Izuka nke abuo n'oge nkiti

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Gn 2: 4b-9. 15-17
-
Abụọma na azịza ya
Ps 104: 1-2a. 27-28. 29bc-30
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaMk 7: 14-23
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ : Gn 2: 4b-9. 15-17
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Genesis
N'oge ahụ, mgbe Yahweh Chineke kechara Eluigwe na uwa, e nweghi nnukwu oke ohịa ọ bụla n'elu uwa, nke a na-enwe nnukwu oke osisi toliterenu, n'ihina Ọsebụrụwa Chineke ezitebeghị mmiri ozuzo n'elu uwa, nke a na-enwe mmadụ nwere ike ịkọ ihe ubi n'oge ahụ. Kama mmiri si n'ime ala ahu na-agba puta wee gbasaa n'elu ala ahu niile. Yahweh Chineke abịakwara si n'ụrọ ala ahu kpụo mmadụ, wee funye ikuku ndu n'imi ya; mmadụ ahu wee ghoo onye dị ndu. Yahweh Chineke wuru ogige n'Eden, nke dị n'ofe ọdịda anyanwụ; ọ bụ n'ebe ahụ ka ọ mere ebe obibi mmadụ ahu ọ kpụọrọ. Yahweh Chineke mere ka osisi dị iche iche dị mma ile anya ma dịkwa mma oriri si n'ụrọ ala ahu pụta; o mere ka osisi nke na-enye ndụ nakwa osisi nke ịmata ihe ọma na nke ọjọọ dịrị n'etiti ogige ahu. Yahweh Chineke kpọrọ mmadụ ahu bia nye ya ebe obibi n'ogige nke Eden ka ọ na-etize ala ya, nakwa echekwa ya. E mechara Yahweh Chineke enye nwoke ahu iwu si, “Ị nwere ike iri mkpụrụ osisi niile dị n'ogige a. Ma ị gaghị ata mkpụrụ nke osisi nke na-enye amamihe ihe ọma na nke ọjọọ, n'ihi na ubochi ị tara ya, ị ga-anwụ."
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA : Ps 104: 1-2a. 27-28. 29bc-30
Azịza : Gozie Onye-nwe-anyi, mkpụrụ obi m.
1. Gozie Onye-nwe-anyi, mkpụrụ obi m, Onye-nwe-anyi Chineke, lee ka i si dị ukwuu!
I juputara n'ebube na otito, I ji ihe ekpuchi onwe gi dịka akwa.
Azịza : Gozie Onye-nwe-anyi, mkpụrụ obi m.
2. Ihe niile e kere eke na-echere gị ka i zuo ha nri n'oge zuru ezu.
Ị na-eweta nri ha na-eri, i ji obiọma gị enye jucha ha afọ.
Azịza : Gozie Onye-nwe-anyi, mkpụrụ obi m.
3. Ị kwụsịrị ha iku ume, ha anwụo ma laghachikwa na-etuto.
Mana mgbe i nyere ha ikuku, ndụ ohuru bidoro; i na-eme uwa ka o di ohuru.
Azịza : Gozie Onye-nwe-anyi, mkpụrụ obi m.
Mbeku:
Alleluia, Alleluia:
Onye-nwe-anyi, mee ka m mata uzo gi, dube m n'uzo eziokwu gi.
Alleluia
OZIỌMA : Mk 7: 14-23
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere
Jesu kpọrọ igwe mmadụ ahụ ọzọ ka ha bịa n'azu ya. Ọ sịrị ha, “Gee nu m nti, unu niile, ghotakwanu ihe m ga-ekwu! Ọ naghị enwe ihe ọ bụla si n'ọpụpụ banye n'ime mmadụ na-eme ka ọ bụrụ ihe na-emeru mmadụ. Kama ọ bụ ihe na-esi n'ime mmadụ pụta na-eme ka mmadụ bụrụ ihe na-emeru. Onye nwere nti ya nuru.”
Mgbe Jesu hapụrụ igwe mmadụ ahụ banye n'ụlọ, ndị na-eso ụzọ ya jụrụ ya ihe okwu ahụ pụtara. Ọ jụrụ sị, “Ọ bụ na unu enwekwaghị nghọta? Ọ pụtara na unu amachaghị na ihe ọ bụla si n'ọpụpụ banye n'ime mmadụ apụghị imerụ ya? N'ihi na ihe oriri adịghị abanye n'obi mmadụ kama n'afọ. Ọ na-esi ebe ahụ pụta.” Site n'ikwu otu a, ọ mere ka ihe oriri niile dị ọcha. Ọ kwukwara sị, “Ihe na-emeru mmadụ bụ ihe si n'ime mmadụ pụta. N'ihi na site n'ime mmadụ, ya bụ site n'ime obi, ka echiche ọjọọ nke na-eduga mmadụ n'omume ruru aru, si aputa, ya na ịkwa iko, izu ohi, igbu mmadụ, ikporo nwunye mmadụ ma ọ bụ di mmadụ, obi ọjọọ na arụrụ ala, nghọta, asọghị anya, anya ụfụ, nkwulu, mpako, enweghi uche ime ihe ziri ezi na ịghọta ihe nke mmụọ. Omume ọjọọ ndị a na-esi n'ime mmadụ pụta. Ọ bụ ha na-emerụ mmadụ."
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu