Izu nke Ato n'Oge Na-adanyeghị n'Emume Apollinaris Claudius - Green

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Heb 10: 11-18
-
Abụọma na azịza ya
Abụ Ọma 110: 1, 2, 3, 4
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaMak 4:1-20
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ :
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Pọl dị asọ degaara ndị Galeshịa
Ukochukwu ọ bụla na-anọ n'ọrụ ya ụbọchị niile na-achụ otu àjà ahụ ugboro ugboro, àjà nke na-enweghi ike isachapụ ajọ omume. Ma mgbe Kraịst chụchara otu àjà maka ajọ omume, ọ nọdụ n'aka nri nke Chineke. Ebe ahụ ka ọ ga-anọ ruo mgbe a ga-eme ndị iro ya ihe mgbakwasụkwụ ya. Site n'àjà ahụ ọ chụrụ nanị otu ugboro, o mere ka ndị niile o doro nso zuo oke mgbe niile. Mmụọ Nsọ na-agbakwụtakwa anyị akaebe, ka ọ kwuchara sị, "Nke a bụ ogbugbandu nke mụ na ha ga-eme, ka ụbọchị ahụ gachara, Onyenweanyi kwuru, sị, 'Aga m etinye iwu m n'obi ha, dekwaa ya n'uche ha.'" O kwukwara, sị, "Agaghị m echetakwa ajọ omume ha na ajọ omume ha ọzọ." Mgbe a gbagharachara ihe ndị a, a gaghịkwa enwe àjà mgbaghara ajọ omume ọzọ.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA : Abụ Ọma 110: 1, 2, 3, 4
Azịza: Ị bụ ụkọchukwu ebighị ebi n'usoro nke Melkizedek.
1. Onyenweanyi gwara nnam ukwu, sị,
"Nọdụ ala n'aka nri m,
aga m eme ndị iro gị ihe mgbakwasụkwụ gị."
Azịza: Ị bụ ụkọchukwu ebighị ebi n'usoro nke Melkizedek.
2. Onyenweanyi ga-amanye ndị iro gị niile,
ka ha nọrọ n'okpuru ọchịchị gị na Sion.
Azịza: Ị bụ ụkọchukwu ebighị ebi n'usoro nke Melkizedek.
3. Ugwu eze bụ nke gị bido n'ụbọchị a mụrụ gị n'elu ugwu dị nsọ;
ị bụ eze site n'afọ, bido n'isi ụtụtụ nke ndụ gị.
Azịza: Ị bụ ụkọchukwu ebighị ebi n'usoro nke Melkizedek.
4. Onyenweanyi anụla iyi na ị gaghị alazighị azu na ya:
Ị bụ ụkọchukwu ebighị ebi n'usoro nke Melkizedek.
Azịza: Ị bụ ụkọchukwu ebighị ebi n'usoro nke Melkizedek.
Mbekụ:
Alleluia, Alleluia:
Kwuwe, Onyenweanyi, nwodibo gị na-ege nti.
Ọ bụ gị nwere okwu nke ndụ ebighị ebi.
Alleluia
OZIỌMA : Mak 4:1-20
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Jisọs malitekwara ọzọ ịkụzi ihe n'akụkụ osimiri Galili. Oke igwe mmadụ gbara ya gburugburu, nke mere na ọ banyere n'ụgbọ mmiri, wee nọdụ ala n'ime ya, n'elu mmiri. Igwe mmadụ niile ahụ guzoro n'ala n'akụkụ mmiri. Ọ jiri ụkabụlụ dị iche iche kuziere ha ọtụtụ ihe. Na nkụzi ya, ọ sịrị ha, "Gee nu ntị! Onye ogha mkpụrụ gara n'ubi igha mkpụrụ; ka ọ na-aghachị mkpụrụ, ụfọdụ dara n'akụkụ ụzọ, ụmụ nnụnụ bịa tụtụchaa ha. Mkpụrụ ụfọdụ dara n'ala okwute ebe ha na-enweghị aja buru ibu. Ngwangwa mkpụrụ ahụ pulitere, n'ihi na ha enweghi aja mmiri. Ma mgbe anyanwụ wara, ha chanwụọrọ ma kpụkọwara n'ihi na ha enweghi mgbọrọgwụ mmiri. Mkpụrụ ụfọdụ dara n'etiti ogwu, ogwu wee tolite, kpagbuo ha; ha amaghi mkpụrụ ọ bụla. Mkpụrụ ndị ọzọ dara n'ala ọma, wee pọpụ, tụpụ, mikwaa mkpụrụ: ụfọdụ mitara iri atọ, ụfọdụ iri isii, ụfọdụ otu narị." Na mmechi, o siri ha, "Onye nwere ntị ịnụ ihe, ya nụrụ." Ma mgbe nanị Jisọs nọ, ndị na-eso ụzọ ya na ụfọdụ ndị gbara ya gburugburu rịọrọ ya ka o kọbara ha ihe gbasara ụkabụlụ ya. O siri ha, "Unu ka e nyere ike ịghọta na ikwuwa ihe banyere ihe omimi nke alaeze Chineke; mana ebe ndị ọzọ nọ, ihe niile bụ n'ụkabụlụ, ka ha wee hụghara ịghọta, ka ha wee nụghara ịghọta, ka ha ghara ịtụgharị obi ma nwee mgbaghara." Jisọs jụrụ ha ọzọ, sị, "Ọ bụ na unu aghọtaghị ụkabụlụ a? Olee otu unu ga-esi aghọta ụkabụlụ ndị ọzọ?" Onye ogha mkpụrụ na-aghachị okwu ahụ. Mkpụrụ ndị dara n'akụkụ ụzọ pụtara ndị a gwara okwu ahụ, mgbe ha nụrụ ya, ngwangwa Ekwensu bịara wepụ okwu nke a kụrụ n'obi ha. Otu aka ahụkwa, mkpụrụ ndị dara n'ala okwute bụ ndị ji ọnụ na-anara okwu Chineke mgbe ha nụrụ ya. Ma ebe okwu ahụ agbaghị mgbọrọgwụ n'obi ha, ọ nọ ntakịrị oge. Mgbe mkpagbu ma ọ bụ nsogbu bịara n'ihi okwu ahụ, ha na-esi n'okwukwe ha ada. Mkpụrụ ndị dara n'etiti ogwu bụ ndị nụrụ okwu Chineke, mana nchegbu na nchekasị nke ụwa a na oke ọchịchọ nke ihe ndị ọzọ abanye ha n'obi kpagbuo okwu ahụ, mee ka o ghara imi mkpụrụ. Ma ndị a dara n'ala ọma bụ ndị nụrụ okwu ahụ, nabatakwara ya ma mịa mkpụrụ: ụfọdụ iri atọ, ụfọdụ iri isii, ụfọdụ otu narị.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu