Wenezde Izu uka nke mbu n'oge ncheta ahuhu Kristi Theophanes - Violet

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Jon 3: 1-10
-
Abụọma na azịza ya
Ps 51: 3-4. 12-13. 18-19
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaLk 11: 29-32
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ: Jon 3: 1-10
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Jọn dị asọ Dere
Okwunke Yahweh bịakwutere Jona nke ugboro abụọ. Ọ sịrị, "Kwụlite, gaa na Ninive, obodo ukwu a, gwa ha okwu m ga-agwa gị."
Jona biliri gaa Ninive n'irube isi n'okwu nke Chineke. Ninive bụ nnukwu obodo, ọ na-ewe mkpụrụ ụbọchị atọ iji gafee uhie ya. Jona jiri otu ụbọchị gagarị n'ime obodo ahụ na-ekwukwa na-asi: "O fọdụrụ naanị iri ụbọchị anọ ka e mebie Ninive."
Ndị obodo Ninive bịara kwenyesie na Chineke, wee tie iwu na onye ọbụla ga-eburu ọnụ, yiri akwa iru uju bido n'onye ukwu ruo n'onye nta ha. Mgbe akụkọ a rutere onye eze nke Ninive, ọ sịrị n'ocheeze nke ya bilie, yipụ efe eze ya, bia chiri akwa iru uju yiri, nọkwa n'ọdụ na ánta. Ọ mere ka e kwupụta ya n'obodo Ninive niile site n'iwu ya na ndị isi ọchịchị ya tiri si: "Ọ dịghị mmadụ ma ọ bụ anụmanụ ọbụla a na-azụ ga-eri ihe ọbụla. Ka mmadụ niile yiri akwa iru uju wee kpọkuo Chineke n'ike ha niile. Ka onye ọbụla hapụ ụzọ ọjọọ ya niile nakwa mkpagbu ya niile. Onye maara ma Chineke o ga-agbanwe obi ya, hapụ iwe ya dị ọkụ ka anyị ghara ịla n'iyi."
Mgbe Chineke hụrụ mkpebi ha, otú ha siri chegharịa na mmehie ha niile, Ọ gbanwere obi ya wee hapụ ịta ha ahụhụ ahụ o chọburu ịta ha.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA: Ps 51: 3-4. 12-13. 18-19
Azịza: Inaghị ajụ obi gbawara agbawa na nke lọghara elu.
1. Mee m ebere, o Chineke,
site n'ihunanya gị site na nnukwu obi ebere gị, hichapụ njọ m.
Sachapụ mmehie m niile wụchapụ m na njọ m.
Azịza: Inaghị ajụ obi gbawara agbawa na nke lọghara elu.
2. Chineke, kenye obi dị ọcha n'ime m,
tinyekwuo n'ime m mmụọ ọhụrụ na nke siri ike.
Achụpụkwala m n'ihu gị anapụkwala m mmụọ nsọ gị.
Azịza: Inaghị ajụ obi gbawara agbawa na nke lọghara elu.
3. Inaghị enwe mmasị ọbụla n'aja nsuru ọkụ;
aja nsuru ọkụ anaghị atụ gị ụtọ.
Aja a na-achụru Chineke bụ obi gbawara agbawa,
naghi ajụ obi gbawara agbawa na nke lọghara elu.
Azịza: Inaghị ajụ obi gbawara agbawa na nke lọghara elu.
Mbeku:
Alleluia, Alleluia:
Taa ọ bụrụ na unu anụ olu ya, unu akpochila obi unu.
Alleluia
OZIỌMA : Lk 11: 29-32
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Mgbe ìgwè mmadụ ahụ na-abawanye, Jesu bidoro na-ekwu sị, "Ọgbọ a bụ ọgbọ ọjọọ; ọ na-achọ ihe àmà, ma ọ dịghị ihe àmà a ga-enye ya karịa ihe àmà nke Jona. N'ihi na otu Jona si bururụ ndị obodo Ninive ihe àmà, otu ahụ ka Nwa nke Mmadu ahụ ga-esi buru ọgbọ a ihe àmà.
N'ụbọchị ikpe ahụ, Eze nwaanyị Ndida ugwu ga-ebili so ọgbọ a guzoro n'ikpe, kpegbue ya. N'ihi na ọ si n'ụsọ nke ụwa bịa ịnụ okwu amamihe Solomon. Ma lee, ihe karịrị Solomon nọ ebe a.
Ndị obodo Ninive ga-esoro ọgbọ a kụọ n'ụbọchị ikpe, kpegbue ya; n'ihi na ha chegharịrị mgbe ha nụrụ nkuzi Jona, ma lee, ihe ka Jona dị n'ebe a."
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu