Izu nke ise n'oge na-adanyeghi n'emume Catherine dei Ricci - Green

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Gn: 2: 18-25
-
Abụọma na azịza ya
Ps 128: 1-2. 3. 4-5
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaMk 7: 24-30
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ : Gn: 2: 18-25 Izu nke ise n'oge na-adanyeghi n'emume Catherine dei Ricci - Green
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Genesis
Yahweh Chineke sị, “Ọ dịghị mma ka mmadụ ahụ nọrọ naanị ya; aga m enye ya onye enyemaka.” Yahweh Chineke si n'ụrọ ala ahu kpụpụta anụ niile bi n'ọhia nakwa ụmụ nnụnụ niile na-efe n'elu; ihe ndị a niile ka o kpọtara nwoke ahụ ka o mara aha ọ ga-agụ ha; nke ọ bụla n'ime ha ga-aza aha nwoke ahụ gụrụ ya. Nwoke ahụ nyere anụ ụlọ niile, ụmụ nnụnụ igwe niile na anụ ọhịa niile ndị ahụ aha; ma ọ nweghị onye enyemaka tọrọ etọsị a chọtara nwoke ahụ. Ya mere, Yahweh Chineke jiri mee ka nwoke ahụ rahụ oke ụra. N'oge o dị n'ụra ahụ, Yahweh amịrị otu mkpịsị akpụkpọ ya, wee were anụ ahụ kpuchie oghere ebe ahụ o si wetara ya. Yahweh Chineke jiri mkpịsị akpụkpọ nwoke ahụ o mipụtara kpụpụta otu nwaanyị nke o kpọtara nwoke ahụ. N'oge ahụ nwoke ahụ ekwuo sị, “N'ikpeazụ, nke a bụ ọkpụkpụ si n'ọkpụkpụ m nakwa ahụ si n'ahụ m; a ga-akpọ ya nwaanyị n'ihi na e siri na nwoke mepụta ya.” Nke a mere nwoke ga-eji hapụ nna ya na nne ya, bia rapara n'ahụ nwunye ya, ha abụọ abụrụ otu ahu. Nwoke ahụ na nwunye ya gba ọtọ, ma ha enweghi ihere ọ bụla n'etiti onwe ha.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA : Ps 128: 1-2. 3. 4-5
Azịza: Ngozi na-adịrị ndị na-atụrụ Chineke egwu.
Ngozi na-adịrị ndị na-atụrụ Chineke egwu, na-eso ụzọ ya. Ihe aka gị kụrụ ka ị ga-eri,
anụrị na oganihu ga-abụ nke gị.
Azịza: Ngozi na-adịrị ndị na-atụrụ Chineke egwu.
Nwunye gị ga-adị ka osisi vaịn, na-amị mkpụrụ n'ime ụlọ gị,
ụmụ gị ga-adị ka osisi oliv, gbaa oche nri gị gburugburu.
Azịza: Ngozi na-adịrị ndị na-atụrụ Chineke egwu.
Lee, otu a ka a ga-esi gọzie onye ahụ nke na-atụrụ Chineke egwu.
Ka Onye-nwe-anyi si na Zayon gọzie gị, ka ị hụkwa oganihu nke Jerusalem ụbọchị ndụ gị niile.
Azịza: Ngozi na-adịrị ndị na-atụrụ Chineke egwu.
Mbeku:
Alleluia, Alleluia:
Okwu ndị m gwara unu bụ mmụọ, bụkwa ndụ, ọ bụ gịnwa ji okwu nke ndụ ebeebe.
Alleluia
OZIỌMA : Mk 7: 24-30
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere
Jesu hapụrụ ebe ahụ gaa obodo Taịa na Sidon. Ọ banye n'ụlọ, na-achọghị ka onye ọ bụla mara. Ma o zọtaghị onwe ya. Ngwangwa otu nwaanyị onye mmụọ ọjọọ jị nwa ya nwaanyị nke nta nụrụ maka ya, wee bịa, daa n'ala n'ụkwụ Jesu. Nwaanyị a bụ onye Grik, ma a mụrụ ya na Saịrọ-Fonishia. Ọ rịọrọ Jesu ka ọ chụpụ mmụọ ọjọọ n'ahụ nwa ya nwaanyị. Jesu gwara ya sị, “Ka e buru ụzọ nyejuo ụmụaka afọ n'ihi na ọ zighi ezi i were nri ụmụaka tụpụ nkịta.” Nwaanyị ahụ zara sị, “Nke a bụ eziokwu, Onye-nwe-m, ma ụmụ nkịta na-erikwa iberibe nri si n'okpokoro nri ụmụaka dapu n'ala.” Jesu zara ya, “N'ihi osisa nke a, laba; mmụọ ọjọọ ahụ ahapụla nwa gị nwaanyị.” Ọ wee laruo ụlọ hụ nwa ya nwaanyị ka ọ dina n'akwa, mmụọ ọjọọ ahụ ahapụkwala ya.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu