NKUBATA DINWENU JESU KRISTI N'ULO NSO Psalter Week 4 White

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Mal 3:1-4
-
Abụọma na azịza ya
Ps 24: 7. 8. 9. 10
-
Ihe ọgụgụ nke abụọ
Heb 2: 14-18
- OziọmaLk 2: 22-40
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ : Mal 3:1-4
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Malakai
Lee, ana m ezipu onyeozi m ka o kwadoro m ụzọ. Ma Yahweh, onye nke unu na-atụ anya ya, ga-abata n'ụlọ nso ya n'ọnwụde; lee, onyeozi nke ogbugbandu ahụ unu na-enwe mmasị na ya na-abịa. Ọ bụ Yahweh nke igwe ndọjaga na-ekwu. Ma onye ga-ebi ubochi obịa ya, onye ga-eguzo kwa ma ọ pụta? N'ihi na ọ ga-adị ka ọkụ ihe nchụcha na ncha eji asụ akwa; ọ ga-anọdu ala dịka onye nchụcha na nsacha nke ọlaọcha, ọ ga-asa kwa ụmụ Levai ma nucha ha dịka ọlaedo na ọlaọcha ruo mgbe ha ga-ewetara Yahweh ihe onyinye kwesịrị ekwesi. Mgbe ahụ, onyinye nke Juda na Jerusalem ga-amasi Yahweh dịka o dị na mgbe ochie n'afọ ndị ahụ gara aga.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA : Ps 24: 7. 8. 9. 10
Azịza : Onye bụ eze nke otito a? Ọ bụ Onyenweanyi.
Welitenu isi unu elu, ọnụ ụzọ ama,
Kụlienu ọnụ ụzọ okpu ka eze otito bata!
Azịza : Onye bụ eze nke otito a? Ọ bụ Onyenweanyi.
Onye bụ eze otito a?
Ọ bụ Onyenweanyi, Dimgba na dike,
Onye bụ dike n'agha.
Azịza : Onye bụ eze nke otito a? Ọ bụ Onyenweanyi.
Welitenu isi unu elu, ọnụ ụzọ ama,
Kụlienu ọnụ ụzọ okpu
Ka eze nke otito bata!
Azịza : Onye bụ eze nke otito a? Ọ bụ Onyenweanyi.
Onye bụ eze nke otito a?
Ọ bụ Chineke nke igwe ndọjaga;
Ọ bụ ya bụ eze nke otito!
Azịza : Onye bụ eze nke otito a? Ọ bụ Onyenweanyi.
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ : Heb 2: 14-18
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Hibru
Ebe ọ bụ na ụmụ ahụ ketere oke n'ụdị inwe anụ na ọbara, ya onwe ya ketekwa oke n'otu ụdị ahụ ahụ, ka ọ wee site n'onwụ mebie ekwensu bụ onye ahụ ji ike nke onwụ. Otu a ka ọ siri mee ka ndị ahụ niile nwere onwe ha, bụ ndị ujo onwụ mere ka ha bụrụ ndị e kéré agbụ na ndụ ha niile. N'eziokwu, ndị dị ya mkpa abụghị ndị mmụọ-ọma, kama ọ bụ agbụrụ Abraham. Nke a mere o ji dị mkpa na ọ ga-eyi ụmụnna ya n'ihe niile ka o wee bụrụ onyeisi nchụaja nwere obi ebere na nke kwesịrị ntukwasiobi n'ije ozi nke Chineke, ka ọ wee medara Chineke obi maka ajọ omume ndị mmadụ. N'ihi na ya onwe ya ataala ahụhụ ma nwee kwa onwe ya onwunwa. Nke a mere ka o nwee ike inyere ndị nọ n'onwunwa aka.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
Mbeku:
Alleluia, Alleluia:
Ọ bụ ihe nke ga-ekpughe ụzọ nye ndị mba ọzọ,
na otito nke ndị gị bụ Izrel.
Alleluia
OZIỌMA :Lk 2: 22-40
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Mgbe oge bịara maka emume nke idiocha dịka iwu Mosis siri dị, Josef na Maria kụrụ Jesu na Jerusalem n'ihu nke Dinwenu. Dịka e dere n'iwu nke Yahweh si, "Nwa mbu ọ bụla nke bụ nwoke ga-abụ ihe dị nsọ n'ihu Yahweh." Ha bịara ịchụ aja dịka e nyere n'iwu nke Dinwenu, "Ndụrụ abụọ ma ọ bụ ụmụ kparakwụkwọ abụọ." N'oge a, e nwere otu nwoke bi na Jerusalem, aha ya bụ Simeon, ọ bụ onye ezi omume bụkwa onye na-atụ egwu Chineke. Ọ nọ na-elekwa anya maka nkasiobi nke Izrel, Mmụọ Nsọ nọnyerekwara ya. Mmụọ Nsọ emeelarị ka ọ mata na ọ gaghị ahụ ọnwụ tupu ọ hụ Kristi nke Onyenweanyi. Site n'odụdụ nke Mmụọ Nsọ, nwoke a batara n'ụlọ nso ma mgbe nne na nna Jesu kụbatara ya n'ụlọ nso ka e mere ya dịka omenaala nke iwu siri dị. Simeon kụrụ ya n'aka ya abụọ, keleekwa Chineke sị: "Ugbu a, Onyenwe m, ka ohu gị laa n'udo, dịka nkwa gị siri dị. N'ihi na anya m ahụla nzọpụta gị, nke ị kwadobere n'ihu mmadụ niile. Ọ bụ ìhè nke ga-ekpughe ụzọ nye ndị mba ọzọ, na otito nke ndị gị bụ Izrel." Ihe niile Simeon kwuru gbasara nwatakịrị ahụ bụ Jesu tụrụ nne na nna ya n'anya. Simeon wee gọzie ha, gwa Maria nne Jesu sị: "Lee, edobere nwatakịrị a maka ọdịda na mbilite ọtụtụ mmadụ n'Izrel, na maka ihe ọmụmụ a ga-ekwutọ ekwutọ, (ma mma agha ga-amakwa gị obi) ka e were kpughee ihe dị ọtụtụ mmadụ n'obi." Ọ dịghịkwa otu onye amụma nwanyị aha ya bụ Ana, nwa Fanuel, onye si n'agbụrụ Asha, ọ meeela ezi agadi, onye ya na di ya biri naanị afọ asaa site n'agboghọ ya tupu di ya anwụo. Ọ nọrọ onwe ya nwanyị isimkpe ruo iri afọ asatọ na anọ. Ọ pụghị n'ụlọ nso Chineke, ebe ọ ji ibu ọnụ na ekpere na-eje ozi Chineke, abalị na ehihie. Ọ pụtara n'oge ahụ, keleekwa Chineke, kwuputakwa maka onye ahụ n'ihu ndị niile na-atụ anya maka nzọpụta nke Jerusalem. Mgbe ha mezuru ihe niile dịka iwu nke Dinwenu siri dị, ha laghachiri na Galili, ruo obodo nke ha bụ Nazaret. Nwata ahụ toro, siekwa ike, juputa n'amamihe, grasia nke Chineke nọnyerekwa ya.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu