Monde Izu Uka nke mbu n'oge ncheta ahuhu Kristi

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Lv 19:1-2, 11-18
-
Abụọma na azịza ya
Ps 19:8-10, 15
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaMt 25:31-46
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ : Lv 19:1-2, 11-18
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Levetikos
Yahweh gwara Mosis okwusi, "Gwa ogbako Izrel niile okwu ndị a: Dinu nso n'ihina m, Onyenweanyi, Chineke unu dị nso. Unu agaghị ezu ohi, ma ọ bụ tụo asi, ma ọ bụ ghọgbuọ ibe unu. Unu agaghị eji aha m anu iyi asi wee merụọ aha Chineke unu. Abụ m Yahweh. Unu emegbula ma ọ bụ nara onye agbataobi unu ihe ya n' ụzọ na-ezighi ezi. Ugwo onye orungo unu agaghị ano n'aka unu chi aboo. Unu agaghị akpọ onye ogbi iyi, ma ọ bụ dochie onye isi ihe n' ụzọ. Unu ga na-aturu Chineke unu egwu. Abụ m Yahweh.""Unu ekpela ikpe na-ezighi ezi. Unu adonyerela onye ọ bụla úkwù n'ikpe, ma ọ bụ ogbenye ma ọ bụ ogaranya. Unu ga-eji ikpe nkmunoto kpee onye agbataobi unu ikpe. Unu agaghị ekwuto ibe unu. Unu agaghịkwa eme ihe ọ bụla ga-etinye ndụ onye agbataobi unu na nsogbu. Abụ m Yahweh." "Ọ naghị ebuuru nwanne gị iwe n'obi, ị ga-eji obi ọcha gwa onye agbataobi gị mmehie ya, ka ị ghara iketa oke na mmehie ya. Achọla ka ị megwara ihe mmadụ mere gị, ma ọ bụ buru iro n'obi megide nwanne gị, kama hụ onye agbataobi gị n'anya dị ka ị siri hụ onwe gị n'anya. Abụ m Yahweh."
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA : Ps 19:8-10, 15
Azịza: Okwu gị bụ mmụọ na ndụ.
1. Iwu nke Onyenweanyi kwu okwu,
Ọ na-enye mkpụrụobi ndu ọhụụ.
Atumatu Onyenweanyi kwesiri ntukwasi obi.
Ọ na-enye ndị dị umeala amamihe.
Azịza: Okwu gị bụ mmụọ na ndụ.
2. Iwu nke Onyenweanyi kwu okwu,
Ọ na-enye obi anuri;
Iwu nke Onyenweanyi pụtara ihe ọ bụ, ihe e ji ahụ ụzọ.
Azịza: Okwu gị bụ mmụọ na ndụ.
3. Ĩtu egwu Onyenweanyi bụ ihe dị mma;
Ọ na-adị ebeebe; ikpe nke Onyenweanyi bụ eziokwu;
Ha niile kwukwa otito.
Azịza: Okwu gị bụ mmụọ na ndụ.
4. Mee ka okwu niile si m n'ọnu apụta oge niile,
na echiche obi m niile dị mma n'ihu gị,
Onyenweanyi, nkume m, na onye nzoputam.
Azịza: Okwu gị bụ mmụọ na ndụ.
Mbeku:
Alleluia, Alleluia:
Okwu gị bụ mmụọ na ndụ,
O bu gi ji Ozi nke ndu ebebe
Alleluia
OZIỌMA : Mt 25:31-46
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya si: "Mgbe Nwa nke mmadụ ga-abịa n'ebube ya, ya na ndị mmụọ oma niile, ọ ga-anokwa n'ocheeze ya dị ebube. A ga-akpokọta mba niile n'ihu ya, Ọ ga-ekewa ha iche iche dị ka otu onye ozuzu aturu si ekewa aturu n'etiti ewu. Ọ ga-edobe aturu n'aka nri ya, dobe ewu n'akaekpe ya. Mgbe ahụ, onyeeze ga-asị ndị nọ n'aka nri ya: 'Bịanu, unu ndị dị ngozi nke nna m, bianu ka unu were alaeze nke a kwadobere unụ site na mbido nke ụwa; n'ịhína, mgbe agụụ na-agu m unu nyere m nri, mgbe akpịrị na-akpọ m nku, unu nyere m mmiri.' Abụ m Onye obịa unu nabatara m. Agba m ọtọ, unu yibere m akwa, mgbe m nọ n'ọrịa, unu bịa leta m, anọ m n'ụlọ mkpọrọ, unu bia kwutere m." Mgbe ahụ ndị ezi omume ga-aza ya si: 'Onyenweanyi, ọlee mgbe anyị hụrụ ka agụụ na-agu gị, nye gị nri, ma ọ bụ ka akpịrị na-akpọ gị nku, nye gị mmiri? Olee mgbe anyị hụrụ ka ị bụ onye obịa, nabata gị, ma ọ bụ ka ị gbaa ọtọ, yibere gị akwa? Olee mgbe anyị hụrụ na ị nọ n'ọrịa, ma ọ bụ na mkpọrọ, bịa leta gị?' Onyeeze ahụ ga-azakwa ha si: 'N'ezie, agwa m unu, mgbe ọ bụla unu meere ya, ọ bụ ọbụladị otu onye pekarichara mpe n'ime umunna m ndị a, mụ onwe m ka unu meere ya.'" Mgbe ahụ ọ ga-asị ndị nọ n'aka ekpe: 'Pụọ nu n'ihu m, unu ndị a buru ọnwụ! Gaa nu n'okpuru ebe ebe a kwadoro ekwensu na ndị mmụọ ọjọọ ya! N'ịhína, mgbe agụụ na-agu m, unu enyeghị m nri, mgbe akpịrị na-akpọ m nku, unu enyeghị m mmiri. Mgbe m bụ onye obịa, unu anabataghị m, agba moto unu enyeghị m akwa; mgbe m nọ n'ọrịa na n'ụlọ mkpọrọ, unụ abjaghị leta m.'" Mgbe ahụ ha ga-aza ya si: 'Onyenweanyi, ọlee mgbe anyị hụrụ na agụụ na-agu gị, akpịrị na-akpọ gị nku, mgbe ị bụ onye obịa, ka ị gbaa ọtọ, nọrọkwa n'ọrịa ma ọ bụ n'ụlọ mkpọrọ wee ghara inyere gị aka?' Ma ọ ga-aza ha si: 'N'ezie, agwa m unu, ebe unu emereghị ya ọbụladị otu onye dikarichara nta n'ime ndị a, unu emereghị m ya.' Ha ga-apụ, wee banye n'ahụhụ dị ebeebe, ma ndị ezi omume ga-abanye na ndu ebeebe."
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu