SUNDE – UKA NKE MBỤ N'OGE NCHETA AHỤHỤ KRISTI Psalter Week 1 - Violet

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Sir 27:4-7
-
Abụọma na azịza ya
Ps 92:2-3, 13-14, 15-16
-
Ihe ọgụgụ nke abụọ
1 Cor 15:54-58
- OziọmaLk 6:39-45
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ : Sir 27:4-7
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Sirak
Dika ihe a baghị úrú si afọdụ n'ime nyịkọ, ma a yochaa ihe, otu a kwa ka ajọ omume mmadụ si adị ya n'obi. Ọbọ oku ka e ji elele aka ọrụ onye ọkpu ite; mana site n'okwu mmadụ ka e si amata ụdị mmadụ. O bu. Site na mkpụrụ osisi ka e si amata osisi, nke a kpachapụuru anya, n'otu aka ahụ, site n'okwu ọnụ mmadụ ka e si amata mmụọ ya. Etokwala mmadụ tupu inụ olu ya, maka na ọ bụ nke a ga-egosi ụdị mmadụ ọ bụ.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA : Ps 92:2-3, 13-14, 15-16
Azịza Onyenweanyi di mma Inye Gi ekele.
1. O di mma inye Onyenweanyi ekele;
ya na ikwere Gi bụ Onye Kacha Elu,
ukwe otito; biakwa na-ekwuputa obi ọma Gi n'usoro ututu,
bido kwa n'abalị na-ekwuputa ịdị mma Gi ruo na chi obubo.
Azịza Onyenweanyi di mma Inye Gi ekele.
2. Onye ezi omume ga-eto ogologo,
biakwa maa mma dị ka nkwu. O ga-etowapu dị ka osisi seda nke Lebanon.
Ndị a kuru n'obi nke Onyenweanyi ga-eto ogologo,
maa mma n'ogige nke Chineke anyị.
Azịza Onyenweanyi di mma Inye Gi ekele.
3. Ha ga-amigide mkpụrụ mee agadi,
biakwa juputa na ndu, gbasiekwa ike;
Na-ekwuputanu ka Onyenweanyi akwuwa aka oto.
Azịza Onyenweanyi di mma Inye Gi ekele.
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ; 1 Cor 15:54-58
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Pọl dị asọ degaara ndị Korintians
Mgbe ahụ àhú ahụ nke puru ire ure yikwasiri ereghị ure, ahụ ahụ nke puru ịnwu anwụ yikwasiri anwughi anwụ, mgbe okwu ahụ e dere n'Akwụkwọ Nsọ ga-emezu si, "E loola ọnwụ na mmeri". Onwụ! Olee ebe mmeri gị di? Onwụ! Olee ebe ihe ụfu gị di? Lhe ogbugba nke ọnwụ bụ mmehie. Nke na-enye mmehie ike bụ iwu. Ma ekele diri Chineke onye na-enye anyị mmeri site n'Onyenweanyi Jesu Kristi. Ya bụ umunna m, m hụrụ n'anya, kwusienu ike, burunu akwaakwuru n'okwukwe unu. Nogidenu n'oni Onyenweanyi mgbe niile, ebe unu maara na ọrụ unu na-ary n'ime Dinwenu abụghị ihe efu.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
Mbeku:
Alleluia, Alleluia:
Onyeweanyi, meghee ob anyi ka anyi nara okwu nke nwa gi
Alleluia
OZIỌMA : Lk 6:39-45
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Jizọs tukwaara ha ilu si, "Onye isi o nwere ike idu onye isi? Oby na ha mmadụ abụọ agaghị adaba n'olulu? Nwaazy, anaghi aka onye nkụzi ya, ma onye ọ bụla a kọziri ihe nke ọma, ga-adi ka onye nkụzi ya. Ma gini mere ị ji hụ irighiri ahịhịa di n'anya nwanne gị ma ị hụpụtaghị ibe osisi di n'anya nke gị? Mbu, olee otu ị si nwe onu isi nwanne gị, nwanne m, ka m tụchapụ gị irighiri ahịhịa di gị n'anya; mgbe gionwe gị na-achọpụta ibe osisi di n'anya gị? Gị onye ihu abụọ, buru ụzọ tuchapu ibe osisi di n'anya gị, mgbe ahụ ị ga-ahụ ụzọ nke ọma ituchapụ irighiri di n'anya nwanne gị."
N'ihina, osisi ọma anaghi ami mkpụrụ ọjọọ. Ozokwa, osisi ọjọọ anaghi ami mkpụrụ ọma. Maka na a na-amata osisi ọbụla site na mkpụrụ ya. N'ihina, a naghị aghọta ụda n'osisi ogwu; a naghịkwa aghọta ụtu n'osisi ụke. Ezigbo mmadụ na-esite n'ihe ọma juputara ya obi, na-eme ihe ọma, ma ajọ mmadụ, site n'ihe ọjọọ juru ya ahụ, na-eme ihe ọjọọ, n'ihina, site n'onu ka e ji ekwuputa ihe juru n'obi.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu