Satodee na-eso Ash Wednezdee John of God - Violet

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Is 58: 9b-14
-
Abụọma na azịza ya
Ps 86: 1-2.3-4. 5-6
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaLk 5: 27-32
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ : Is 58: 9b-14
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Aizaya
Oseburuwa na-ekwu: O buru na unu ewepu n'etiti unu mmegbu,itu aka mobu ikwu okwu na-agbawa obi; O burukwa na unu enye ndi aguu na-agu ihe oriri,mee ka ndi no na mkpagbu nweta afo ojuju,mgbe ahu ka ihè unu ga-achaputa n'ochichiri,abali unu ewee dika ehihie. Yahweh ga-edu unu oge niile.O ga-eji iheoma nyejuo unu afo, o ga-emekwa ka okpukpu unų sie ike,unu ga-adi ka ala ubi a na-agba mmiri, dika isiiyi nke mmiri ya na-adighi ata ata.A ga-arughari obodo unu a kuturu akutu na mbu;unu ga-ewillite ntoala nke otutu agburu; a ga-akpo unu"Ndi mmezi ihe nke gbajiri agbaji;"""Ndi odozi uzo ebe obibi."Q buru na unu akwusį imeto ubochi Sabat m, kwusikwa icho ihe uto nke unu n'ubochi m di nso,o burukwa na unu ewere ubochi Sabat kporo ihe,doo ubochi nso Chineke dika ubochi kwesiri nsopuru; o buru na unu asopuru ya na-emeghi uche nke unu, mobu jcho ochicho nke unu, mobu ikwu okwu na-abaghj uru,mgbe ahu, unu ga-enwe mmasi n'ebe Yahweh no;aga m eme unu adi elu n'ime uwa; aga m azu unu site n'ihe nketa nnanna unu bu Jekob, n'ihina onu nke Oseburuwa ekwuola ya.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA : Ps 86: 1-2.3-4. 5-6 Is 58: 9b-14
Azịza : Kuziere m uzo gi o Onyenweanyi, ka m were okwukwe na eso gi
1. Gee m nti Onyenweanyi, zaa m,
n'ihina abu m ogbenye na-enweghi enyemaka.
zoputa nwodibo gi onye tukwasara obi na gi.
Azịza : Kuziere m uzo gi o Onyenweanyi, ka m were okwukwe na eso gi
2. I by Chinekem, meere m ebere o Onyenweanyi,
ọ bu gi ka m na-akpoku ubochi niile
Mee ka mkpuruobinwodibo gi juputan'onu,
Onyenwanyi, n'ihi na o bụ gi
ka m na-akpoku n'ekpere m.
Azịza : Kuziere m uzo gi o Onyenweanyi, ka m were okwukwe na eso gi
3. Onyenweanyi, į di ebere di mgbaghara,
i nwere nnukwu jhunaanya n'ebe ndi niile na-akpoku gi no.
Onyenweanyi, nuru ekpere m, Gee m nti nuru aririo m.
Azịza : Kuziere m uzo gi o Onyenweanyi, ka m were okwukwe na eso gi
Mbeku:
Alleluia, Alleluia:
Tufuonų mmehie unu niile nke unu mere megide m;
nwetaranu onwe unu obi ohuru na mmuo ohuru.
Alleluia
OZIỌMA : Lk 5: 27-32
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Mgbe nke a gachara, Jesu puru hu otu onye onautų a na-akpo Levaj ka o noduru n'ulcmtu; wee si ya, "Sobe m." Ma Levaj biliri, hapu ihe niile sobe ya.Levaj kporo oriri ukwu n'ulo ya. Otutu ndi onautu na ndi ozo sokwa ha noro n'oche nri. Ndi Farisii na ndi odeakwukwo ha tamuru ntamu megide ndi na-eso uzo Jesu si, "Gini mere unu na ndi onautų na ndi omenjo ji eriko nri na-anukokwa ihe onunu?" Jesu zara ha si, "Mkpa dibia anaghi akpa onye ahu siri ike, kama o na-akpa onye ahu na-esighi ike.Abjaghi m įkpo ndi eziomume kama įkpo ndi njo ka ha chegharia."
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu