TOOOZDEE NA-ESO ASH WEDNEZDEE Colette - Violet

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Dt 30:15-20
-
Abụọma na azịza ya
Ps 1:1-2, 3, 4, and 6
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaLk 9:21-25
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ : Dt 30:15-20
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ditronomi
Moses gwa ndị mmadụ sị: "Taa, ana m eche n'ihu unu onwu na ndu, ihe ọma na ihe ọjọọ ka unu họrọ nke ka unu mma. Ọ bụrụ na unu edobe iwu niile nke Yahweh, Chineke unu, nke m na-enye unu taa, ọ bụkwa na unu ahụ ya n'anya, rubere ya isi, dobekwa iwu ya niile, unu ga-aga n'ihu, burukwa mba bara ụba. Yahweh, Chineke unu, ga-agozi unu, mee ka unu biri n'ala ahụ nke unu na-abịa inweta. Ma ọ bụrụ na unu enupuisi n'iwu ya, jukwa ige ya nti, ọ bụrụ na unu agahie ụzọ ma sekpuwere chi ndị ọzọ, a ga-ekpochapụ unu. Unu agaghịkwa ebi ogologo ndụ n'ala ahụ, n'ofe Jodan, ebe unu na-aga, ka unu biri n'ime ya. Ugbu a, ana m eche n'ihu unu onwu na ndu, ngozi na ọbuonu Chineke, ka unu họrọ nke ka unu mma. Ana m akpọkwa eluigwe na ụwa ka ha gbaa akaebe banyere nke ọ bụla unu ga-ahọrọ. Ya mere, họrọ ndụ, ka unu na ụmụ unu wee dị ndụ. Hụ Yahweh, Chineke unu n'anya. Rubere ya isi. Werekwanu ikwudosiike fee ya, ka unu na ndị umu unu dị ogologo ndụ n'ala ahụ nke ọ kwere nkwa inye nna unu, Abraham, Isaac, na Jacob."
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA: Ps 1:1-2, 3, 4, and 6
Azịza: Anụrị ga-adịrị ndị tukwasara obi ha na Dinwenu.
1. Anụrị ga-adịrị nwoke ahụ nke na-eso ndumodu onye ajọ omume,
ma ọ bụ na-akwughari n'ụzọ ndị ome njo ma ọ bụ nọdu n'otu ndị na-ekwuto Chineke;
Kama na-enwe anụrị n'ebe iwu Onyenweanyi dị;
ma na-achighari iwu ya n'obi ya ehulie na abalị.
Azịza: Anụrị ga-adịrị ndị tukwasara obi ha na Dinwenu.
2. Ọ dị ka osisi akụrụ na akuku iyi,
nke na-amịputa mkpụrụ ya n'oge ya,
nke akwụkwọ ya anaghị akpọụkpọụ, ihe niile o na-semena-agara yankeoma.
Azịza: Anụrị ga-adịrị ndị tukwasara obi ha na Dinwenu.
3. Ọ dịghị otu ndị ajọ mmadụ nọ n’mba,
n'ihi na ha dị ka afụru oka nke ikuku na-ebugarị.
N'ihi na Onyenweanyi na-echekwa uzondi ezi omume,
mana ụzọ ndị ajọ mmadụ na-eduba n'ila n'iyi.
Azịza: Anụrị ga-adịrị ndị tukwasara obi ha na Dinwenu.
Mbeku:
Alleluia, Alleluia:
Chọba ezi ihe kama ajọ ihe,
ka unu wee dị ndụ, ka Yahweh nke igwe ndị agha wee nonyeere unu.
Alleluia
OZIỌMA : Lk 9:21-25
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Ma Jizọs doro ndị na-eso ụzọ ya aka na nti, nyesie ha iwu ike, ka ha ghara ikwu onye ọ bụla ihe a, sị: "Nwa nke mmadụ a ga-ata ọtụtụ ahụhụ. Ndị okenye ndị Juu, ndị nzuzu nchụaja, na ndị odeakwụkwọ ga-ajụ ya. A ga-egbukwa ya, ma n'úbọchi nke atọ, a ga-eme ka ọ si n'onwu bilie." O wee gwa ndị niile nọ ebe ahụ sị: "Ọ bụrụ na onye ọ bụla chọrọ iso m, ka ọ jụọ onwe ya, buru obi ya ubochi niile soro m. N'ihina, onye ọ bụla nke chọrọ izoputa ndu ya ga-atufu ya. Ma onye ọ bụla nke ga-atufu ndu ya n'ihi m, ga-azoputa ya. Kedu uru o ga-abara mmadụ ma ọ bụrụ na o ritere ụwa niile n'uru ma tufuo mkpụrụobi ya ma ọ bụ nwe onwe ya efulahu ya?"
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu