Tuzde Izu nke Asato n'oge na-adanyeghi n'emume Casimir - Green

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Sir 35: 1-12
-
Abụọma na azịza ya
Ps 50: 5-6, 7-8, 14, 23
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaMk 10: 28-31
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ : Sir 35: 1-12
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Sirak
Idobe iwu bụ inye ọtụtụ onyinye; ige ntị n'ihe iwu kwuru bụ ịchịkwa onwe gị n’udo. Onye jiri ekele kwughachi ugwo ọma e mere ya, nyere onyinye ntuoka. Ma onye nyere onyinye ebere, churu aja nke inye ekele. Wepu aka n’ajo ihe na-ato Onyenweanyi uto, hapu ụzọ ezighi ezi bụ ime opipia maka njo. Agbakwala aka na-adịghị mma n'ihu nke Onyenweanyi, maka na iwu chọrọ ka a na-eme ihe ndị a. Onyinye onye eziomume na-achọ ịkwado mma; ịsi oma ya na arịrịọ n'ihu Onye Kacha Elu. A na-anabata aja onye eziomume, ncheta ya ga-adịrị ọkpụrụ. Too Onyenweanyi site n’iji obi gị niile nye onyinye. Emekwala aka chichiri n’inye onyinye nke mkpụrụ mbu gị. Jiri ihu ochi na-enye onyinye ọ bụla. Were anuri hụ ụzọ n'ime ụzọ iri nke ihe ị nwere. Nye Onye kacha elu dịka o si enye gị. Nye onyinye mara mma, buo ibu dịka aka gị si dị. Maka na Onyenweanyi bụ ezigbo onye okwu ugwo. O ga-akwụ gị ugwo mara mma. Enyekwala ya bụ Onyenweanyi ngari, maka na ọ gaghị anara ya. Atukwasila nchekwube gị n’aja ezighi ezi, maka na Onyenweanyi bụ onye ọka ikpe, na-adịghị asọ mmadụ anya.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA : Ps 50: 5-6, 7-8, 14, 23
Azịza : A ga m egosi nzoputa nke Chineke n'ebe ndị eziomume nọ.
1. Kpọkotaranụ m ndị nke m kwere ekwe,
ndị mụ na ha gbara ndụ site n’aja ha churu!
Ka eluigwe niile kwupụta eziomume ya;
mgbe Chineke n’onwe ya bụ onye ọka ikpe.
Azịza : A ga m egosi nzoputa nke Chineke n'ebe ndị eziomume nọ.
2. Gee ntị ndị m, ana m ekwu okwu,
Izrel, ana m agba akaebe megide unu,
ana m ekpe unu ikpe n’ihu unu,
Mu Oseburuwa, Chineke unu.
Ọ bụghị n’ihi aja unu ka m ji na-abara unu mba,
aja nsureoku unu nọ n’ihu m oge niile.
Azịza : A ga m egosi nzoputa nke Chineke n'ebe ndị eziomume nọ.
3. Mba, ka inye ekele gị buru aja nke! Na-achụnyere Chineke,
mejuputa iyi ínuuru Onye kacha elu.
Onye ọbụla na-achụnyere m aja ekele na asopurii m,
ma aga m egosi nzoputa nke Chineke n'ebe ndị eziomume nọ.
Azịza : A ga m egosi nzoputa nke Chineke n'ebe ndị eziomume nọ.
Mbeku:
Alleluia, Alleluia:
Onye ọbụla nke na-edobe okwu Kristi,
n'ezie, jhunaanya maka Chineke zuru oke n’ime ya.
Alleluia
OZIỌMA : Mk 10: 28-31
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere
Pita ebido gwaba ya sị, "Lee, anyị hapụla ihe niile soro gị." Jizọs siri ha, "N’ezie, agwa m unu, ọ dịghị onye ọbụla nke hapụrụ ụlọ, ma ọ bụ umụnne ndị nwoke, ma ọ bụ umụnne ndị nwanyị, ma ọ bụ nne, ma ọ bụ nna, ma ọ bụ ụmụ, ma ọ bụ ala, n’ihi m na n’ihi ozioma, na-agaghị enweta ihe ndị a ugbu a, na n'oge a. Ọ ga-enweta nari kwa nari; ụlọ, na umụnne nwoke na umụnne nwanyị, na nne, na ụmụ, na ubi, ha na ọtụtụ nsogbu, ma ga-anata ndụ ebighị ebi n’ụwa nke na-abịa n’ihu. Ma ọtụtụ ndị bụ ụzọ ga-abụ ndị ikpeazụ, ndị ikpeazụ bụ ụzọ."
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu