Monde Izu nke asaa n'oge na-adanyeghị n'emume – Week 3 Green

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Sir 1: 1-10
-
Abụọma na azịza ya
Ps 93: 1ab. 1cd-2. 5
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaMk 9: 14-29
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ : Sir 1: 1-10
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Sirak
Amamihe niile si na Yahweh abịa, amamihe bụ nke Ya ebighị ebi. Aja mmụọ nke osimiri, mmụọ ozuzo, ụbọchị na-enweghi mbido na njedebe, onye pụtara igu ha ọnụ? Ka eluigwe si dị elu, ka ụwa si dị obosara, ka osimiri si mee emi, ọ bụ amamihe, onye nwere ike ịchọpụta omimi ihe ndị a? E kèlàrị amamihe tupu ihe ndị ọzọ niile, mkpachapụ anya na nghota dịkwuo, na-adị bido na gboo. Isi amamihe bụ okwu Chineke nọ n'eluigwe. Uzo Ya niile bụ iwu nke dị ebighị ebi. Mgborogwu amamihe - onye ka o gosiri ya? Ịtụ n'okwu Ya niile na usoro o si eme ihe, onye machara ha? Onye ka e gosiri onumara nke amamihe? Onye ghotara uzo Ya niile. Ọ dị so otu onye bụ onye maara ihe, bụkwa onye e kwesiri ịtụ oke egwu, onye nọ n'ocheeze ya. Yahweh n'onwe Ya kere amamihe; O hụrụ ya ma ghota otú o si dị mkpa, O were wusa ya n'elu ọrụ aka Ya niile. O nyere onye obula onyinye amamihe Ya, ma ndị hụrụ Ya n'anya ka O nyere ha n'uju.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA : Ps 93: 1ab. 1cd-2. 5
Azịza: Onyenweanyi bụ eze, o yi ebube dika uwe.
1. Onyenweanyi bụ eze,
O yi ebube dika uwe.
Kere ike n'ukwu ka aji.
Azịza: Onyenweanyi bụ eze, o yi ebube dika uwe.
2. Omere ka ụwa kwuru,
"Nke na-enweghi ike ikwaghari ya."
Ocheeze Gi dịbido na mgbe ochie,
Dịiri tupu e kee ụwa.
Azịza: Onyenweanyi bụ eze, o yi ebube dika uwe.
3. Iwu Gi niile kwusiri ike;
Ebe obibi Gi dị nso ebe ebe.
O, Onyenweanyi.
Azịza: Onyenweanyi bụ eze, o yi ebube dika uwe.
Mbeku:
Alleluia, Alleluia:
Mee ka ihu Gi chakwasi nwodibo Gi,
ma kuziere m ime uche Gi.
Alleluia
OZIỌMA : Mk 9: 14-29
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere
Mgbe Jesu ruru ebe ndị na-eso ụzọ Ya nọ, ha hụrụ oke igwe mmadụ gbara ha gburugburu, hụkwara ndị odeakwụkwọ ka ha na ha na-arurita ụka. Ozigbo igwe mmadụ ahụ hụrụ Jesu, o turu ha n'anya nke ukwuu, ha gbakwutere ya kelee ya. Jesu jụrụ ndị na-eso ụzọ Ya si, "Gịnị ka unu na ha na-ekwu?" Otu onye n'ime igwe mmadụ ahụ zara ya si, "Onyenkuzi, akpotaara m gị nwa m nwoke n'ịnụ, o nwere mmụọ ọjọọ nke na-eme ka o ghara ikwu okwu. Mgbe ọ bụla o jidere ya, o na-atu ya n'ala, o na-agbo ụfụfu n'onu ya, na-ata ikikere eze, ahu ya niile ekwe bibiriri ka ufa. Arioro m ndị na-eso ụzọ gị ka ha chupu ya, ma ha enweghi ike." Jesu zara ha si, "Unu ogbo na-enweghi okwukwe! Ruo ole mgbe ka m na unu ga-ano? Ruo ole mgbe ka m ga-edi omume unu? Kpotara m nwatakiri ahụ!" Ha kpotaara ya nwatakiri nwoke ahụ. Ozigbo mmụọ ọjọọ dị n'ime nwa ahụ hụrụ Jesu, mmụọ ahụ sesiri ya ike; nwatakiri ahụ adaa n'ala, na-aturu-ghari, na-asu ụfụfu n'onu. Jesu ajụo nna nwatakiri ahụ si, "Olee mgbe ihe a malitere isogbu ya?" O zaa si, "Site na mgbe o bụ nwata. Ọtụtụ mgbe ka o na-atuba ya n'oku, na n'ime mmiri, ka o wee laa ya n'iyi. Ma ọ bụrụ na inwere ike ime ihe ọ bụla, biko, mee ebere, nyere anyi ka." Jesu siri ya, "Ọ bụrụ na ị kwere, ihe niile pụtara ime n'ebe onye kwere ekwe nọ." N'atughị oge nna nwatakiri ahụ tiri mkpu si, "Ekwere m, nyere m aka merie ekwesịghị ike m." Mgbe Jesu hụrụ na igwe mmadụ ahụ na-agbakoba, na-acho inugide ya, o baara mmụọ ọjọọ ahụ mba, si ya, "Gi mmụọ dara ogbi na nke nti chiri, m onwe m na-enye gị iwu: si n'ime ya pụọ, abanyekwala n'ime ya ọzọ." Ka mmụọ ọjọọ ahụ tichara mkpu, ma sesie nwatakiri ahụ oke ike, o siri n'ime ya pụọ. Nwatakiri ahụ togbooro dika ọzu, nke mere na ọtụtụ ndị mmadụ n'etiti ogbako ahụ siri, "O nwuola!" Jesu jidere nwatakiri ahụ aka, selite ya elu; o wee bilie. Mgbe Jesu banyechara n'ulo, ndị na-eso ụzọ Ya juru ya na nzuzo si, "Gịnị mere anyi onwe anyi enweghi ike ịchupu mmụọ ọjọọ ahụ?" Jesu zara ha si, "Ụdị ajọ mmụọ a abụghị nke a na-achupu n'ụzọ ọ bụla, ma bụ site n'ekpere na ibu onu."
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu