Tuzde Izu Nke Ato N'oge Na-adanyeghị N'emume Thomas Aquinas Memorial - White

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Hib 10: 1-10
-
Abụọma na azịza ya
Abụ Ọma 40: 2, 4ab, 7-8a, 10, 11
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaMak 3: 31-35
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ: Hib 10: 1-10 Tuzde
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Hibru
Otu o si dị na iwu nwere nanị onyonyo nke ezi ihe ndị ahụ ga-abịa, nke na-abụghị ezi ihe ndị ahụ n'onwe ha, ọ nweghị ike isi n'otu ụdị àjà ahụ nke a na-azụ mgbe niile site n'afọ ruo n'afọ, mee ka ndị niile na-abịarute ya nso zuo oke. Ma ọ bụghị otu a, ọ bụ na a gabegbiela akwụsị ịchụ àjà ndị ahụ? Ọ bụrụ na a wuchapụrụla ajọ omume ndị na-efe ofufe na mbụ, uche ha agaghị adịkwa na ajọ omume ọzọ. Àjà ndị a na-echeta ndị mmadụ ajọ omume ha kwa afọ. Ọ bụ ihe agaghị ekwe omume na ọbara anụ ọhịa dị ka ehi na ewu ga-asachapụ ajọ omume. N'ihi nke a, mgbe Kristi bịara n'ụwa o kwuru, sị, "Ọ bụghị àjà na onyinye ka ị chọrọ, kama ọ bụ ahụ ka ị kwadobere m. Àjà nsure ọkụ na àjà mgbaghara ajọ omume anaghị enye gị obi ụtọ." Mgbe ahụ ka m kwuru, sị, "Lee, abịara m ime uche gị, o Chineke, dịka e dere banyere m n'akwụkwọ nsọ." O kwuru na mbụ, sị, "Àjà onyinye, àjà nsure ọkụ, na àjà mgbaghara ajọ omume adịghị amasị gị (nke ha na-enye dịka iwu si dị)." O kwukwara, sị, "Lee, abịara m ime uche gị." Chineke emeela ka àjà mbụ kwụsị iji malite nke abụọ. Site n'ime uche Chineke a, e mere ka anyị dị ọcha site n'àjà ahụ Jisọs ji onwe ya tụchie nanị otu ugboro.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA : Abụ Ọma 40: 2, 4ab, 7-8a, 10, 11
Azịza: A nọ m ebe a, Dinwenu; abịara m ime uche gị.
Echere m, echere m Onyenweanyi,
ọ we hulata gee m nti,
nụrụ akwa enyemaka m na-ebe.
O tinyere abụ ọhụrụ n'ọnụ m,
otito nke Chineke anyị.
Azịza: A nọ m ebe a, Dinwenu; abịara m ime uche gị.
Ị naghị achọ ịchụ àjà ma ọ bụ ihe nsure ọkụ,
kama gịnị, ị mepere ntị m!
Ị naghị achọ àjà nsure ọkụ ma ọ bụ àjà maka ajọ omume,
kama m kwuru, sị, "A nọ m ebe a, ana m abịa."
Azịza: A nọ m ebe a, Dinwenu; abịara m ime uche gị.
Ekwupụtala m ezi omume nke Onyenweanyi na nnukwu ọgbakọ.
Lee, emechighị m ọnụ m,
ị nụrụ nke a, o Onyenweanyi.
Enweghị mgbe m jụrụ ikwupụta ezi omume gị,
kama ekwupụtala m nkwụdo na nzọpụta gị,
ahapụbeghị m ikwupụta ịhụnanya na nkwụdo gị
n'ihụ nnukwu ọgbakọ.
Azịza: A nọ m ebe a, Dinwenu; abịara m ime uche gị.
Mbekụ:
Alleluia, Alleluia:
Ekwela ka m soro ụzọ ndị na-adịghị eguzozi,
ma nye m amara nke iwu gị.
Alleluia
OZIỌMA : Mak 3: 31-35
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere
Nne Jisọs na ụmụnna ya bịara guzoro n'ezi, ziga ozi ka a kpọọ ya. Igwe mmadụ gbakwara ya gburugburu. Ụfọdụ n'ime ha gwara ya, sị, "Nne gị na ụmụnna gị nọ n'ezi na-achọ gị." Ma ọ zara ha, sị, "Onye bụ nne m na ụmụnna m?" O lechara ndị gbara ya gburugburu anya wee sị, "Ndị a bụ nne m na ụmụnna m! Onye ọ bụla na-eme uche Chineke bụ nwanne m nwoke, nwanne m nwaanyị, na nne m."
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu