Toozde Izu nke isii n'oge na-adanyeghị n'emume – Francisco and Jacintha - Green

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Gn 9:1-13
-
Abụọma na azịza ya
Ps 102:16-18; 19-21; 29 and 22-23
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaMk 8:27-33
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ : Gn 9:1-13
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Genesis
Chineke agọzie Noa na ụmụ ya ma sị ha, "Mụbanu ma juputanu n'uwa. Unu ga-abụ ndị a ga-atù egwu n'ebe ụmụ anụmanụ niile nọ n'elu ala na ebe ụmụnụnụ nke igwe nọ n'ebe ihe niile nke na-ari ari n'elu ala na n'ebe azụ nke dị n'osimiri nọ, e tinyela ha niile n'aka unu. The niile dị ndụ, nke na-agaghari agaghari ga-abụ ihe oriri unu; dịka m siri nye unu ihe niile. Unu agaghị eri anụ agbagi obara. Aga m ajụ ajụjụ maka ndụ unu, ajụjụ maka nke mmadụ niile nakwa nke ụmụ anụmanụ. Onye ọ bụla gburu mmadụ a ga-egbukwa ya n'ihina Chineke kere mmadụ n'oyiyi ya. Mịtanu mkpuru ma mụbanu juputanu n'uwa ma chiwanu ya." Chineke gwara Noa na ụmụ ya okwu ndị a, "Lee, mụ na gị na ụmụ gị ga-enwe ogbugbandu; na ihe niile e kere eke nke gị na ya nọ, ụmụnụnụ, anụlụ na anụ ọhịa niile so gị, ihe niile nke si n'ime ụgbọ ahụ pụta, ihe niile dị ndụ n'elu ụwa. Ma aga m edozi ogbugbandu m na gị nke na-enweghị mgbe ọzọ a ga-eji oke mmiri emebi ihe niile dị ndụ; a gaghị eji oke mmiri emebi ụwa ọzọ." Chineke asị, "Nke a bụ akara nke ogbugbandu a m na-eme n'etiti m na gị na n'ihe niile e kere eke gị na ya so n'afọ niile na-abịa. Ugbu a etinyela m egwurugwu m n'ime urukpu; o ga-abụ akara maka ogbugbandu n'etiti m na ụwa."
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA : Ps 102:16-18; 19-21; 29 and 22-23
Azịza: Onyenweanyi sitere n'eluigwe na-ele ụwa anya.
1. Mba niile ga-atù aha nke Onyenweanyi egwu,
ndị eze ụwa niile ga-asopuru otito gị;
N'ihina Onyenweanyi ga-arughari Zayon; mekwaa ka a hụ ebube ya.
O ga-aza ekpere ndị ogbenye, ọgaghị ajụ arịrịọ ha.
Azịza: Onyenweanyi sitere n'eluigwe na-ele ụwa anya.
2. Ka e debaa ihe ndị a n'akwụkwọ
Maka agburu ndị ga-abịa n'ihu
Ka ndị niile amịbeghị amụ were nwee ike too Onyenweanyi
Onyenweanyi sitere n'ebe nke ya dị aso were ledata anya
Ka o were nụrụ ude ndị nọ na mkpọrọ na-asu
Ka o were tohapụ ndị a mara ikpe onwu
Azịza: Onyenweanyi sitere n'eluigwe na-ele ụwa anya.
3. Umuodibo gị ga-ebin'udou
Umu ha ga-akwudosikwa ike n'ihu gị
N'ihi nke a, aha Onyenweanyi ga-ewu ewu na Zayon
otito ya ga-adikwa na Jerusalem
mgbe mba niile na alaeze niile
ga-agbakota ọnụ, ife Onyenweanyi
Azịza: Onyenweanyi sitere n'eluigwe na-ele ụwa anya.
Mbeku:
Alleluia, Alleluia:
Ọ bụrụ na mmadụ ahụ m n'anya,
ọ gà-edobe okwu m. Nna ga-ahukwa ya n'anya.
Anyị ga-abikwute ya, biri n'ime ya.
Alleluia
OZIỌMA : Mk 8:27-33
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere
Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya pụtara gagharia n'obodo nta dị iche iche nke obodo Sizeria Filipi. Ka ha na-aga n'uzo, Jisọs jụrụ ndị na-eso ụzọ ya sị, "Onye ka ndị mmadụ na-asị na m bụ?" Ha sịrị ya, ufọdụ na-ekwu na ị bụ Jon, onye na-eme mmirichukwu; ndị ọzọ na-ekwu na ị bụ Elia; ndị ọzọkwa na-asị na ị bụ otu onye n'ime ndị amụma." O jụrụ ha sị, "Onye ka unu onwe unu na-asị na m bụ?" Pita zara ya sị, "Ị onwe gị bụ Kristi a!" O doro ha aka na ntị ka ha ghara igwa onye ọ bụla banyere ya. Jisọs bidoro ikuziri ndị na-eso ụzọ ya na nwa nke mmadụ ga-ata ọtụtụ ahuhu; ndị okenye na ndị isi nchuaja na ndị odeakwukwo ga-ajukwa ya, a ga-egbu ya. Ma mgbe ụbọchị atọ gachara, O ga-ebilitekwa n'onwu. O kọọrọ ha ihe a n'ezoghi ọnụ. Pita kpụọrọ ya gaa n'akuku malite ibara ya mba. Ma Jisọs tughariri, lee ndị na-eso ụzọ ya anya, wee baara Pita mba, sị, "Gafee m n'azụ, Ekwensu! N'ihina uche gị abughi uche nke Chineke kama ọ bụ uche nke mmadụ!"
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu