Wenezde Izu nke asaa n'oge na-adanyeghi n'emume Alexander of Alexandria - Green

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Sirach 4:11-19
-
Abụọma na azịza ya
Psalm 119:165, 168, 171, 172, 174, 175
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaMk 9:38-40
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ : Sirach 4:11-19
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Sirak
Amamihe na-ebulite ụmụ ya elu na-enyekwara ndị na-achọ ya aka. Onye ọbụla hụrụ ya n'anya hụrụ ndụ ya n'anya. Ndị ji isi ụtụtụ achọ ya ga-ejuputa n'anuri. Onye ọbụla jidesiri ya ike ga-enweta otito. Yahweh ga-agozi ebe ọ bụla o gara. Ndị na-ejere ya ozi na-efe otu onye ahụ dị asọ. Ndị hụrụ ya n'anya, Yahweh na-ahụ ha n'anya. Onye ọbụla na-erubere ya isi ga-ekpe mba niile ikpe. Onye ọbụla na-ege ya ntị, ga-ebi n'udo. Ọ bụrụ na ọ nwere ntukwasi obi na ya, ọ ga-enweta ya, ọ ga-abụkwa nke ụmụ ya. Na mbido, amamihe ga-eduga ya n'ụzọ siri ike, ọ ga-eme ka ụjọ na oke egwu too ya. Ọzuzụ ọ ga-achọ n'aka ya ga-esi nnukwu ike. Ọ ga-anwale ya n'ụzọ ya dị iche iche, ruo mgbe ọ nwere ezigbo ntukwasi obi n'ebe ọ nọ. Mgbe ahụ ka ọ ga-abjakwute ya n'atụghị oge wee kpugheere ya ihe nzuzo ya ma meekwa ka obi too ya uto. Ma ọ bụrụ na ọ jehie ụzọ, ọ ga-agbahapụ ya, hapụ ya ka ọ laa n'iyi.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA : Psalm 119:165, 168, 171, 172, 174, 175
Azịza: Onyenweanyi, ndị niile hụrụ iwu gị n'anya nwere udo.
1. Ndị niile hụrụ iwu gị n'anya nwere udo,
o nweghi ihe ga-eme ka okwu kpoo ha.
Azịza: Onyenweanyi, ndị niile hụrụ iwu gị n'anya nwere udo.
2. Ana m cdobe iwu gị na nkuzi gị niile,
n'ihi na ị maara ụzọ in niile.
Azịza: Onyenweanyi, ndị niile hụrụ iwu gị n'anya nwere udo.
3. Onụ m na-ekwuputa otito gị,
ebe ị na-akụziri m iwu gị.
Azịza: Onyenweanyi, ndị niile hụrụ iwu gị n'anya nwere udo.
4. Aga m ekwekọ na okwu otito
n'ịhịna ha niile bụ ihe ziri ezi.
Azịza: Onyenweanyi, ndị niile hụrụ iwu gị n'anya nwere udo.
Mbeku:
Alleluia, Alleluia:
Chineke sitere na Kristi na-eme ka ya na uwa di na mma.
O tinyela n'aka anyi ozi banyere uzo o si eme ka ya na umu mmadu
dikwa na mma ozo
Alleluia
OZIỌMA : Mk 9:38-40
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere
Jon sịrị Ya, "Onyenụzi, anyị hụrụ otu nwoke onye na-achụpụ ndị mmụọ ọjọọ n'aha gị, anyị gbochiri ya, n'ihi na ọ bụghị onye otu anyị." Ma Jesu zara, sị, "Unu egbochila ya, n'ihi na ọ dịghị onye ọbụla ga-aru ọrụ ebube n'aha m nke nwere ike ikwulu m ọsọsọ. N'ihi na onye na-adịghị emegide anyị na onye na-nyere anyị."
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu