Wenezde Izu nke anọ n’oge na-adịghị n’emume Agatha - Memorial - Red

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Heb 12:5-7, 11-15
-
Abụọma na azịza ya
Ps 103:1-2, 13-14, 17-18a
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaMk 6:1-6
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ : Heb 12:5-7, 11-15
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Hibru
Unu echefuola okwu nkasiobi ahụ nke Chineke jiri gbaa unu ume dịka ụmụ ya? Sị, "Nwa m, ewela nkuzi Onyenweanyi na-akụziri gị dị ka ihe mfe, ma ọ bụ daa mba mgbe Onyenweanyi na-ata gị ahụhụ. Onyenweanyi na-eji ahụhụ akụziri onye o hụrụ n'anya, na-apjakwa nwa ọ bụla o nabatara utali." Ọ bụ maka inweta ozuzu dị mma ka unu ga-eji nwee ndidi. Chineke na-emeso unu omume dịka ụmụ ya. Ò nwere nwa ọ bụla nna ya na-adịghị akụziri ihe site n’inye ya ahụhụ? Mgbe ọ bụla a na-ezi anyị ihe site n’inye anyị ahụhụ, ọ na-abụ anyị ihe ahụhụ. Ma e mechaa, ndị ahụ e ziri ihe site n’inye ha ahụhụ na-enweta lido na ndụ eziomume dịka ụgwọ ọrụ. Ya bụ, gbaatienu aka unu n’anwụ anwụ, meekwa ka ikpere unu na-ama jijiji sie ike, Meenụ ụzọ unu ka ọ kwụ ọtọ maka ụkwụ unu, ka ụkwụ dara ngworo ghara isi na njikọ dapu, kama ka a gwoo ya. Gbaanụ mbọ ka unu na mmadụ niile na-adi n’udo, ya na ndụ ịdị nsọ. E wepụ ya, o nweghị onye puru ịhụ Onyenweanyi. Hụkwa na o nweghị onye ga-ahapụ inweta amara nke Chineke; na o nwechighịkwa onye ga-epụta dịka "Mkporogwụ ilu," weta nsogbu a ga-esi n’ime ya merụọ ọtụtụ mmadụ.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA : Ps 103:1-2, 13-14, 17-18a
Azịza:Dinwenu na-egosi obi ebere ya mgbe ebighi ebi, n’ebe ndị na-atụrụ Ya egwu nọ
1. Gozie Onyenweanyi, mkpụrụobi m,
gozie aha ya dị nsọ, ihe niile dị n'ime m!
Gozie Onyenweanyi, mkpụrụobi m,
echekwala obi ebere ya niile
Azịza:Dinwenu na-egosi obi ebere ya mgbe ebighi ebi, n’ebe ndị na-atụrụ Ya egwu nọ
2. Dị ka nna si emere ụmụ ya ebere,
otu ahụ ka Onyenweanyi si eso ndị na-atụrụ ya egwu.
O mara ihe e ji wee kee anyi o na-echeta na anyị bụ ntụ.
Azịza:Dinwenu na-egosi obi ebere ya mgbe ebighi ebi, n’ebe ndị na-atụrụ Ya egwu nọ
3. Mgbe ọbụla, ịhụnanya nke Onyenweanyi
n’ebe ndị na-atụrụ ya egwu nọ na-adị ọkpụ,
o na-adị ebeebe dịka obiọma ya dị n’ebe ụmụ ụmụ ya nọ.
O na-adịgide oge ọbụla ha na-edebe ọgbụgba ndụ ya.
Azịza:Dinwenu na-egosi obi ebere ya mgbe ebighi ebi, n’ebe ndị na-atụrụ Ya egwu nọ
Mbeku:
Alleluia, Alleluia:
Ka Chineke meghee anya nke obi unu,
ka unu wee mata ihe bụ nchekwube nke okpukpe O kpọrọ unu.
Alleluia
OZIỌMA : Mk 6:1-6
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere
Jisus siri n’ebe ahụ pụọ laghachi n’obodo ya. Ndị na-eso ụzọ ya soro ya. N’ụbọchị Sabat, O malitere ikuzi ihe n’ụlọ nzukọ ndị Juu. Ogbagwoju juru ndị niile nụrụ nkuzi ya anya, nke mere na ha malitere na-ajụ sị, "Kedu ebe nwoke a si nweta ike ndị a niile? Oleé ụdị amamihe e nyere ya? Lekwa ọrụ dị ịtụnanya nke o rụrụ. Ọ bụ na ọ bụghị onye ọkpụntụ ahụ, nwa Maria nwanne Jemes, Joses, Jud na Sajmon? Ọ bụ na ọ bụghị ụmụnne ya ndị nwanyị ka anyị nọ n’ebe a?" Ha wee ju inabata ya. Jisus zaghachiri ha sị, "Onye amụma nwere nsọpụrụ ebe ọbụla beluso n’obodo ya, n’etiti ụmụnna ya na n’ezinụlọ ya." Nke a mere o nweghị ike rụpụta ọrụ ebube ọbụla n’ebe ahụ, ma e wezuga na o bikwasara ndị ọrịa ole na ole aka, ahụ wee dịkwa ha mma. Ekweghi-ekwe ha gbajuchuru ya anya. Mgbe ahụ, Jisus gagharịrị n’obodo nta niile dị n’ebe ahụ na-akụzi nkuzi.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu