Fraide Izu nke isii n'oge na-adanyeghị n'emume – Peter Damian - Green

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Gn 11:1-9
-
Abụọma na azịza ya
Ps 33:10-11; 12-13; 14-15
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaMk 8:34-9:1
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ : Gn 11:1-9
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Genesis
Uwa niile nwere otu asụsụ na mkpụrụ okwu ole na ole. Ugbu a, ka ndị mmadụ nọ na-abawanye, ha gbasara ruo n'akuku owuwa anyanwụ, ebe ha chọtara ala dị larịị n'ala Shina, biri ebe ahụ. Ha gwara onwe ha, "Ngwanu ka anyị kpuo aja, bia na ha n'elu oku." Ha ewere aja akpuruakpu n'ọnọdụ nkume, ma werekwa mgba n'ọnọdụ ụrọ. Ha gwakwara onwe ha, "Bịanu ka anyị wuo onwe anyị otu obodo mepere emepe, nakwa otu ụlọ elu nke ofe isi ya ga-erute Eluigwe. Ka anyi buru ndị a ma ama, ka anyị ghara igbasa n'akuku ụwa niile." N'oge ahụ, Yahweh alọdata ihu obodo ahụ mepere emepe na ụlọ elu nke ndị mmadụ ahụ wuru. Yahweh Chineke kwuru si: "Lee, ha bụ otu mba, nwekwara otu asụsụ; nke a bụ nanị mbido ihe ha nwere ike ime ugbu a, o nweghị ihe ha ga-achọ ime ga-akarị ha. Bịanu ka anyị gbadaa gaa gbaruo asụsụ ha ebe ahụ, otu ha na-agaghi aghọta asụsụ onwe ha." Site n'ebe ahụ ka Yahweh mere ka ha gbasaa n'elu ụwa niile; ha kwusiri iru obodo ahụ. Nke a mere eji kpoo ya Babel, ebe ọ bụ n'ebe ahụ ka Yahweh megharịrị ha anya n'asụsụ ha, nyekwa ha asụsụ dị iche iche, ọ bụkwa site n'ebe ahụ ka ọ gbasachara ha n'elu ụwa niile.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA : Ps 33:10-11; 12-13; 14-15
Azịza: Anuri na ngozi na-adịrị mba, Chineke bụ Chukwu ha, ndị nke Ọ hụrụ dị ka mil nke ya.
1. Onyenweanyi na-emebi atumatu mba niile;
O na-eme ka echiche ha daa n'iyi.
Mana atumatu Chineke ga-adi okpu;
Echiche obi Ya niile ga-adi ebeebe.
Azịza: Anuri na ngozi na-adịrị mba, Chineke bụ Chukwu ha, ndị nke Ọ hụrụ dị ka mil nke ya.
2. Anuri na ngozi na-adịrị mba,
Chineke bụ Chukwu ha, ndị nke Ọ hụrụ dị ka ndị nke ya.
Chineke si n'eluigwe eledata anya;
O na-ahu ụmụ mmadụ niile.
Azịza: Anuri na ngozi na-adịrị mba, Chineke bụ Chukwu ha, ndị nke Ọ hụrụ dị ka mil nke ya.
3. Si n'ebe Ọ nọ na-ele anya,
na-ele ndị niile bi n'ụwa anya.
Onye nke mere obi mmadụ niile,
na-agbakokwa ihe niile ha na-eme.
Azịza: Anuri na ngozi na-adịrị mba, Chineke bụ Chukwu ha, ndị nke Ọ hụrụ dị ka mil nke ya.
Mbeku:
Alleluia, Alleluia:
Anụrị ga adịrị ndị nuru okwu Chineke,
were ikwesi ntukwasi obi na obi dị mma,
jidesie ya ike werekwa ndidi miputa mkpuru.
Alleluia
OZIỌMA : Mk 8:34-9:1
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere
Jisọs kpokọta igwe mmadụ ahụ na ndị na-eso ụzọ ya, sị ha, "Ọ bụrụ na onye ọ bụla na-acho iso m, ya jụọ onwe ya, buru obe ya sọọ m n'azụ. N'ihina onye ọ bụla nke na-acho ichekwaba ndu ya ga-atufu ya; ma onye ọ bụla nke ga-atufu ndu ya n'ihi m na n'ihi ozioma, ga-azoputa ya. Uru gịnị ka o ga-abaara mmadụ ma o ritẹcha akpụkpọ ụkwụ niile nke ụwa a, ma tufuo ndu ya? Gịnị ka mmadụ ga-eji kwughachi ụgwọ ndu ya? N'ihina onye ọ bụla m na okwu m na-eme ihere n'ogbo a, na-eme ihe ọjọọ na-akwakwa iko, ihere onye ahụ ga-emekwa Nwa nke mmadụ mgbe o ga-abịa n'ebube nke Nna ya, ya na ndị mmụọ Ọma ya dị nso." O siri ha, "N'igwe unu eziokwu, o nwere ufọdụ n'ime ndị guzoro n'ebe a na-agaghị anwụ onwu ruo mgbe ha ga-ahu ọchịchọ nke Chineke ka o bjara n'ike."
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu