ASH WEDNESDAY. Day of Fast & Abstinence Violet

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
JI 2:12-18
-
Abụọma na azịza ya
Ps 51:3-4, 5-6ab, 12-13, 14 and 17
-
Ihe ọgụgụ nke abụọ
2 Cor 5:20-6:2
- OziọmaMt 6:1-6, 16-18
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ: JI 2:12-18
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi
"Ma obuladi ugbu a" Oseburuwa na ekwu, "Laghachikwutenu mn'ibu onu, ibe akwa na kwa iruuju. Dokaanu obi unu, o bughi uweunu."
Bjaghachinu azu n'ebe Oseburuwa Chineke unu no, n'ihina o di ebere nweekwa obioma. O naghi ewe iwe ososokama o juputara n'ihunaanya diokpu na-atugharikwa obi ya weehapu ahuhu o choro Ita ndi nkeya. Onye maara ma o gaghi aloghachite azubia tugharja obi were hapuru anyi ngozi.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA : Ps 51:3-4, 5-6ab, 12-13, 14 and 17
Azịza : Biko Onyenweanyi, meere anyi ebere n'ihi na anyi emela njo.
1. Meere m ebere o Chineke site n'ihunaanya gi,
site na nnukwu obi ebere gi,
hichapu njo m nile, Sachapu mmehie m nile,
Wuchapu mmehje m niile.
Azịza : Biko Onyenweanyi, meere anyi ebere n'ihi na anyi emela njo.
2. N'ihi na amarala m mmehie m niile,
Njo m no na mmuo m oge niile.
O bu so gi, naani gi ka m mere njo megide
ihe di njo n'ihu gi ka m mere.
Azịza : Biko Onyenweanyi, meere anyi ebere n'ihi na anyi emela njo.
3. Chineke, kenye obi di ocha n'ime m.
Tinye n'ime m mmuo ohuru na nke siri ike.
Achupukwala m n'ihu gi. Anapukwala m mmuo nso gi.
Azịza : Biko Onyenweanyi, meere anyi ebere n'ihi na anyi emela njo.
4. Nyeghachikwa m anuri nke nzoputa gi, Were ezi mmuo gi chedo m.
Onyenweanyi meghee egbugbere onu m,
Ka onu m wee kwuputa otito gi.
Azịza : Biko Onyenweanyi, meere anyi ebere n'ihi na anyi emela njo.
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ: 2 Cor 5:20-6:2
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Pọl dị asọ degaara ndị Korintians
Anyi bu ndi nnochite anya nke Kristi. Chineke sitere n'ime anyi na-akpo unu oku. Anyi na-ario unu n'aha Kristi ka unu na Chineke dikwa na mma ozo. Ọ bu n'ihi anyi ka Chineke jiri mee ka Kristi were onodụ na ahuhu diiri ndi mmehie ebe o meghi njo obula. Chineke mere nke a ka anyi wee buru ndi eziomume nke ya n'ime Kristi. Ebe anyi na Chineke na-arukooru, anyi na-ario unụ ka unụ ghara inabata amara Chineke dika ihe efu. N'ihina o kwuru si, "N'oge nnabata anuru m olu unu, N'ubochi nzoputa enyekwaara m unụ aka." Lee, ugbu a bu oge nnabata, ugbu a bukwa oge nzoputa ahu.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
Mbeku:
Alleluia, Alleluia:
Biaghachinu azu n'ebe Oseburuwa Chineke unu no,
n'ihi na o di ebere nweekwa obioma
Alleluia
OZIỌMA : Mt 6:1-6, 16-18
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya sị: "Kpacharanu anya ime eziomume naani ka ndị mmadụ wee hụ unu. N'ihina unu mee otu a, Nna unu nke bi n'eluigwe agaghị akwu unu ugwo oru."
Ya mere, mgbe ọ bụla unu na-enye onyinye, unu afụla ọpi dịka ndị ihu abuo si eme n'ụlọ nzuko ha, na n'okporo ụzọ niile, ka ndị mmadụ wee too ha. N'eziokwu, agwa m unu, ha anatala ugwo oru ha.
Mgbe ọ bụla ị na-enye onyinye ebere, ekwela ka akaekpe gị mata ihe akanri gị na-eme; ka ọ wee buru ihe i nyere na nzuzo, Nna unụ nke na-ahu na nzuzo ga-akwughachi unu ugwo.
Mgbe ọ bụla unu na-ekpe ekpere, unu emekwala ka ndị ihu abuo, n'ihina ọ na-amasị ha ịkwuo ma na-ekpekwa ekpere n'ime ụlọ nzuko na n'akuku okporo ụzọ niile, ka ndị mmadụ wee hụ ha. N'eziokwu, agwa m unu, ha anatala ugwo oru ha. Ma mgbe ọ bụla unu na-ekpe ekpere, banyenu n'ime ụlọ unu, mechie ụzọ, kpeere Nna unu nke no na nzuzo. Nna unu nke na-ahu na nzuzo ga-akwughachi unu ugwo.
"Ozokwa, mgbe ọ bụla unu na-ebu onu, unu agbarula ihu unu dịka ndị ihu abuo si eme, ha na-agbaru ihu ha ka ndị mmadụ wee hụ na ha na-ebu onu.
N'eziokwu, agwa m unu, ha anatala ugwo oru ha. Ma mgbe ọ bụla ị na-ebu onu, tee ude n'isi, sakwaa ihu gị, ka a ghara inwe onye ga-amata na ị na-ebu onu. Karia Nna gị nke na-ahu ihe niile e mere na nzuzo. Nna gi nke na-ahu ihe niile e mere na nzuzo ga-akwu gi ugwo."
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu