Satode Izu nke anọ n'oge na-adanyeghị n'emume Jerome Emiliani/ Josephine Bakhita - Green

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Heb 13: 15-17. 20-21
-
Abụọma na azịza ya
Ps 23: 1-3a. 3b-4. 5. 6
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaMk 6: 30-34
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ : Heb 13: 15-17. 20-21
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Hibru
Site na Jesu Kristi, ka anyị chunyerenu Chineke àjà otito mgbe niile, nke bụ mkpụrụ nke egbugbere ọnụ na-ekwupụta aha ya. Ụnụ ahapụkwala ime ihe ọma ma ọ bụ ime ka ndị ọzọ ghara isoro kẹrị ihe unu nwere, n’ihi na àjà dị otu a na-amasị Chineke. Rubeere ndị ndu unu isi, nọkedụkwa n'okpuru ha n'ihi na ha na-eche mkpụrụobi unu nche site n'ekpere, dị ka ndị ga-aza ajụjụ banyere unu. Ka ha were obi ụtọ na-eme nke a. Ya abụghị site n’obi ọjọọ, n’ihi na nke a agaghị abara unu uru. Ugbu a, ka Chineke nke udo, onye si n’ime ndị nwụrụ anwụ kpoghachi Onye-nwe-anyị Jesu Kristi, nnukwu onye nche atụrụ, site n’ọbara nke ọgbụgba-ndụ dị ebebe, nyezuo unu ihe ọma niile iji mee uche ya. Ka O na-arụ n'ime unu ihe nke ahụ na-adị mma n'ihu ya, site na Jesu Kristi onye otito niile bụ nke ya ebebe ebebe. Amen.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA : Ps 23: 1-3a. 3b-4. 5. 6
Azịza: Chineke bụ onye nche m, ọ dịghị ihe m ga-achọ.
1. Chineke bụ onye nche m, ọ dịghị ihe m ga-achọ.
O na-eme ka m zuru ike ebe ahịhịa ndụ dị,
O na-eduga m na mmiri,
ebe ahụ ka ọ na-enye m ike.
Azịza: Chineke bụ onye nche m, ọ dịghị ihe m ga-achọ.
2. O na-edu m n'ụzọ ezi omume; n’ihi aha ya.
Ọbụlagodi na m na-agagharị n’ime ndagwurugwu nke ọnwụ,
egwu ọbụla agaghị atụ m,
n'ihi na I ji mkpara na ngụ gị nọ n'akụkụ m.
Ọ bụ ha na-enye m agbam ume.
Azịza: Chineke bụ onye nche m, ọ dịghị ihe m ga-achọ.
3. I na-akwado m nri n'ihu ndị iro m.
I tere m isi m mmanụ, iko m ejupụtala na-agbapụta.
Azịza: Chineke bụ onye nche m, ọ dịghị ihe m ga-achọ.
4. N'ezie, obiọma na ebere ga na-eso m, ụbọchị ndụ m niile.
Aga m ebi n’ụlọ nke Chineke ebebe ebebe.
Azịza: Chineke bụ onye nche m, ọ dịghị ihe m ga-achọ.
Mbekụ:
Alleluia, Alleluia:
Atụrụ m ga-ege m nti,
Dị-nwe-nụ na-ekwu, amara m ha, ha na-eso m.
Alleluia
OZIỌMA : Mk 6: 30-34
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere
Ndị ụmụazụ Jesu lọghachikwutere ya kọọrọ ya ihe niile ha mere na ihe ha kụziri. O siri ha, “Bịanụ ka anyị gaa ebe sọ anyị ga-ano zuru ike nwa oge.” O kwuru nke a n’ihi na ọ̀tùtù mmadụ na-abịa, na-alakwa, nke mere na ha enweghị ohere ọbụla iri ihe. Ha banye n'ụgbọ mmiri, gaa ebe na-anaghị mmadụ. Ụtụtụ mmadụ hụrụ ha ka ha na-apụ, mātakwara ha. Ha jiri ọsọ si n’obodo dị iche iche buru Jesu na ndị ụmụazụ ya ụzọ, garuo ebe ha na-aga. Ka Jesu rịdata n'ugbo, O hụrụ ọ̀tùtù igwe mmadụ ka ha gbakọrọ, O nwee obi ebere n'ebe ha nọ n'ihi na ha dị ka atụrụ n’enweghị onye nche. O wee malite ikuziri ha ọtụtụ ihe.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu