Fraide Izu nke Ato n'Oge Na-adanyeghị n'Emume John Bosco - White.

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Heb 10: 32-39
-
Abụọma na azịza ya
Abụ Ọma 37: 3-4, 5-6, 23-24, 39-40
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaMak 4: 26-34
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ : Heb 10: 32-39
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Pọl dị asọ degaara ndị Galeshịa
Chetakwanu na n'ụbọchị ndị gara aga, mgbe a kuzichara unu, unu dịrị oke mkpagbu na ahúhụ. Mgbe ụfọdụ unu anata mkpàrị na mkpagbu n'ihu ọha, mgbe ụfọdụkwa, unu esoro n'otu ndị e mere otu ihe ahụ. Unu nwere obi ebere n'ebe ndị mkpọrọ nọ. Mgbe ha pụọnaara unu ihe unu nwere, unu ji obi anụrụ natakwa ya, n'ihi na unu maara na unu onwe unu nwere ọgaranya ka mma, nke na-anọgide n’ime unu. Ya bụ, unu atufụkwala ntukwasiobi unu nwere nke nwere nnukwu ụgwọ. N'ihi na unu chọrọ ndidi ka unu wee mee uche Chineke ma natakwa ihe e kwere na nkwa. Akwụkwọ Nsọ kwuru, sị, "Nwantinti oge, onye ahụ ga-abịa, ọ ga-abịa mgbe na-adịghị anya. Ma onye ezi omume m ga-ebi site n'okwukwe. Ọ bụrụ na ọ laghachi azụ, ihe ya agaghị amasị m." Kama anyị esoghị ndị na-alaghachi azụ ma laa n'iyi. Anyị bụ ndị nwere okwukwe ma na-echekwa mkpụrụ obi ha.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA : Abụ Ọma 37: 3-4, 5-6, 23-24, 39-40
Azịza: Nzọpụta ndị ezi omume na-esite n'aka Onyenweanyi abịa.
1. Tukwasi obi gị n'Onyenweanyi,
mee ka o kwusie ike na-enwe ọganiihu.
Ọ nwere ike ịda, mana ọ gaghị emerụ ahụ,
n'ihi na Onyenweanyi na-echekwaba ya.
Azịza: Nzọpụta ndị ezi omume na-esite n'aka Onyenweanyi abịa.
2. Nzọpụta ndị ezi omume na-esite n'aka Onyenweanyi abịa,
Ọ na-echekwaba ha n'oge nsogbu;
Onyenweanyi na-enyere ha aka, na-azọpụta ha.
Azịza: Nzọpụta ndị ezi omume na-esite n'aka Onyenweanyi abịa.
3. Nwee afọju n'Onyenweanyi, ka ọ wee nye gị ihe obi na-achọ.
Were ndụ gị nye Onyenweanyi n'aka, tukwasi obi na ya, ka ọ nyere gị aka.
Azịza: Nzọpụta ndị ezi omume na-esite n'aka Onyenweanyi abịa.
4. Ọ ga-eme ka eziomume gị na-amụ dịka ihe na-enwu,
mee ka eziokwu gị na-acha dịka ehihie.
Azịza: Nzọpụta ndị ezi omume na-esite n'aka Onyenweanyi abịa.
5. Onyenweanyi na-eduzi onye ezi omume ụzọ,
O na-azọpụta ha n'ihi na ọ bụ onye nchedo ha.
Azịza: Nzọpụta ndị ezi omume na-esite n'aka Onyenweanyi abịa.
Mbekụ:
Alleluia, Alleluia:
N'ihe ọ bụla unu na-eme, ma okwu,
ma omume, mee ha niile n'aha nke Dinwenu Jesu.
Na-enye Chukwu Nna ekele site n'ahụ ya.
Alleluia
OZIỌMA : Mak 4: 26-34
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Jisus gwara ọha mmadụ ahụ gbara ya gburugburu, sị, "Alaeze Chineke dị ka mkpụrụ nke mmadụ ghara n'ubi, wee rahụ ụra, tetekwa, abalị na ehihie, mkpụrụ ahụ na-epụta, na-eto, ma ọ maghị otú o siri mee. Ala n'onwe ya na-eme ka mkpụrụ aka nke mbụ pụta, e mechaa, ọ na-enwe ogbe, mkpụrụ akpụchapụ n'ogbe ya. Mgbe mkpụrụ ahụ kachara, onye nwe ubi na-ebido owuwe ihe ubi n'ihi na oge owuwe ihe ubi eruola." Jisus jukwara, sị, "Kedu ihe anyị ga-eji atụnyere Alaeze Chineke? Olee ụdị atụnyere anyị ga-eji kọwaa ya? Ọ dị ka mkpụrụ osisi a na-akpọ mostad, nke dị ntakịrị karịa mkpụrụ osisi niile, mgbe a kuru ya n'ala. Ma mgbe a kuchara ya, ọ na-eto karịa mkpụrụ osisi niile a na-azụ n'ubi. Ọ na-awapụ alaka buru ibu, nke mere ụmụ nnụnụ ji enwe ike ịnọrọ na ya." Jisus jikwa ọtụtụ atụnyere gwa ndị mmadụ okwu Chineke, dịka ha nwere ike ịghọta. O kwughị ha okwu ọ bụla n'enweghị atụnyere. Ma mgbe ọ bụ naanị ya na ndị na-eso ụzọ ya, o na-akọwa ha ihe niile.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu