Wenezde Izu nke isii n'oge na-adanyeghị n'emume – Conrad Green

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Gn 8:6-13; 20-22
-
Abụọma na azịza ya
Ps 116:12-13; 14-15; 18-19
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaMk 8:22-26
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ: Gn 8:6-13; 20-22
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Genesis
Ka iri ụbọchị anọ gachara, Noa mepere mpioikuku ụgbọ ahụ o ruru. O zipu otu ugoloma nke nọ na-efegharị, ruo mgbe mmiri tachara n'elu ụwa. O zipu otu nduru iji chọpụta ma mmiri ka nọ n'elu ụwa. Ma nduru ahụ, ahughị ebe o ga-ebere; o lokwute ya n'ime ugbọ ahụ, n'ihi na mmiri juputara n'elu ụwa niile. O weputara aka ya jide ya ma weghachi ya azụ n'ime ụgbọ ahụ. Ka abali asaa gachakwara, o si n'ugbo ahụ zipu nduru ahụ ọzọ. Na mgbede, nduru ahụ ewere laghachikwute ya kpuru akwụkwọ ndụ nke oliv n'ọnụ ya. Nke a mere Noa ji mata na mmiri atachala n'elu ụwa. Ka ubochi asaa ọzọ gara, o zipukwara nduru ahụ ọzọ, ma nduru ahụ alaghachikwuteghị ya ọzọ. Ọ bụ n'ime narị afọ isii, n'afọ mbu nke ndụ Noa, n'ime ọnwa mbu n'ubochi mbu nke ọnwa ahụ, ka mmiri ahụ bidoro tachapụ na ụwa. Noa ewere mepee ọnụ ụzọ ụgbọ ahụ lepụ anya, hụ na elu ala agbakochara. Mgbe ahụ Noa ruuru Yahweh ebe nchuaja, o were ụmụ anụmanụ na umunnụ niile na-emerughị emerụ chụọ aja nsureoku n'ebe nchuaja ahụ. Mgbe Yahweh nụrụ isi aja nsureoku ahụ, Yahweh ekwuo n'ime obi ya sị, "Mgbe ọzọ agaghị m abụ ụwa ọnụọgụ n'ihi ụmụ mmadụ, n'ihi na obi ha na-achọ ihe ọjọọ site na mgbe ha dị na nwata. Ọ nweghi mgbe ọzọ m ga-egbukwa ihe niile dị ndụ dịka m siri mee. Oge niile ụwa ga-adị site ugbu a gaa n'ihu, oge iku ihe na ighota ihe ubi, oge oyi, otutu na ekpomọkụ, udu mmiri na ọkọnwụ, abalị na ehihie agaghị akwusi ídí."
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA: Ps 116:12-13; 14-15; 18-19
Azịza: Aga m achụrụ gị aja ekele, wee kpokue aha nke Onyenweanyi.
1. Kedu ihe m ga-enye Onyenweanyi?
Maka ihe ọma niile o meere m,
Aga m ebuli iko nzoputa, wee kpokue aha nke Onyenweanyi.
Azịza: Aga m achụrụ gị aja ekele, wee kpokue aha nke Onyenweanyi.
2. Aga m emejuputa nkwa m kwere Onyenweanyi,
n'ihu ndị nke ya niile.
Onwu onye eziomume di oke ọnu n'ebe Onyenweanyi nọ.
Azịza: Aga m achụrụ gị aja ekele, wee kpokue aha nke Onyenweanyi.
3. Aga m emejuputa nkwa m kwere Onyenweanyi,
n'ihu ndị nke ya niile.
N'ogige ulo nke Onyenweanyi, n'etiti gị Jerusalem.
Azịza: Aga m achụrụ gị aja ekele, wee kpokue aha nke Onyenweanyi.
Mbeku:
Alleluia, Alleluia:
Iwu nke Onyenweanyi kwu okwu,
o na-enye obi anuri; Iwu nke Onyenweanyi pụtara ihe;
bụ ihe eji ahu ụzọ.
Alleluia
OZIỌMA : Mk 8:22-26
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere
Mgbe Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya bjarutere na Betsajda, ufọdu ndị mmadụ kpotaara Jisọs otu onye isi, rịọ ya ka o metụta ya aka. O sekpụụrụ onye isi ahụ n'aka, dọpụta ya n'obodo nta ahụ. Jisọs bunyere asu n'anya abụọ nke onye isi ahụ, bikwasakwa ya aka ya abụọ, o jụọ ya, sị, "O nwere ihe i hụrụ?" Nwoke ahụ lelitere anya elu, sị, "Ana m ahu ndị mmadụ ma ha na-agaghari dị ka osisi na-aga ije." Jisọs bikwasakwara aka ya abụọ n'anya nwoke ahụ ọzọ. Nwoke ahụ legidesiri anya ike, anya ya dikwa mma ọzọ; o were huchaa ihe niile nke ọma. Jisọs zilara ya ụlọ, sị ya, "Abanyekwala o buladi n'ime obodo ntakirja."
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu