UKA NKE ATO NA-ADANYEGHI N'EMUME Psalter Week 3 Green

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Neh 8: 2-4a. 5-6. 8-10
-
Abụọma na azịza ya
Ps 19: 8. 9. 10. 15
-
Ihe ọgụgụ nke abụọ
Cor 12: 12-30
- OziọmaLk 1:1-4; 4:14-21
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ : Neh 8: 2-4a. 5-6. 8-10
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Nehemaya
Ezra onye ukwu bụchara akwukwo iwu n'ihu ogbako ahụ nwere ndị nwoke, ndị nwanyị na ndị niile nwere ike ighota ihe a na-agụ, n'ụbọchị mbu nke ọnwa asaa. Ọ chere ogige ahụ dị n'ihu ọnụ ụlọ Mmiri ihu wee gụọ akwukwo iwu ahụ bido n'isi ụtụtụ ruo n'etiti ehihie n'ihu mmadụ niile. Onye ọ bula n'ime ha gere nti nke ọma n'ihe a na-agụpụta n'akwukwo nke iwu a. Ebe Ezra no gụpụtara okwu ndị a bụ na nkwago osisi a ruru maka ya. Ezra kwụrụ n'ihu ndị mmadụ ahụ niile, meghee akwukwo ahụ, mgbe o meghere ya, mmadụ niile kwụrụ oto. Ezra goziri Yahweh Chineke kacha elu, ndị mmadụ niile no ebe ahụ chịrị aka ha abụọ elu zaa si, "Amen, Amen." Ha kporo isi ala fee Chineke. Ha gụrụ ihe e dere n'akwukwo iwu nke Chineke, kowaakwa ya nke ọma nke na ndị mmadụ ghotachara ya. Nehemaya, onyeisi ọchịchị obodo, Ezra onye ukwu na onye odeakwukwo ha na ndị Levaj kọziri ndị mmadụ kwuo si, "Ụbọchị taa dị nso nye Yahweh Chukwu unu, ya bụ unu erula uju, unu ebela akwa," n'ihi na ndị mmadụ bere akwa mgbe ha nụrụ okwu niile nke iwu a. Ọ gwakwara ndị mmadụ si, "Laanu, gaa rie anụ mara abuba, nwee mmanya dị ụtọ, ma were ụfọdụ nye ndị enweghị ihe ha ha. Ụbọchị taa dị nso nye Chineke anyị. Unu erula uju n'ihi na anuri nke Chineke bụ ike unu."
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA :Ps 19: 8. 9. 10. 15
Azịza: Onyenweanyi, okwu Gi bụ mmụọ; ha bụkwa ndu.
1. Iwu nke Onyenweanyi zuru oke, ha na akpalite obi elu.
Ọchịchị nke Onyenweanyi kwesiri ntukwasi obi,
ha na-enye ndi umeeala amamihe.
Azịza: Onyenweanyi, okwu Gi bụ mmụọ; ha bụkwa ndu.
2. Iwu nke Onyenweanyi ziri ezi, ha na-enye obi anuri.
Iwu nke Onyenweanyi doro anya, ha na-enye anyị ihe.
Azịza: Onyenweanyi, okwu Gi bụ mmụọ; ha bụkwa ndu.
3. Itu egwu nke Onyenweanyi dị aso.
Ọ na-akwudosi ikwu ruo mgbe ebighị ebi.
Iwu nke Onyenweanyi bụ eziokwu, ha niile ziri ezi.
Azịza: Onyenweanyi, okwu Gi bụ mmụọ; ha bụkwa ndu.
4. Onyenweanyi, ka okwu gị, na echiche m,
Nwetara m amara n'ihu gị.
Gi bụ onye ogbugbo m. Na nkwume m.
Azịza: Onyenweanyi, okwu Gi bụ mmụọ; ha bụkwa ndu.
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ : Cor 12: 12-30
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Pọl dị asọ degaara ndị Korintias
N'ihina dị ka ahụ anyi si di otu, ma nwekwa otu ụtụ dị iche iche, ma akuku ahụ niile, ọ bụ ezie na ha dị otu, ha bụ otu. Otu a ka o dị n'ime Kristi. Site n'otu Mmuo Nsọ ahụ ka e mere anyị niile baptiizim n'otu ahụ Kristi, ma ndị Juu ma ndị Grik, ma ndị ohu ma ndị nwe onwe ha. E mere ka anyị niile nụ ọbara ya, n'ime njikọ nke otu Mmuo Nsọ ahụ. Otu o di, ọ bụ na ọ bụ na ihu ndị ahụ bụ otu ihe, kama ihe dị n'ahụ anyị dị otu.
O buru na ụkwụ ga-asị, "N'ihina abughi m aka, abughi m akuku ahụ," nke a agaghi eme ka o ghara ibu ihe dị n'ahụ. O buru na ntị ga-asị, "N'ihina abughi m anya, esoghi m n'ahụ," nke a agaghi eme ka o ghara ibu ihe dị n'ahụ.
O buru na ahụ dum bu anya, gini ka ahụ ga-eji anu ihe? O buru na ahụ dum bu ntị, olee ihe o ga-eji anu isi ihe? Ma otu ihe si di, Chineke dobere n'otu n'otu, akukụ niile dị n'ahụ, dị ka o si dị ya mma. A sị na akukụ niile dị n'ahụ bụ otu ihe, kedu ka ahụ ga-esi di? Otu o di, ọ bụ ezie na ihe dị n'ahụ dị ọtụtụ, ma ha niile bụ otu ahụ. Nke a mere anya apughị isi aka, "I dighi m mkpa!" Ozokwa isi apughị isi ukwu, "unu adighi m mkpa." Kama, ọ bụ ndị a na-eche na ha esighi ike obula dikwa nnukwu mkpa. Akuku ahụ anyị na-eche na ha ekwesighi nsopuru ka ibe ha, ka anyị na-asopuru karịchaa. Akuku ndị adighi mma igosi n'ihu ọha ka anyị na akpachapuru anya karịchaa, n'udi o na-adighi mkpa, ísi wee kpachapuru akuku anyị ndị mara mma igosi n'ihu ọha anya. Chineke jiri aka ya mezie akuku niile, ma mee ka akuku ndị a na-eleda anya nwee nsopuru karịchaa. O mere nke a ka nkewa ghara idi n'ahụ, kama ka akuku niile n'otu dịrị ibe ha mkpa. O buru na otu akuku nọ n'ahụ ahụ, ma o burukwa na otu akuku nọ n'otito, nọdọzo esorokwa ya n'urum. Ugbu a, unu bu ahụ Kristi, bụkwa n'otu n'otu ihe dị n'ahụ ya.
Chineke achoputala n'ime Nzuko ya, ndị oru dị iche iche: Nke mbu, ndị ozi, nke abuo ndị amuma, nke ato ndị nkuzi. Ndiozo so ha bụ ndị na-aru oru ebube, na ndị e nyere onyinye amara dị iche iche igwo ndị oria, na ndị nwere onyinye inyere ndị ọzọ aka n'ụzọ dị iche iche, na ndị nwere onyinye ọchịchị, na ndị nwere ike ịsụ asụsụ dị iche iche. Ha niile, ha bụ ndị ozi? Ha niile, ha bụ ndị amuma? Ha niile, ha bụ ndị nkuzi? Ha niile, ha bụ ndị oru ebube? Ha niile, ha nwere onyinye nke igwo oria? Ha niile, ha na-asa n'olu dị iche iche? Ha niile, ha nwere onyinye nke ikowa asụsụ dị iche iche?
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
Mbeku:
Alleluia, Alleluia:
E nyela m Mmuo nke Dinwenu,
maka na Dinwenu eteela m ude ka m bugara ndị ogbenye ozioma,
ka m kwusaara ndị kpuru isi na ha ahubala ụzọ,
ka m mee ka ndị a na-emegbu emegbu nwee onwe ha.
Alleluia
OZIỌMA : Lk 1:1-4; 4:14-21
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
O bu eziokwu na ọtụtụ agbali jala ịchikota akụkọ ihe niile e mezuru n'etiti anyị, dị ka e siri nyefee ha n'aka anyi site na ndị siri na mbido buru ndị akaebe na ndịozi nke okwu ahụ. Ebe o bu na m onwe m eleziela anya nke ọma, nyichaa akụkọ ndị a niile site na mbido, ọ masịrị m, idere gị akụkọ ahụ niile, Tiofilus dị óké ebube, n'usoro dị ka ha siri mee, ka ị nwee ike imata eziokwu banyere ihe niile e ziri gị na mbu. Jesu loghachiri na Galili n'ike nke Mmuo Nsọ, akụkọ ya wee gbasaa n'obodo niile gbara ebe ahụ gburugburu. O kuzikwara ihe n'otutu ulonzuko ndị Juu. Mmadu niile na-enye ya otito. Jesu bịa na Nazaret ebe Ọ nọ tọ; banye n'ulonzukp, n'ụbọchị izu ike dị ka o si eme. O wee bilie igu ihe; ha nyere ya akwukwo Aizaya onye amuma. O meghere akwukwo hụ ebe e dere si: "E nyela m Mmuo nke Dinwenu, maka na Dinwenu eteela m ude ka m bugara ndị ogbenye ozioma, ka m kwusaara ndị e ji eji na ha enwerela onwe ha, ka m kwusaara ndị kpuru isi na ha ahubala ụzọ, ka m mee ka ndị a na-emegbu emegbu nwee onwe ha. Ka m kwuputa afọ amara nke Dinwenu." O kpuchiri akwukwo ahụ nyeghachi ya onye na-aga ozi, bja nodu ala. Mmadụ niile no n'ulonzuko lekwasịrị ya anya. O malite igwa ha okwu si, "Taa, ka e mezuru na nti unu ihe e dere n'akwukwo nso a."
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu