Toozde Izu nke anọ n'oge naadanyeghị n'emume Paul Miki & Companions Memorial Red:

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Heb 12: 1819, 2124
-
Abụọma na azịza ya
Ps 48: 23ab, 3cd4, 9, 1011
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaMk 6: 713
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ : Heb 12: 1819, 2124
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Hibru
Unu abịabeghị n’ihe nke e nwere ike imetụ aka dịka ọkụ naenwu enwu, ọchịchịrị, ịtiri, na oke ifufe; ụda opiike na olu nke mere ka ndị nụrụ olu ya rịọ ka a hapụ igwa ha okwu ọzọ. N’ezie, ihe ha hụrụ dị oke egwu nke mere Mosis ji tie mkpu sị, “Egwu naatu m, ahụ naama m jijiji.”
Unu abịarụkwala n’ugwu Zayon, obodo nke Chineke dị ndụ, Jerusalem nke eluigwe, ebe ndị mmụọ nke e nweghị ike ịgụta ọnụ gbakọrọ n’oriri. Unu bịara n’ọgbakọ nke ndị mbu, ndị e dere aha ha n’eluigwe, na n’ebe onyeikpe bụ Chineke nke ihe niile nọ. Unu bịakwutere mmụọ ndị eziomume nke Chineke mere ka ha zuo oke. Unu bịakwutere Jisus, onye bụ onye ọchịchị nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, ya na ọbara nke e fesara unu nke naewetara mmadụ ihe ọma dị iche iche karịa ọbara Ebel.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA : Ps 48: 23ab, 3cd4, 9, 1011
Azịza: Anyi naecheta ịhụnanya Chineke n’ụlọ nsọ ya.
1. Onyenweanyi dị ukwuu,
ọ bikwesịkwa inye otito n’obodo Chineke anyị,
n’ugwu ya dị nsọ, Zayon, ugwu nke Chineke dị elu,
maa mma, obodo nke nnukwu eze, bụ anụrị nke ụwa niile.
Azịza: Anyi naecheta ịhụnanya Chineke n’ụlọ nsọ ya.
2. Ugwu Zayon bụ isi anụrị nke ụwa niile,
ebe obibi nke nnukwu eze ahụ,
Chineke n’onwe ya egosila na ya bụ ebe mgbaba n’etiti obodo ahụ.
Azịza: Anyi naecheta ịhụnanya Chineke n’ụlọ nsọ ya.
3. Anyi ejirila anya anyị hụ ihe anyị nụrụ n’obodo nke Chineke anyị!
N’obodo nke Osebruwa nke igwe ndagha,
bụ nke Chineke mere ka ọ dị ebeebe.
Azịza: Anyi naecheta ịhụnanya Chineke n’ụlọ nsọ ya.
Mbeku:
Alleluia, Alleluia:
Atụrụ m n’azụ olu m, ama mkwaara m ha, ha naesokwa m.
Alleluia
OZIỌMA : Mk 6: 713
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere
Jesu kpọrọ ndị ụmụazụ iri na abụọ ahụ ka ha bịakwute ya. Ọ malitekwara izipu ha abụọ abụọ, nyekwara ha ike ịchụpụ ajo mmụọ. Ọ nyere ha iwu ka ha ghara iji ihe ọ bụla maka njem ha, belụsọ mkpọnwụ. Ha agaghị eji achịcha ma ọ bụ akpa, ma ọ bụ ego n’ihe ọkpụkpụ ha. Ha gaeyi akpụkpọ ụkwụ, kama ha eyikwala uwe abụọ. O gwakwara ha, sị, “Ụlọ ọ bụla unu banyere n’ime ya, nodu ebe ahụ ruo mgbe unu gaahapụ obodo ahụ. Ọ bụrụ na ndị bi n’obodo ọ bụla anabataghị unu, ọ bụrụkwa na ha ajụ inụ nti n’okwu unu, mgbe unu naapụ n'ebe ahụ, tịchapụ aja dị n’ụkwụ unu, ka ọ bụrụ ihe àmà megide ha."
Ha wee pụọ naekwusa ka mmadụ niile chegharịa. Ha chụpụrụ ọtụtụ ajo mmụọ ma tee ọtụtụ ndị ọrịa mmanụ olive, ahụ wee dị ha mma.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu