Toozde Izu nke Ato n'Oge Na-adanyeghị n'Emume - Aidan/Bathildis - Green

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Heb 10: 19-25
-
Abụọma na azịza ya
Abụ Ọma 24: 1-2, 3-4ab, 5-6
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaMak 4: 21-25
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ : Heb 10: 19-25
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Pọl dị asọ degaara ndị Galeshịa
Umunna m, anyị nwere ntukwasiobi ibanye n'ebe ịchụàjà site n'obara Jisus, na site n'ụzọ ọhụrụ dị ndụ, nke ọ megheere anyị site n'ákwà mkpuchi, ya bụ, site n'ahụ ya. Ebe anyị nwere nnukwu ụkọchukwu nke na-elekọta ụlọ Chineke, ngwanu ka anyị were otu obi, okwukwe siri ike, na obi anyị nke a sachapụrụla site n'ajọ àkọnuche, bịa Chineke nso. Ka anyị werekwa ahụ anyị nke e jiri mmiri sachaa bịa nso. Ka anyị jidesie olileanya ahụ nke anyị na-ekwupụta n'enweghị nkolopu n'ihi na onye ahụ kwere anyị nkwa kwesiri ntukwasiobi. Ka anyị chee onwe anyị otu anyị ga-esi na-akpalite ịhụnanya na ezi ọrụ n'ebe ibe anyị nọ. Ka anyị ghara ịhapụ ịna-ezukọta ọnụ otu ndị ọzọ si eme, kama, ka anyị na-agbarịtanụ ibe anyị ume, ọkachasị ugbu a ụbọchị ahụ na-erute nso.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA : Abụ Ọma 24: 1-2, 3-4ab, 5-6
Azịza: Onyenweanyi, ọ bụ ndị dị otu a na-achọ ihu gị.
1. Chineke nwe ụwa na ihe niile dị na ya;
ụwa na ndị niile bi n'ime ya;
ọ bụ ya wukwasara ya n'elu mmiri,
ọ bụ ya wuru ya n'elu osimiri.
Azịza: Onyenweanyi, ọ bụ ndị dị otu a na-achọ ihu gị.
2. Onye nwere ike ịrịgoro n'ugwu nke Onyenweanyi?
Onye nwere ike ịnọ n'ebe ya dị nsọ?
Onye aka ya na obi ya dị ọcha.
Onye na-agaghị etinye obi ya n'ihe efu,
onye na-agaghị anụ iyi asị.
Azịza: Onyenweanyi, ọ bụ ndị dị otu a na-achọ ihu gị.
3. Onye dị otu a ga-anata ngozi n'aka Onyenweanyi,
ọ ga-anatakwa eziomume n'aka Chineke onye nzọpụta ya.
Azịza: Onyenweanyi, ọ bụ ndị dị otu a na-achọ ihu gị.
4. Ọ bụ ụdị ndị dị otu a na-achọ Onyenweanyi,
ndị na-achọ ihu Chineke nke Jekob.
Azịza: Onyenweanyi, ọ bụ ndị dị otu a na-achọ ihu gị.
Mbekụ:
Alleluia, Alleluia:
Okwu gị bụ mpanaka na-edu m, burukwa ihe n'ụzọ m.
Alleluia
OZIỌMA : Mak 4: 21-25
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Jisus jụrụ ha, sị: "A na-ebute mpanaka ka e jiri efere kpuchie ya ma ọ bụ ka a doba ya n'okpuru akwa a na-edina? Ọ bụ ihe a na-eme abụghị idokwasi ya n'elu ihe ndokwasi ọkụ? Ọ dịghị ihe e zoro ezo nke na-agaghị apụta ìhè; ọ dịghịkwa ihe e kpuchiri ekpuchi nke a na-agaghị ekpughe. Onye nwere ntị ịnụ ihe, ya nụ." O sikwara ha, "Kpacharanu anya n'ihe unu na-anụ; n'ihi na otu unu si mesoo ndị ọzọ ka a ga-esi mesoo unu, ma mesoo unu karịa. Onye ọ bụla nwere ihe, a ga-agbakwunyere ozo; ma onye na-enweghi ihe ọ nwere, ọbụladị ihe ọ nwere, a ga-anapụ ya ha."
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu