Monde Izu nke asatọ n'oge na-adaghị n'emume Katharine Drexel - Green

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Siraịk 17:19-32
-
Abụọma na azịza ya
Ps: 32:1-2.5.6.7
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaMak 10:17-27
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ : Siraịk 17:19-32
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Sirak
Oru ha niile pụtara ihe dịka anyanwụ n'ihu ya; anya ya dị n'omume ha oge ọbụla. Ajọ omume ha niile ezoghị ezo n'ihu ya. Mmehie ha niile pụtara ihe n'ihu Yahweh. Ma Yahweh dị afọma o maara ihe niile o kere. Ọ naghị alaa ha n'iyi kama O na-echekwa ha. Onyinye ebere mmadụ na-enye dị ka mgbanaka n'ihu ya. Yahweh hụrụ ebere mmadụ na-eme n'anya dịka mkpụrụanya ya. E mechaa, O ga-ekuli, kwuo ha ụgwọ, onye ọbụla ka oru ya si dị. Ma ndị mere ebere chegharịa, O ga-anabata ha. Ma Ọ na-agba ndị ike na-agwụ, obi na-ekolopu ume. Tugharia, laghachi azụ n'ebe Yahweh nọ, hapụ njo gị, rịọ arịrịọ n'ihu ya, ma belata mmehie gị. Laghachikwuru Onye kacha elu. Wepụ anya n'ebe ihe arụrụ ala dị, jiri ike obi gị niile kpo njo asi. Onye pụrụ ikwere Onye kacha elu ukwe otito n'ala mmụọ dịka ndị di ndụ si ekele ya? Inye ekele adịghị n'ebe ndị nwụrụ anwụ nọ, ha dịka ndị e keghị eke, naanị onye dị ndụ, nwee ahụ ike na-ekwe ukwe otito. Lee ka ọ si bụrụ ibu ebere Yahweh na mgbaghara O na-egosi ndị laghachiri azụ n'ebe ọ nọ. Mmadụ apụghị inwe ihe niile, maka na nwa nke mmadụ abụghị anwụ anwụ. Kedu ihe na-amụkesi karịja anyanwụ? Ma ìhè ya ahụ na-emechaa daa. N'otu aka ahụ ka mmadụ bụ, so ahụ na ọbara si echeputa ihe ọjọọ. Yahweh na-ahụ, na-elekọtakwa igwe ndágá nke eluigwe, mana o nweghị ihe mmadụ niile bụ karịja so aja na ntụ.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA : Ps: 32:1-2.5.6.7
Azịza: Unu ndị eziomume, nwee anuri n'Onyenweanyi:
1. Ngozi na-adịrị onye nke a gbaghaara njo ya,
onye nke e kpochapụrụ mmchie ya.
Ngozi dịrị onye ahụ Onyenweanyi amaghi ikpe,
onye aghụghọ adịghị n'ime obi ya.
Azịza: Unu ndị eziomume, nwee anuri n'Onyenweanyi:
2. N'ikpeazụ, ekwere m na m mere njo
Anaghị m ezo njọ m ezo,
A siri m "Aga m ekwuputara njo m Onyenweanyi!"
wee gbaghara m njo m niile
Azịza: Unu ndị eziomume, nwee anuri n'Onyenweanyi:
3. Ya mere ndị nke gị niile jiri ebekue,
n'ebe ọbụla ha nọ na nsogbu,
ọbụlagodi na nsogbu ekworo ka ide mmiri bịa,
ọ gaghị eru ha ahụ.
Azịza: Unu ndị eziomume, nwee anuri n'Onyenweanyi:
4. Gị bụ ebe mgbaba m,
Ị na-echebe m n'oge nsogbu,
iji ukwe nzọpụta agba m gburugburu.
Azịza: Unu ndị eziomume, nwee anuri n'Onyenweanyi:
Mbeku:
Alleluia, Alleluia:
Dinwenụ mepee obi anyị ige nti n'okwu Nwa gị.
Alleluia
OZIỌMA : Mak 10:17-27
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere
Ka Jisus na-ebili njem, otu nwoke gbaara ọsọ bịa gbuo ikpere n'ala n'ihu ya, jụọ ya sị, "Ezigbo onye nkụzi, gịnị ka m ga-eme ka m wee keta ndụ ebighị ebi?" Jisus jụrụ ya sị, "Gịnị mere i ji akpọ m ezigbo onye? ọ nweghị onye bụ ezigbo onye beluso Chineke. Ị marala ihe ndị e nyere n'iwu: 'Egbula mmadụ, Akwala iko, Ezula ohi, Agbala ama asị, Arụgbula mmadụ, sopụrị nne na nna gị.'" Nwoke ahụ zara ya sị, "Onye nkụzi, ihe niile ndị a ka m debere site n'okorobịa m." Jisus lere ya anya nwee ihụnanya n'ebe ọ nọ, gwa ya sị, "Otu ihe fọdụrụ gị. Laa, ree ihe niile i nwere were nye ndị ogbenye, i ga-enwe akụ n'eluigwe, bịa sọọ m." Mgbe ọ nụrụ okwu a ihu gbarụrụ ya, ọ wee laa na mwute, n'ihi na ọ bụ onye bara ụba nke ukwuu. Jisus elegharịa anya sị ndị na-eso ụzọ ya, "Lee ka o siri ike ndị ogaranya ịbanye n'Alaeze Chineke!" Okwu ya a tụrụ ndị na-eso ụzọ ya n'anya. Jisus gwakwara ha ọzọ sị, "Ụmụntakịrị m, lee ka o siri sie ndị tụkwasịrị obi n'akụnaụba ike ịbanye n'Alaeze Chineke! ọ dịkarịrị inyinya ibu mfe ịgafe n'anya agịkarị ogaranya ịbanye n'Alaeze Chineke!" Okwu a tụrụ ha n'anya nke ukwuu, ha wee jụọ ya sị, "Onye kwanu ka a pụrụ izọpụta?" Jisus lere ha anya sị, "N'ebe mmadụ nọ nke a bụ ihe na-agaghị ekwe omume, ma ọ bụghị n'ebe Chineke nọ. N'ihi na n'ebe Chineke nọ o nwere ike ime ihe niile."
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu