Fraide Izu nke asaa n'oge na-adanyeghi n'emume Hilarius - Green

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Sir 6: 5-17
-
Abụọma na azịza ya
Ps 119: 12, 16, 18, 27, 34, 35
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaMk 10: 1-12
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ : Sir 6: 5-17
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Sirak
Olu ọma na-eme ka ndị enyi bawanye. Ire ụtọ na-eme ka aziza di mma bawanye. Mee ka ndị enyi gị hie nne, ka ndị gị na ha di na mma di ọtụtụ, ka ndị ndumodu gị buru so otu onye n'ime puku mmadụ.
Ị chọọ ka gị na mmadụ buru enyi, buru ụzọ nwalee ya. Agakwala ngwa ngwa itukwasi ya obi. Maka o nwere onye na-abụ enyi so mgbe ihe dịrị gị mma, mana o gaghi akpọsi ike n'ebe ị nọ n'oge nsogbu. O nwere ụdị enyi na-agbanwo buru onye iro, kọọrọ ihe ndị dịịrị gị na ya iji menye gị ihere. O nwekwara ụdị bụ enyi sooso n'oge oriri, mana o gaghi enyere gị na nsogbu. Mgbe ihe na-agara gị n'ihu, gị na ya ga-abụ otu; o ga-enwe ike n'ebe ụmụ ọdibo gị nọ, mana oge odida gị, o tugharia ghoo onye iro. Oge ahụ ka o ga-anọ gị ọte aka.
Anodebekwala ndịjiro gị nso, ma kpachara anya n'ebe ndị enyi gị nọ. Enyi kwesịrị ntukwasiobi bụ ebe nchedo e ji aka. Onye nwetara enyi dị otu a, nwetara akú dị oke ọnụ. Enyi kwesịrị ntukwasiobi karịa ọnụ ahịa ọ bụla. O nweghi ihe a ga-eji tunyere ya. Enyi kwesịrị ntukwasiobi bụ ezigbo ogwu na-enye ahụ ike. Ndị na-atụrụ Yahweh egwu ga-enweta ya. Onye ọ bụla na-atụrụ Yahweh egwu na-eme ezigbo enyi maka otu onye dị, ka enyi ya na-adi.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA : Ps 119: 12, 16, 18, 27, 34, 35
Azịza : Dube m n'uzo iwu gị, n'ihina o bu ihe na-ato obi m uto.
1. Ngozi diri gi O Onyenweanyi,
kuziere m so ụzọ gị.
Azịza : Dube m n'uzo iwu gị, n'ihina o bu ihe na-ato obi m uto
2. Ana m enwe anuri n'iwu gị,
anaghi m echezo okwu gị.
Azịza : Dube m n'uzo iwu gị, n'ihina o bu ihe na-ato obi m uto
3. Meghee anya m,
ka m wee hụ ihe ịtunaanya di n'iwu gị.
Mee ka m ghọta ihe iso ụzọ gị pụta,
ka m wee nwee ike ịchighari ọrụ ịtunaanya gị n'obi m.
Azịza : Dube m n'uzo iwu gị, n'ihina o bu ihe na-ato obi m uto
4. Nye m nghọta ka m wee mata iwu gị
wee nwee ike iji obi niile dobe iwu gị.
Dube m n'uzo iwu gị,
n'ihina o bu ihe na-ato obi m uto.
Azịza : Dube m n'uzo iwu gị, n'ihina o bu ihe na-ato obi m uto
Mbeku:
Alleluia, Alleluia:
Ma okwu nke Onyemewanyi ga-adigide ruo mgbe ebighiebi.
Okwu a bụkwa ozioma ahụ nke a gbasaara unu.
Alleluia
OZIỌMA : Mk 10: 1-12
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere
Jesu si n'ebe ahụ bilie, gara ala Judia; sikwa n'ebe ahụ ruo ala dị n'ofe ọzọ nke osimiri Jodan. Oke igwe mmadụ zukoro n'ebe o nọ. O malitere ọzọ ikuziri ha ihe, dika o si eme. Ụfọdụ ndị Farisii biakwutere ya, iji nwalee ya; ha jụrụ ya sị, "O ziri ezi n'iwu ka nwoke gbaa nwunye ya alụkwaghim?" Jesu zara ha sị, "Gịnị ka Mosis nyere unu n'iwu?" Ha zara sị, "Mosis kwenyere ka nwoke dee akwụkwọ alụkwaghim nye nwunye ya, wee chulaa ya." Ma Jesu gwara ha sị, "O bu n'ihi ekweghi ekwe unu ka Mosis ji deere unu iwu di otu a. Ma site na mbido okike, Chineke mere ha nwoke na nwaanyị; n'ihi nke a ka nwoke ga-eji hapụ nna ya na nne ya, gakwuru nwunye ya, ha abuo aburu otu. Ya bu ha abughikwa mmadụ abụọ ọzọ kama otu. Chineke jikoro ọnụ mmadụ ọ bụla ekewakwala ya." N'ime ụlọ, ndị na-eso ya jụrụ ya ọzọ ihe banyere okwu a. Ma Q zara ha sị, "Onye ọ bụla gbara nwunye ya alụkwaghim luru nwanyị ọzọ na-akwakwa iko megide ya. Ma ọ bụrụkwa na nwanyị agbara di ya alụkwaghim luru di ọzọ, o na-akwakwa iko."
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu