Satode Izu nke Asaa n'oge na-adanyeghị n'emume David - Green

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Sir 17: 1-15
-
Abụọma na azịza ya
Ps 103: 13-14, 15-16, 17-18
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaMk 10: 13-16
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ : Sir 17: 1-15
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Sirak
Yahweh si n'aja kee mmadụ, na ya bụ aja ka o kpochighakwara ya. Ọ nyere ndị mmadụ obere oge ha ga-adị ndụ, mana o nyere ha ike n'ebe ihe niile dị n'elu ụwa dị. Ọ nyere ha ike dị ka nke ya, kee ha n’oyiyi nke ya. Ọ mere ka ihe ndị ọzọ niile e kere na-atụ mmadụ egwu. Ọ mere ka ha na-achị ma anụmanụ ma nnụnụ na-efe efe. Ọ nyere ha ụzọ nghọta ise ka o si nye anụ ndị ọzọ, ma nyekwa ha nke isii bụ echiche na nke asaa bụ ịlịlọ, nke na-enyere ha aka ịkọwapụta nke ọma ihe ha natara site n'ụzọ nghọta ise ndị a. Ọ nyere ha ire, anya, ntị, na uche ha ji eche echiche. Ọ nyere ha ọmịma na nghọta zuru ezu, gosi ha ihe dị iche n'etiti ihe ọma na ihe ọjọọ. Ọ tinyere ìhè nke ya n'ime obi ha ka ha na-ahụ ka ọrụaka ya si bụọ ibu, ma bụrụkwa mma. Ọ hapụrụ ha ka ha na-ekwupụta otito ya ebe ebe, jiri ya na-anyasị ebighị ebi. Ha ga na-eto aha ya dị nsọ, na-ekwupụtakwa aka ọrụ ya buru ibu.Ọ nyere ha onyinye nke ọmụma were kènye ha oke n'iwu nke ndụ. Ya na ha gbara ndụ ga-adị ebighị ebi, bia gosi ha ikpe nkwụmoto ya. Anya ha hụrụ ike ya dị ebube, ntị ha nụkwara olu ya dị otito. Ọ sịrị ha, “Kpachara anya maka ihe niile ezighi ezi.” Ọ nyere onye ọ bụla n'ime ha iwu gbasara ikwu na ibe. Ụzọ ha niile pụtara ihe n'ihu ya, ọ nweghị nke zoro ezo n'anya ya.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA : Ps 103: 13-14, 15-16, 17-18
Azịza: Thụnyere anya nke Onyen weanyi n'ebe ndị na-atụ ya egwu ya na-adị okpukpu, o na-adị ebeebe.
1. Dị ka nna si emere ụmụ ya ebere,
otu ahụ ka Onyenweanyi si emeso ndị na-atụ ya egwu.
Ọ maara ihe e ji kee anyị, ọ na-echeta na anyị bụ ntụ.
Azịza: Thụnyere anya nke Onyen weanyi n'ebe ndị na-atụ ya egwu ya na-adị okpukpu, o na-adị ebeebe.
2. Ogologo ndụ mmadụ adịghị ogologo karịa nke ahịhịa;
ọ naghị anọkarị ifuru osisi dị n'ohịa.
Otu nnukwu ikuku kuo, a gaghị ahụkwa ya ebe ahụ ọzọ.
Azịza: Thụnyere anya nke Onyen weanyi n'ebe ndị na-atụ ya egwu ya na-adị okpukpu, o na-adị ebeebe.
3. Ma n'agbanyeghị,
ịhụnanya nke Onyenweanyi n'ebe ndị na-atụ ya egwu nọ na-adị okpukpu;
ọ na-adịrị ebeebe dịka obiọma ya dị n'ebe ụmụ ya nọ,
na-adịgide oge niile ha na-edobe ogbugbandu ya.
Azịza: Thụnyere anya nke Onyen weanyi n'ebe ndị na-atụ ya egwu ya na-adị okpukpu, o na-adị ebeebe.
Mbeku:
Alleluia, Alleluia:
Ana m ekele gị,
Nna Dinwenu nke eluigwe na ụwa,
n’ihi na i kpugheere ụmụntakịrị ihe omimi nke alaeze.
Alleluia
OZIỌMA : Mk 10: 13-16
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere
Ndị mmadụ kpọtara Jesus ụmụntakịrị ka ọ metụ ha aka; ma ndị na-eso ụzọ ya baara ha mba. Ma mgbe Jesus hụrụ ihe ha na-eme, iwe were ya nke ukwuu, ọ sị ha, “Hapụnu ụmụntakịrị ka ha bịakwute m, unu egbochila ha n'ihi na Alaeze Chineke bụ nke ndị dị otu a. N'ezie, agwa m unu, onye ọ bụla nke na-agaghị anabata Alaeze Chineke dị ka nwatakịrị, agaghị abanye n'ime ya.” Ma o kwụrụ ha n'aka ya, gọzie ha, bikwasa ha aka n'isi.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu