Uka nke asaa n'oge na-adanyeghị n'emume – Week 3 Green

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
1 Sm 26: 2. 7-9. 12-13. 22-23
-
Abụọma na azịza ya
Ps 103: 1-2. 3-4. 8. 10. 12-13 (8a)
-
Ihe ọgụgụ nke abụọ
1 Cor 15: 45-49
- OziọmaLk 6: 27-38
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ : 1 Sm 26: 2. 7-9. 12-13. 22-23
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Samuel Nke Mbu
Sol kpooro puku ndị agha atọ, ndị sikarichara n'ike n'usoro agha Izrel niile, jee ikpa Zif ịchọ Devid. Devid na Abishai biakwutere ndị agha Izrel n'abali, hụ Sol ka ọ dinara n'ime ogige ahụ. Ube ya tugidekwara n'ala n'akuku isi ya. Abna na ndị agha Izrel niile dinakwara gburugburu ya. Abishai wee si Devid, "Chineke etinyela onye iro gị n'aka gị n'abali taa. Ugbu a, ka m were ube ya rugide isi ya n'ala. Naani otu ugboro ka m ga-atu ya tugbuo ya. Agaghi m atuzu ya ugboro abuo!" Devid wee si, "Egbukwala ya! Onye ọbụla gburu ya, Chukwu ga-enye ya ahuhu, n'ihina ọ bụ onye e tere mmanụ dị eze." Devid weere ube na ite mmiri Sol, n'akuku isi ya. Ya na Abishai wee pụọ. Ọ dịghị onye hụ ha. Ọ dịghị onye matara ihe merenu. Ọ dighikwa onye tetara. Ha niile dara n'oke ụra nke Yahweh ziteere ha. Devid gafere n'ofe ọzọ nke ndagwurugwu dị n'ebe ahụ, rigoro n'elu ugwu, ebe ditu anya, ebe ha agaghị anwude ya. Devid zara ya si, "Lee ube gị, eze! Ka otu onye n'ime ndị agha gị feta were ya. Chineke na-akwụ ndị ezi omume na ndị tukwasara ya obi ugwo. Ọ tinyere gị n'aka m taa, ma emerughi m gị ahu, n'ihi na ị bụ onye Yahweh tọrọ mmanụ dị eze."
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA : Ps 103: 1-2. 3-4. 8. 10. 12-13 (8a)
Azịza: Onweanyi bụ ebere na ịhụnanya,
1. Ihe niile dị n'ime m, gozie aha nso Ya.
Mkpụrụobi m, too Onweanyi.
E chefukwala amara niile o mere gị.
Azịza: Onweanyi bụ ebere na ịhụnanya,
2. Ọ bụ Ya na-agbaghara njo gị niile.
Ọ bụkwa Ya na-agwo ọrịa gị niile.
Ọ na-agbaputa ndu gị ka ị ghara ila n'iyii.
Ọ ji jhụnanya na ebere kpụrụ gị okpu eze.
Azịza: Onweanyi bụ ebere na ịhụnanya,
3. Onweanyi bụ ebere na onye amara,
Ọ naghị ewe iwe oku.
Obioma Ya ebuka.
Ọ naghị emesi anyị omume dị ka njo anyị si di.
Ọ naghị esocha ka njo anyị si bụ ibu akwu anyị ugwo.
Azịza: Onweanyi bụ ebere na ịhụnanya,
4. Dika onwuwa anyanwu si tee aka n'odida ya;
Otu ahụ ka O si eweti mmehie anyị aka n'ebe anyị nọ.
Dika nna si nwee obi ebere n'ebe ụmụ ya nọ,
Otu ahụkwa Onyeweanyi si emere ndị na-aturu Ya egwu ebere.
Azịza: Onweanyi bụ ebere na ịhụnanya,
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ: 1 Cor 15: 45-49
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Pọl dị asọ degaara ndị Korintians
E dere ya n'Akwụkwọ Nsọ si, "Mmadu mbu, bụ Adam, ghoro mkpụrụobi di ndu." Adam nke ikpeazu wee ghoo Mmuo nke na-enye ndu. Ma ihe bụ ụzọ bụ ahu nkitį, ọ bụghị ahu nke mmuo, nke bjarịrị n'ikpeazu. Otu o di, Adam nke mbu si n'ala pụta, e jikwara aja kpuo ya, ma Adam nke abuo si n'eluigwe bia. Otu mmadu mbu ahu e jiri aja kpuo di, ka ndị niile si n'aja pụta dikwa. Otu onye nke eluigwe ahu di, ka ndị niile bụ ụmụ eluigwe dikwa. Dika anyị yikwasa onyinyo nke mmadu e jiri aja kpuo, otu ahukwa ka anyị ga-esi yikwasa onyinyo nke mmadu nke eluigwe.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
Mbeku:
Alleluia, Alleluia:
Onye nwe anyị,
meghee obi anyị,
ka anyị nara okwu nke Nwa Gi.
Alleluia
OZIỌMA : Lk 6: 27-38
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Jesu gwara ụmụazụ Ya: "Ma ana m agwa unu ndị na-anụ okwu m, hụrụ ndị iro unu n'anya, meerenu ndị kporo unu asi iheoma. Ma na-agozinu ndị na-abụ unu ọnụ, kpeerenu ndị na-akpari unu ekpere. Ọ bụrụ na onye ọbụla amaa gị ụra n'otu nti, tughariara ya ibe nti gị nke ọzọ. Ozokwa, ọ bụrụ na onye ọbụla azọrọ gị uwe i yi n'ime, hapukwara ya uwe mwuda gị. Nye onye ọbụla na-arịọ ihe n'aka gị. Ọ bụrụ na onye ọbụla ewere ihe gị ụfọdụ n'aka gị, ajula maka ya ọzọ. Na-emesonu ndị mmadụ omume, otu unu ga-acho ka ha meso unu. "Ọ bụrụ na ndị unu na-ahụ n'anya bụ nanị ndị hụrụ unu n'anya, olee óké ihe otito unu nwere n'ime ya? N'ihina ọ bụ nanị ndị omenjo nwere jhunaanya n'ebe ndị hụrụ ha n'anya nọ. Ọ bụrụ na unu emee iheoma nye nanị ndị mere unu iheoma, olee óké ihe otito unụ nwere n'ime ya? N'ihina ọ bụ nanị ndị omenjo na-eme otu ahụ. Ọ bụrụ na ndị unu na-ebinye ihe nye nanị ndị unu nwere olileanya na unu ga-anata n'aka ha, olee óké ihe otito unụ nwere n'ime ya? Ọ bụ nanị ndị omenjo na-ebinye ndị omenjo ibe ha ihe, nwere olileanya na ha ga-anataghachi ihe ha binyere. Kama, hụrụ ndị iro unu n'anya, mekwanu iheoma, binyekwanu mmadụ ihe, na-achoghi omurunwa, ụkọ oru unu ga-ebu ibu, unu ga-abụ ụmụ nke onye kacha di elu. N'ihina ọ nwere obioma n'ebe mmadụ niile nọ, ma ndị nwere obi ekele ma ndị na-acho nanị nke onwe ha. Nweenu obi ebere dika Nna unu nke eluigwe si nwee obi ebere. "Unu ekpela mmadụ ibe unu ikpe ka a ghara ikpe unu ikpe, Unu amakwala mmadụ ibe unụ ikpe ka a ghara ima unu ikpe, nweenụ obi mgbaghara ka e wee gbaghara unu. Gbasapuni aka nye, Chineke ga-enyereghachikwa unu. Ọ ga-ebunye unu iheoma n'akpa buru ibu, nke ayoghariri ihe di n'ime ya, sujue ya n'onu, nke iheoma juputara, na-awupu. Chineke ga-adoba iheoma n'apata ukwu unu abụọ. N'ihina udi akpa unu ji tunyere ndiozo ka a ga-eji tunyere unu."
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu