Tuzde Izu nke anọ n’oge na-adaghị n’emume John de Britto - Green

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Heb 12:1-4
-
Abụọma na azịza ya
Ps 22:26b-27. 28 and 30. 31-32
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaMk 5: 21-43
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ : Heb 12:1-4
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Hibru
Ya bụ, anyị nwere oke igwe ndị akaebe dị otu a ndị gbara anyị gburugburu. N’ihi nke a, ka anyị wepụ ihe ọ bụla nke na-adọghachi anyị azụ dịka ibu aro ya na njo niile nọdebere anyị nso karịa. Ka anyị werekwa ntachi obi gbaa ọsọ nke chere anyị n’ihu. Ka anyị na-elegide Jisus, onye mbu na onye na-eme ka okwukwe anyị zụọ oke anya, onye jiri n’ihi anuri edobere n’ihu ya, dị ahuhu na ihe ihere nke obe bịa n’ọdụ n’aka nri nke ocheeze nke Chineke. Tuleenu n’obi unu gbasara onye ahụ dịrị nkwụgide n’obe ọjọọ nke ndị njo kwụgidere ya, ka ike ghara igwu unu ma ọ bụ obi unu idaa mba. Ọgụ unu na-alụ megide njo erubeghị nke jụọfụ ọbara unu.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA : Ps 22:26b-27. 28 and 30. 31-32
Azịza : Ndị na-achọ Dinwenu ga-eto ya.
1. Aga m emejuputa nkwa m kwere gị
n’ihu ndị niile na-atụ gị egwu.
Ndị ogbenye ga-eriju afọ,
Ndị niile na-achọ Onyenweanyi ga-eto ya,
ka ha nwee ogologo ndụ.
Azịza : Ndị na-achọ Dinwenu ga-eto ya.
2. Ụwa niile ga-echeta ihe ndị a,
wee laghachiakwute Onyenweanyi.
Ezinụlọ niile dị n’ụwa ga-akpọrọ ya isi ala.
Ndị niile na-enwe oganihu n’ụwa Ga-akpọrọ ya isi ala.
Otu aka ahụ, ndị niile nwụrụ anwụ.
Azịza : Ndị na-achọ Dinwenu ga-eto ya.
3. Mkpụrụobi m ga-adi ndụ maka Onyenweanyi,
ụmụ m niile ga-efe ya;
Ndị mmadu ga-ekwupụta Onyenweanyi n’agbịm niile.
Ma ndị nke ga-abịa n’ihu;
ha ga-ekwupụta ịdị mma ya n’etiti ụmụ ndị a mụrụbeghị.
Ndị a niile bụ ihe Onyenweanyi mere.
Azịza : Ndị na-achọ Dinwenu ga-eto ya.
Mbeku:
Alleluia, Alleluia:
Meghee anya m,
ka m wee hụ ihe itunanya dị n’iwu gị.
Alleluia
OZIỌMA : Mk 5: 21-43
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere
Mgbe Jesu jiri ụgbọ gafee n’akụkụ nke ọzọ, oke igwe mmadụ zukọrọ n'ebe ọ nọ, ya onwe ya nọ n’akụkụ osimiri. Mgbe ahụ, otu n'ime ndị isi ulo nzuko ndị Juu, aha ya bụ Jairus bịara. Ozigbo o hụrụ Jisus, o dara n’ukwu ya, riosie ya ike sị, "Nwa m nwaanyị nta nọ n'ọnụ ọnwụ; biko bia bikwasa ya aka, ka ahụ dị ya mma ọzọ, ka o dịkwa ndụ." Jesu soro ya; ma oke igwe mmadụ ahụ soro ya na gbakọọ ya gburugburu. E nwere otu nwaanyị nke nọ n’orja oruru ọbara afọ iri na abụọ. Nwaanyị a ataala ahuhu n’aka ọtụtụ dibịa mefuchaa ihe niile o nwere; kama ahụ ga-adi ya mma, ya nọkarịa njọ. Ọ nụla akụkọ banyere Jesu, wee zobe n’igwe mmadụ ahụ, si n’azụ metụ uwe Jesu aka, n’ihi na o kwuru n’obi ya sị, "Ọ bụrụ na m metụ o buladi ọnụ uwe ya aka, ahụ ga-adi m mma." Ozigbo ahụ oruru ọbara ya kwụsịrị; o metụ ya n’ime ahụ na a gwọla ya site n’ajọ orja ahụ. Ma mgbe Jesu matara na ike esila ya n’ahụ pụọ, o jụrụ sị, "Onye metụrụ uwe m aka?" Ma ndị na-eso ụzọ ya jughachịrị ya sị, "Gịnị mere ị ji ajụ ajụjụ dị otu a sị, 'Onye metụrụ m aka ebe ị hụrụ na igwe mmadụ ha otu a na-akpagide gị?" Jesu legharịrị anya ka o hụ onye mere ihe ahụ. Ma nwaanyị ahụ ebe ọ matara ihe e mere n’ahụ ya, o tụrụ egwu marakwa jijiji bịa daa n’ihu Jesu, gwa ya eziokwu nile. Ma Jesu sịrị ya, "Ada, okwukwe gị azọla gị; laa n’udo, si n’ajọ ọrịa gị nwee ahụ ike." Mgbe ọ ka kpụ okwu ahụ n’onu, ụfọdụ mmadụ sịrị n’ulo Jairus onye isi ulo nzuko bịara, zie ya sị, "Nwa gị nwaanyị anwụrụla. Oleekwa ihe ị ji enye onye nkụzi a nsogbu?" Mana Jesu egeghị ntị n’ozi ha ziri, kama o sịrị onye isi ulo nzuko ahụ, "Atụla egwu, kama kwere." O kweghị ka onye ọ bụla soro ya gaa, ọ bụrụ Pita, Jemes na nwanne ya bụ Jon. Mgbe ha bịarutere n’ulo onye isi ulo nzuko ahụ, ọ nụrụ ụzarị hụkwa ọtụtụ ndị mmadụ ka ha nọ na-ebe akwa na-eti kwa mkpụ. Mgbe ọ batara, o jụrụ ndị mmadụ sị, "Gịnị mere unu ji eti mkpụ na-ebekwa akwa? Nwatakịrị a anwughị anwụrụ, kama ọ na-arahụ ụra." Ha chịrị ya ọchị. O chụpụrụ ha niile, kpọrọ nna nwantakịrị ahụ na nne ya, na ndị na-eso ụzọ ya banye n’ebe nwantakịrị ahụ nọ. O jidere nwantakịrị ahụ n’aka sị, "Talita Kumi," nke pụtara "Nwa agbọghọ nta, asị m gị bilie." Ozigbo nwa agbọghọ nta ahụ bilitere, gbagharia; n’ihi na o gbara afọ iri na abụọ. Ozigbo ahụ, ihe a mere bụuru ha nnukwu ihe itunanya. Ma Jesu nyere ha iwu ike ka ha ghara ime ka onye ọ bula mara nke a bịa gwa kwa ha ka ha nye nwa agbọghọ nta ahụ ihe oriri.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu