweanyi, n'ụbọchị m kpọkụrụ gị, ị zara m.
3. Ị na-esetịpụ aka gị zopụta m. Aka nri gị ga-eme m ihe niile.
Onyenweanyi, Chineke, ihunanya gị na-adị ebeebe.
Ahapụkwala anyị ndị i kèrè.
Azịza: Onyenweanyi, n'ụbọchị m kpọkụrụ gị, ị zara m.
Mbeku:
Alleluia, Alleluia:
Abu m mbilite n'onwu na ndụ,
ma onye ọbụla nke dị ndụ,
kwerekwa na m agaghị anwụ ma ọla.
Alleluia
OZIỌMA : Mt 7: 7-12
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya si: "Rịọ, ị ga-eriota; chọọ, ị ga-achọta; kuo aka, a ga-emeghere gị ụzọ. N'ihi na onye ọbụla rịọrọ ga-eriota, onye ọbụla chọọrọnụ ga-achọta, onye ọbụla kụrụ aka a ga-emeghere ya. Ọ nwere onye n'ime unu o ga-abụ nwa ya rịọ ya achịcha ọ nye ya okwute? Ma ọ bụ ọ rịọ ya azụ, ọ nye ya agwọ? Ọ bụrụ na unu bụ ndị obi ọjọọ maara otú e si enye ụmụ unu ihe dị mma, o bụ na Nna unu nke eluigwe agaghị enye ndị niile na-arịọ ya ihe ọma?
Ya bụ, mee ndị ọzọ ihe ọbụla unu na-achọ ka ha mee unu; nke a bụ isi nkuzi iwu Mosis na ndị amụma."
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu