Fraide Izu nke anọ n'oge naadanyeghị n'emume M. Juliana Falconieri Green

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Heb 13: 18
-
Abụọma na azịza ya
Ps 27: 1, 3, 5, 8b9abc
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaMk 6: 1429
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ : Heb 13: 18
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Hibru
Ka ịhụnanya nwanne na nwanne dịrị naaga n'ihu n’etiti unu. Unu echela ile ndị ọbịa nke ọma. Ụfọdụ mmadụ siri n’ụzọ dị otu a lee ndị mmụọọma ọbịa n’amaghị ama. Chetakwa ndị nọ na mkpọrọ, dịka a gaasi na unu soro ha nọ na ya; ya na ndị a naemegbu, ebe unu onwe unu ka nọkwa n’ụdị ahụ ahụ. Ka ịlụ di na nwunye bụrụ ihe a naasọpụrụ n’etiti unu. Ka akwa di na nwunye bụrụkwa ihe a naemerụghị site n’ikwa iko. Chineke gaekpe ndị ajọ omume na ndị naakwa iko ikpe. Wezuganụ ndụ ihu ego n’anya. Ka ihe unu nwere zuoro unu, n’ihi na Chineke kwuru si, “Agaghị m emejọ unu ma ọ bụ leghara unu anya.” Ya bụ, anyị gaeji ntukwasi obi kwuo si, “Onyenweanyi bụ onye enyemaka m, agaghị m atụ egwu, gịnị ka mmadụ gaeme m?” Chetanụ ndụ ndị ndu unu, ndị gwara unu okwu Chineke n’oge gara aga. Tuleenu otú ndụ ha siri dị, naenomi kwa okwukwe ha. Jisus Kristi bụ otu ụnyaahụ, otu taa, otu a ka ọ gaadịgidekwa ebeebe.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA : Ps 27: 1, 3, 5, 8b9abc
Azịza: Onyenweanyi bụ ìhè na nzọpụta m, onye ka m gaatu egwu?
1. Onyenweanyi bụ ìhè na nzọpụta m, onye ka m gaatu egwu?
Onyenweanyi bụ ide nke ndụ m, onye gaeji m egwu?
Azịza: Onyenweanyi bụ ìhè na nzọpụta m, onye ka m gaatu egwu?
2. Ọbụladị na igwe ndị agha agbaa m gburugburu, egwu ọ bụla agaghị atụ m,
Ọbụladị na e busoro m agha, okwukwe m ka dịrị ike.
Azịza: Onyenweanyi bụ ìhè na nzọpụta m, onye ka m gaatu egwu?
3. N’ihi na ọ naechekwa m n’okpuru ya mgbe ọ bụla m nọ na nsogbu,
Ọ naezo m n’ebe obibi ya,
Ọ naakwụba m n’elu nkume.
Azịza: Onyenweanyi bụ ìhè na nzọpụta m, onye ka m gaatu egwu?
4. Onyenweanyi, ana m achọ ihu gị, egosila m ihu gị,
Ejila iwe chụpụ nwadịbò gị,
Ọ bụ gị bụ onye enyemaka m, ahapụla m.
Azịza: Onyenweanyi bụ ìhè na nzọpụta m, onye ka m gaatu egwu?
Mbekụ:
Alleluia, Alleluia:
Taa, ọ bụrụ na unu anụ olu ya, unu ekpochila obi unu.
Alleluia
OZIỌMA Mk 6: 1429
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere
N'oge a, Eze Herod nụrụ akụkọ banyere Jesu, n’ihi na ụda aha ya naagbasa ebe niile. Nke a mere ụfọdụ mmadụ ji ekwu si, “E meela ka Jon onye naeme mmịrị chukwu si n’onwụ bilie. Ọ bụ nke a mere ọ ji arụ ọrụ ebube niile ndị a.” Ụfọdụ naekwu kwa si, “Ọ bụ Elaija;” ndị ọzọ kwuru si, “Ọ dị ka otu onye n'ime ndị amụma mgbe ochie.” Ma mgbe Herod nụrụ nke a, o kwuru si, “E kulitere Jon onye m nyere ike ka e bepụ ya isi.” N’ihi na Herod nyere iwu ka e jide Jon tinye ya n’ụlọ mkpọrọ maka ihi Herodias, nwunye nwanne ya nwoke Filip, onye ọ kpọọrọ dị ka nwunye. Jon gwara Herod si, “Ọ zighị ezi n’iwu na ị gaalụ nwunye nwanne gị.” Nke a mere Herodias ji buru Jon iwe n’obi naachọ ụzọ ọ gaesi gbuo ya. Ma o nweghị ike, n’ihi na Herod naatu Jon egwu. O maara na Jon bụ ezigbo mmadụ na onye dị nsọ. N’ihi nke a, o chekwabara ndụ ya. Ọ bụ ezie na obi adịghị eru Herod ala mgbe ọ bụla ya na Jon kparịtara ụka, ma o naatokwa Herod ụtọ ige nti n’ihe Jon naekwu. Mgbe ọ bụla dị ukwuu dịrị Herodias. N’ụbọchị ncheta ọmụmụ Herod, ọ kpọrọ oriri, kpọrọ ndị a maara aha ha n’obi eze, na ndị ọchịagha ya, na ndị mmadụ a ma ama na Galili ka ha bịa n’oriri ahụ. N’oge ahụ, ada Herodias gbara egwu, mere ka obi too Herod na ndị ọ kpọrọ oriri ụtọ. Nke a mere ka eze Herod gwa nwa agbọghọ ahụ si, “Rịọ m ihe ọ bụla ị chọrọ, aga m enye gị ya.” O nụkwara iyi maka nke a, si, “Ihe ọ bụla ị rịọrọ m, aga m enye gị ya, ọ bụladị okara alaeze m.” Nwa agbọghọ ahụ gara jụọ nne ya, si, “Gịnị ka m gaarịọ?” Nne ya sịrị ya, “Rịọ ka e nye gị isi Jon onye naeme mmịrị chukwu.” O wee gbaa ọsọ ngwangwa, bịa n’ihu eze Herod rịọ ya, si, “Achọrọ m ka i nye m n’efere ugbu a, isi Jon onye naeme mmịrị chukwu.” Nke a wutere eze Herod nke ukwuu, ma n’ihi iyi o nụrụ n’ihu ndị ọbịa ya, o chọghị imebi okwu ya. Ngwangwa eze Herod zipụrụ otu onye agha nọ na nche, nyekwara ya ike ka o gbute isi Jon onye naeme mmịrị chukwu. Onye agha ahụ gara n'ụlọ mkpọrọ bepụrụ Jon isi, bute ya n’efere, nyefee ya nwa agbọghọ ahụ. Nwa agbọghọ ahụ nyefee ya nne ya. Mgbe ndị naeso ụzọ Jon nụrụ maka ọnwụ ya, ha bịara buru ozu ya lie ya n’ili.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu