Emume Nke – Chair of Peter - White

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
1 Pt 5:1-4
-
Abụọma na azịza ya
Ps 23:1-3a, 4, 5, 6
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaMt 16:13-19:
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ : 1 Pt 5:1-4
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Pita
Ana m agba ndi okenye nọ n'etiti unu ume; mụ onwe m bụ okenye. Abụ m onye akaebe nke ahuhu niile Kristi tara, burukwa onye ga-eso keta oke n'otito ahụ a ga-ekpughe. Ana m mario unu: Na azụna igweaturu nke Chineke tinyere unu n'aka. Na-elekotanu ha anya nke ọma dika Chineke si choo. Ọ bụghị na mmanye, kama dika ndi o siri n'obi pụta. Na-arụrụ ọrụ unu, ọ bụghị n'ihi ugwo a ga-akwụ unu, kama n'ihina ọ na-anụ unu oku n'obi ime ya. Unu emegbula ndi nọ n'okpuru unu na ndi unu nwe. Kama mee onwe unu ihe e ji amaatu nke igweaturu ahụ ga-enomi. Mgbe onye isi ozuzu atụrụ ahụ ga-apụta ihè, unu ga-anatakwa okpueze ahụ nke ebube ya na-adigide.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA : Ps 23:1-3a, 4, 5, 6
Azịza: Chineke bụ onye nche m, onweghi ihe m ga-acho
1. Chineke bụ onye nche m, onweghi ihe m ga-acho.
Ọ na-eme ka m zuru ike ebe ahịhịa ndụ dị,
Ọ na-eduga m na mmiri,
Ebe ahụ ka Ọ na-enye m ike.
Azịza: Chineke bụ onye nche m, onweghi ihe m ga-acho
2. Ọ na-eduga m n'uzo ezi omume, n'ihi aha Ya,
Ọ bụ ezie na m na-aga na ndagwurugwu nke onwu,
Egwu ọbụla agaghị atu m, iji mkpara na ngwu gị nọdebe m,
Ọ bụ ha na-enye m agbamume.
Azịza: Chineke bụ onye nche m, onweghi ihe m ga-acho
3. I na-akwadoro m nri n'ihu ndị iro m,
I teela isi m mmanụ,
Ikpọ m ejula n'ọnu na-agbofu.
Azịza: Chineke bụ onye nche m, onweghi ihe m ga-acho
4. N'ezie, obioma na ebere ga na-eso m,
Ụbọchị ndụ m niile.
Aga m ebi n'ụlọ nke Chineke ebe ebebe!
Azịza: Chineke bụ onye nche m, onweghi ihe m ga-acho
Mbeku:
Alleluia, Alleluia:
Ya bụ, agwa m gị, gị bụ Pita,
n'elu okwute a ka m ga-arukwasi nzuko m,
onuzo okummuo agaghị emeri ya.
Alleluia
OZIỌMA : Mt 16:13-19:
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Mgbe Jesu bịa n'obodo Sizeria Filipi, o jụrụ ndị na-eso ụzọ ya si, "Onye ka ndị mmadụ na-ekwu na nwa nke mmadụ bụ?" Ha siri ya, "Ufọdụ na-ekwu na o bụ Jon onye na-eme mmirichukwu. Ndị ọzọ na-ekwu na o bụ Elaija. Ma ndị ọzọ na-ekwu na o bụ Jeremaya ma ọ bụ otu onye n'ime ndị amụma." Ma o jụrụ ha, "Onye ka unu na-ekwu na m bụ?" Simon Pita zara si, "Ị bụ Kristi, nwa nke Chineke dị ndụ." Jesu wee zaa ya si, "Ị bụ onye a gosiri, Ọgọzi Simon nwa Jona! N'ihina, ọ bụghị mmadụ kpugheere gị eziokwu nke a, kama ọ bụ Nna m nke bi n'eluigwe. Ya bụ, agwa m gị, gị bụ Pita, n'elu okwute a ka m ga-arukwasi nzuko m, onuzo okummuo agaghị emeri ya. Aga m achinye gị mkpịsịgodo nke Alaeze eluigwe. Ọ bụ ezie na ị ga-eke agbu n'elu uwa, a ga-ekekwa ya n'eluigwe. Ọ bụ ezie na ị ga-atopu agbu n'elu uwa, a ga-atopukwa ya n'eluigwe."
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu