Monde Izu nke isii n'oge na-adanyeghị n'emume – Seven Founders of the Order of Servites – Green

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Gn 4: 1-15. 25
-
Abụọma na azịza ya
Ps 50: 1 and 8. 16bc-17. 20-21
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaMk 8:11-13
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ : Gn 4: 1-15. 25
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Genesis
Nwoke ahụ na nwunye ya bụ liv nwere mmekọ, nwunye ya ahụ bịara dị ime mụọ Ken si: "Amụtala m nwanne nwoke site n'enyemaka Yahweh." Ọ bịara mụọ nwa nke abụọ, Ebel, nwanne nwoke Ken. Ugbu a Ebel bụ onye nche anụ ụlọ, na-azụ igwe atụrụ ya, ebe Ken bụ onye ọrụ ugbo. Ka ihe na-aga, Ken wetara ụfọdụ ihe oriri ndị si n'ubi ya wee chụnyere Yahweh àjà, ebe Ebel n'ụzọ nke ya sitere n'igwe ewu na atụrụ ya wetara otu atụrụ e bu ụzọ mụọ, nke gbara abụba, iji nye onyinye nke ya. Yahweh nabatara onyinye Ebel. Ma o nabataghị onyinye Ken. N'ihi nke a, ọ̀nụma juputara ya n'obi, ihu ya wee gbụrụ gburu. Yahweh ajụo Ken si, "Gịnị mere ị ji juputa n'iwe, kedụ ihe i ji agbụrụ ihu? Ọ bụ na a gaghị anabata gị ma i na-eme ihe dị mma? Ọ bụrụkwanụ na i ju irubere isi, lezie anya n'ihi na i nwere ike ịdaba n'ajọ omume, mana i nwere ike imeri ajọ omume ahụ." Ken gwara nwanne ya nwoke Ebel sị, "Ka anyị pụọ jee n'ọhịa." Ka ha nọ n'ime ọhịa ahụ, Ken abagidere nwanne ya nwoke Ebel gbuo ya. Yahweh ajụo Ken sị, "Lee ebe nwanne gị nwoke Ebel nọ?" Ọ zara ya sị, "Amaghị m; abu m onye nche nwanne m?" Yahweh ajụo ya sị, "Gịnị bụ nke a i mere? Gee nti, olu àkwà nwanne gị nwoke ị gburu esila n'ala ruo m nti. Site ugbu a gaa n'ihu, ị̀bụrụ onye a buru ọnụ site n'ala i jiri ọbara nwanne gị merụọ. Mgbe ọ bụla ị kọrọ ugbo, ọ gaghị eru gị dika ike ya niile si dị; ị ga-abụ onye na-awagharị awagharị na onye na-abụghị ihe n'ụwa." Ken sịrị Yahweh, "Ntaramahụhụ m karịrị oke m nwere ike iburu. Lee anya, ị chụpụrụ m n'elu ụwa taa; agaghịkwa m ahụ ihu gị ọzọ, abụ m onye na-awagharị awagharị na onye na-enweghi ebe obibi n'elu ụwa nke na onye ọ bụla hụrụ m ga-egbu m." Yahweh zara ya sị, "Mba! ọ bụrụ na onye ọ bụla egbuo Ken, a ga-ebo ya ihe ọdụ okpukpu asaa." Yahweh nyere Ken akara, ka a ghara inwe onye ọ bụla ga-egbu ya. E mechaa, Adam na liv nwere mmekọ ọzọ mụọ nwa nwoke nke ha kpọrọ Seet, n'ihi na nwaanyị ahụ sịrị, "Chineke enyeela m nwa ọzọ ga-anọchi onodu Ebel, n'ihi na Ken gbagburu ya."
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA : Ps 50: 1 and 8. 16bc-17. 20-21
Azịza: Ka inye ekele gị bụrụ àjà nke i na-achụnyere Chineke.
1. Onyenwe anyị, Chineke nke chi niile,
na-akpọ ọ́zụ́zụ́ na-akpọ ụwa niile
bido n'ọwụwa anyanwụ ruo n'ọdụda ya.
Ọ bụghị n'ihi àjà unu ka m ji wee na-abà unu mba;
àjà nsure ọkụ unu nọ n'ihu m oge niile.
Azịza: Ka inye ekele gị bụrụ àjà nke i na-achụnyere Chineke. .
2. Kedu ikike unu nwere iji na-agbagharị iwu
m ji na-ekwupụta maka ogbugba ndu m?
N'ihi na unu juputara na-anabatankuzi m,
ma leghara okwu m anya.
Azịza: Ka inye ekele gị bụrụ àjà nke i na-achụnyere Chineke.
3. Unu na-adị nkwadebe ikwu otu nwanne unu ma na-ebukwa ya ebubo.
Unu na-eme nke a, chere na m ga-akpọtụrụ nkiti?
Unu chere na m dị ka unu?
Ugbu a aga mabara unu mba, aga m eme ka o doo unu anya.
Azịza: Ka inye ekele gị bụrụ àjà nke i na-achụnyere Chineke.
Mbeku:
Alleluia, Alleluia:
Nara n'ụzi nke a, ọ bụghị dị ka okwu mmadụ, kama okwu nke Chineke.
Alleluia
OZIỌMA : Mk 8:11-13
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere
Ụfọdụ ndị Farisii bịakwutere Jisọs malite inuru ụdịrụrụta, na-achọkwa ihe ịrịba ama si n'igwe bịa iji nwalee ya. O mara ụsụ rụrụ n'ụsụ jụụ sị, "Gịnị mere ọgbọ a ji achọ ihe ịrịba ama? N'ezie agwa m unu, agaghị enye ọgbọ a ihe ịrịba ama ọbụla." O hapụrụ ha, banyekwa ọzọ n'ụgbọ mmiri, gafee n'ofe nke ọzọ.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu