Ụka nke isii n'oge na-adanyeghị n'emume – Psalter Week 2 – Green

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Jer 17: 5-8
-
Abụọma na azịza ya
Ps 1: 1-2. 3. 4. 6 (40: 5a)
-
Ihe ọgụgụ nke abụọ
1 Cor 15: 12. 16-20
- OziọmaLk 6: 17. 20-26
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ : Jer 17: 5-8
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Jeremaya
Yahweh kwuru si, “Omume ikpe dịịrị onye nke tụkwasịrị obi na mmadụ, onye chekwubere naanị n'ike aka mmadụ, onye obi ya jụrụ Chineke. Dị ka obere osisi nke pụtara n'ikpa enweghị ihe ọma ga-esi na ya pụta. Ọ ga-anọ n'ala kọrọ nkụ nke ikpa ahụ, n'ala nụrụ mmadụ ebighi.
Ngozi dịrị onye ahụ nwere nchekwube na Chineke, onye nchekwube ya bụ na Yahweh. Ọ dị ka osisi a kụrụ n'akụkụ mmiri, nke gbanyere mgbọrọgwụ na mmiri, ọ naghị atụ egwu ọkọchị n'ihina akwụkwọ ya na-adị ndụ mgbe niile. Ọ dịghịkwa atụ egwu n'oge ụkọ mmiri, ọ na-amị mkpụrụ oge niile.”
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA : Ps 1: 1-2. 3. 4. 6 (40: 5a)
Azịza: Anụrị ga-adịrị onye tụkwasịrị obi na Dinwenu.
1. N'ezie, ịdị jụụ dịịrị onye ahụ na-aghọghị ndumọdụ onye ajọ omume;
onye anaghị eguzo n'ụlọ ndị mmehie ma ọ bụ sonye n'otu ndị na-akwa emo.
Kama ahụrị ya dị n'iwu nke Dinwenu.
Ọ na-atughari ya n'oge ehihie na anyasị.
Azịza: Anụrị ga-adịrị onye tụkwasịrị obi na Dinwenu.
2. Ọ dị ka osisi a kunyere ebe mmiri si ehudaa,
nke na-amịtakwa mkpụrụ n'oge ya;
akwụkwọ ya agaghị agbụsị agbụsị,
ihe ọma ga-adị n'ọrụ ya mgbe niile.
Azịza: Anụrị ga-adịrị onye tụkwasịrị obi na Dinwenu.
3. Ọ dịghị otu a maka ndị ajọ omume.
Ikuku ga-ebusasị ha dịka o si ebusa Ụtù ọka.
Dinwenu na-echegide ụzọ ndị ezi omume,
mana nke ndị ajọ omume na-eduga n'ala mbibi.
Azịza: Anụrị ga-adịrị onye tụkwasịrị obi na Dinwenu.
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ : 1 Cor 15: 12. 16-20
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Pọl dị asọ degaara ndị Korintians
Ma ọ bụrụ na a na-ekwusa na Chineke mere ka Kraịst si n'onwụ bilie, gịnị mere ụfọdụ n'ime unu ji ekwu na mbilite n'onwụ nke ndị nwụrụ anwụ adịghị? N'ihina ọ bụrụ na e meeghị ka ndị nwụrụ anwụ si n'onwụ bilie, Chineke emeghị ka Kraịst si n'onwụ bilie. Ọ bụrụ na Chineke emeghị ka Kraịst si n'onwụ bilie, okwukwe unu na Kraịst bụ ihe efu, unu ka ga-anwụ na mmehie unu. Mgbe ahụ ndị nwụrụ anwụ n'ime Kraịst lara n'iyi. Ọ bụrụ na olileanya anyị nwere n'ime Kraịst bụ naanị na ndụ a, anyị kwesiri imere ebere karịa n'etiti ụmụ mmadụ. Ma otu o dị, Chineke emeela ka Kraịst si na ndị nwụrụ anwụ bilie, buru onye mbụ sitere n'onwụ bilie.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
Mbeku:
Alleluia, Alleluia:
Onye-nwe-ayi, kwuwe maka na nwọdibo gị na-ege ntị.
Ọ bụ gị ji okwu nke ndụ ebighi ebi.
Alleluia
OZIỌMA : Lk 6: 17. 20-26
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Jisọs na ndị mmadụ niile rịdatara gaa guzoro n'ebe dị larịị na igwe ndị na-eso ụzọ ya, na oke igwe mmadụ ndị ọzọ ndị si n'obodo niile dị na Judia na Jerusalem, nakwa n'ụsọ oke osimiri dị n'ala Taya na Saịdọn, ndị bịara ka ha nụrụ ihe ọ na-ekwu ma nwee ogbugwu oria. Jisọs lere ndị na-eso ụzọ ya anya sị: “Ngozi na-adịrị unu bụ ndị ogbenye, n'ihina alaeze Chineke bụ nke unu. Ngozi na-adịrị unu ndị agụụ na-agụ ugbu a, n'ihina unu ga-eriju afọ. Ngozi na-adịrị unu ndị na-akwa ákwá ugbu a, n'ihina unu ga-achị ọchị. Ngozi na-adịrị unu mgbe ndị mmadụ na-akpọ unu asị, mapụọ unu n'iwu, kọpụtakwa unu, ma ọ bụ tee aha unu unyi dịka ihe aru, n'ihi Nwa nke mmadụ! Nụrụ ya n'ọtụtụ n'oge a mere, bulie elu n'ọkpụkpọ n'ihina ugwo ọrụ unu buru ibu n'eluigwe; n'ihina otu a ka ndi nna ha mere ndi amuma. Ma ihe dịịrị unu ndị ogaranya, n'ihina unu enwetala nkasi obi. Ihe dịịrị unu ndị afọ juru ugbu a, n'ihina agụụ ga-agụ unu. Ihe dịịrị unu ndị nọ n'ọchị ugbu a, n'ihina unu ga-eru uju kpọpụtakwa ákwá. Ihe dịịrị unu mgbe mmadụ niile na-ekwu ihe ọma gbasara unu, n'ihina otu a ka ndị nna ha siri rafuo ndi amuma ụgha.”
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu