UKA NKE ISE NA-ADANYEGHỊ N'EMUME Psalter Week 1 - Green

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Is 6: 1-2a. 3-8
-
Abụọma na azịza ya
Ps 138: 1-2. 2-3. 4-5. 7-8 (1c)
-
Ihe ọgụgụ nke abụọ
1 Cor 15: 1-11
- OziọmaLk 5: 1-11
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ : Is 6: 1-2a. 3-8
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Aịzaya
N'afọ nke eze Uziya nwụrụ, ahụrụ m Yahweh ka Ọ nọkwasịara n'elu ocheeze nke dị elu, ebube ya juputakwara ụlọ nsọ ahụ. Ndị mmụọma guzoro n'elu ya; mmụọma ọ bụla nwere nku isii; abụọ n'ime nku isii ndị a ka ha ji kpuchie ihu ha, werekwa abụọ ọzọ kpuchie ụkwụ ha, ebe abụọ ọzọ ka ha ji efe efe. Ha na-eti, "Nsọ, Nsọ, Nsọ ka Yahweh nke igwe agha dị; Ebube ya juputara n'elu ụwa niile." Ụda olu ha mere ntọala niile nke ụlọ nsọ ahụ maa jijiji; anwụrụ ọkụ juputakwara n'ụlọ nsọ ahụ. M wee sị, "Efuola m; leenu ụdị ọnọdụ ọjọọ m nọ n'ime ya! Maka na abụ m onye egbugbere ọnụ ya ruru aru ma nọkwa n'etiti ndị egbugbere ọnụ ha ruru aru. Anya m ahụla eze, Yahweh nke igwe agha." Mgbe ahụ, otu n'ime ndị mmụọma ahụ fekwutere m, o jikwa n'aka ya otu icheku ọkụ nke o ji ihe gụta n'ebe ịchụaja. O wee metụ m icheku ọkụ ahụ n'ọmụ si: "Lee, nke a emetụla egbugbere ọnụ gị; ya bụ na e kpochapụla ikpe ọmụma gị niile; a gbagharala gị njọ gị niile." M wee nụ olu nke Yahweh ka ọ na-asị, "Ọ bụ onye ka m ga-eziga; onye ga-ejere anyị ya bụ ozi?" Ozigbo m zaa sị, "Anọ m ebe a, ziga m."
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA : Ps 138: 1-2. 2-3. 4-5. 7-8 (1c)
Azịza: Onyenwe anyị, aga m agọzi gị n'ihu ndị mmụọma
1. Onyenwe anyị, eji m obi m niile kelee gị.
Ị nụla okwu ọnụ m niile. Aga m agọzi gị n'ihu ndị mmụọma;
aga m esekpụrụ gị n'ihu Ụlọ Nsọ gị.
Azịza: Onyenwe anyị, aga m agọzi gị n'ihu ndị mmụọma
2. Ana m ekele gị maka ikwụdosị ike na ịhụnanya gị,
nke karịrị ihe niile anyị maara maka gị na mbụ.
N'ụbọchị m kpọrọ oku, ị zara m, ị bawanyere ike nke obi m.
Azịza: Onyenwe anyị, aga m agọzi gị n'ihu ndị mmụọma
3. Ndị eze niile nke ụwa ga-ekele gị oge ha nụrụ okwu ọnụ gị.
Ha ga-ekwe ukwe banyere ụzọ nke Onyenwe anyị:
"Lekwa otú ebube nke Onyenwe anyị si buru ka ibu."
Azịza: Onyenwe anyị, aga m agọzi gị n'ihu ndị mmụọma
4. Ị na-esetị aka gị na-azọpụta m.
Aka gị ga-emere m ihe niile.
Onyenwe anyị, ịhụnanya gị dị ebighị ebi.
Ekwela ka ọrụ gị laa n'iyi.
Azịza: Onyenwe anyị, aga m agọzi gị n'ihu ndị mmụọma
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ : 1 Cor 15: 1-11
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Pọl dị asọ degaara ndị Korintias
Ma ugbu a, ụmụnna m, achọrọ m ịchetara unu maka ozioma ahụ nke m ziri unu na mbụ, nke unu natakwara, nke okwukwe unu na-agwụdosị ike na ya. Ya bụ okwu nke ozioma ahụ, nke m kwusara unu jisienu ya ike. Ma ọ bụghị otu a okwukwe unu bụ ihe efu. A hanyere m n'aka unu na mbụ ozi ahụ m nara idobe, ozi nke dị oke mkpa: Na Kristi nwụrụ n'ihi mmehie anyị niile, dịka Akwụkwọ Nsọ si kwuo; na e liri ya, ma Chineke mere ka o si n'onwụ bilie n'ụbọchị nke atọ, dịka Akwụkwọ Nsọ si kwuo; na o mere ka Sefas (ya bụ Pita) hụ ya anya; o mere kwa ka ndịozi iri na abụọ ahụ hụ ya anya. E mechaa, o mere ka ihe karịrị narị mmadụ ise ndị ụmụnna anyị hụ ya anya n'otu oge. Ọtụtụ n'ime ha ka dị ndụ, mana ụfọdụ n'ime ha anwụrụla. E mechaa o bịakwutere Jemis, bịakwutekwa ndị ụmụazu niile. N'ikpeazụ, dịka nwa a mụrụ amụkọ amụkọ, o mere kwa ka m onwe m hụ ya anya.
Mụ onwe m dịkarịchara nta n'etiti ụmụazụ, ekwesịghị m ka a kpọọ m nwaazụ, n'ihina esogburu m nzukọ Chineke. Ma site n'amara nke Chineke, abị m ihe m bụ. O putakwara ìhè n'ọrụ m na amara ya nke o nyere m abụghị n'efu. Kama, arụsịrị m ọrụ ike karịchaa ụmụazụ ndị ọzọ. Ọ bụ ezie na ọ bụghị n'ike aka m kama site n'amara nke Chineke nyere m. M'obi m, ma m'obu ndị ọzọ, otu a ka anyị siri kwusaa, otu a ka unu sịkwa kwere.
Mbekụ:
Alleluia, Alleluia:
Sọnyem! Aga m eme unu ndị mmadụ.
Alleluia
OZIỌMA : Lk 5: 1-11
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Ka Jesu guzoro n'ọdụ mmiri Genesaret, oke igwe mmadụ zukọrọ na-adagide ya ka ha nụ okwu Chineke. O hụrụ ụgbọ mmiri abụọ n'ụsọ mmiri ahụ; ma ndị ọkụazụ esila n'ụgbọ ahụ pụọ na-asa ụgbọ ha. Ka Jesu banye n'ime otu ụgbọ ahụ, nke bụ nke Sajmon, O gwara ya ka o si n'ala kwupu ụgbọ mmiri ya ntakịrị. O wee nọdụ ala, si n'ụgbọ mmiri ahụ na-akụziri ndị mmadụ ihe. Mgbe Jesu kwụsịrị okwu, O gwara Sajmon sị, "Nụpụ ụgbọ gị n'oké mmiri wụnye ụgbọ gị maka igbu azụ." Ma Sajmon zara sị, "Nna anyị ukwu, anyị doliri abalị niile n'enwetaghị ihe ọ bụla, mana otu Ị siri kwuo, aga m awụnye ụgbọ m niile." Mgbe ha mere nke a, ha kutara oke igwe azụ nke mere na ọ fọrọ obere ka ụgbọ ha dọọ. Nke a mere ha ji kpoo ndị ọkụzụ ibe ha nọ n'ụgbọ mmiri nke ọzọ ka ha bịa nyere ha aka. Ha bịara gụjupụta ụgbọ abụọ ahụ azụ, nke mere na ụgbọ ha malitere imikpu. Ma mgbe Sajmon Pita hụrụ nke a, o dara n'ukwu Jesu na-ekwu sị, "Si n'ebe m nọ pụọ, n'ihina abụ m onye njọ, Ọ Dịnwụnụ m." N'ihina ọ juru Pita na ndị ya na ha so anya ịhụ ọtụtụ azụ ndị a ha gbutere. Otu a ka o mere Jemis na Jọn, ụmụ Zebedi ndị ha na Sajmon bụ ndị nwekọ. Jesu zara Sajmon sị, "Ụjọ atụla gị, site ugbu a gaa, ị ga na-akụta ndị mmadụ." Mgbe ha kwụsịrị ụgbọ ha n'elu ala, ha hapụrụ ihe niile, so ya.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu