Emume - Ntogha nke Pol di aso White

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Acts 22: 3-16
-
Abụọma na azịza ya
Ps 117: 1bc. 2
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaMk 16:15-18
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ : Acts 22: 3-16
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Pọl dị asọ degaara ndị Galeshịa
Pol gwara ha si, "Abụ m onye Juu. Amụrụ m n'obodo Tasusa nke Silisia. Azụrụ m na Jerusalem n'ebe a. Agara m akwụkwọ n'okpuru onye nkuzi Iwu Mosis, bụ Gamaliel. Anatara m ozuzu siri ike n'ime iwu nke nna anyị ha. Ejikwa m inụ oku n'obi na-efe Chineke dị ka unu niile si eme taa. Esoburu m, hụ na e gburu ndị niile na-eso ụzọ nke a. Ejidere m ha, ụmụnwaanyị! na ụmụirwoke, tuba ha n'ulomkporo dị iche iche. Onyeisi nchuaja, na nzuko ndị okenye ndị Juu niile bụ ndị akaebe m, na anatara m ha ọtụtụ akwụkwọ ozi inye ndị Juu ibe anyị ndị bi na Damaskos maka jkputa ndị na-eso ụzọ nke a, kee ha agbu, kpughachi ha na Jerusalem, ka ha taa ahuhu kwesiri ha." Mgbe m na-aga, na-abiaru nso na Damaskos, ihe dịka etiti ehihie, oke ìhè siri n'eluigwe bịa na mberede, gbuo m amụma gburugburu. Adara m n'ala, nu otu olu ka o na-asị, 'Sol! Sol! Gini mere i na-esogbu m?' Ajụrụ m ya si, 'I bu onye Onyenweanyi?' O siri m, 'Abụ m Jesu onye Nazaret, onye ị na-esogbu.' Ndị m na ha so n'ije hụrụ ìhè ahụ n'eziokwu, ma ha anughi olu onye ahụ nke na-agwa m okwu. Ajụrụ m si: 'Gịnị ka m ga-eme, Onyenweanyi?' Onyenweanyi siri m, 'Bilie, gaa banye Damaskos, n'ebe ahụ ka a ga-agwa gị ihe niile Chineke kwadobere na ị ga-eme.' Ahughị m ụzọ n'ihi oke mmukesi nke ìhè ahụ. N'ihi nke a, ndị m na ha so jidere m n'aka duru m bata Damaskos. "Otu nwoke bi na Damaskos, aha ya bụ Ananiyas, nwoke a bụ ezigbo onye na-ekpere Chineke dị ka iwu Mosis si di, onye ndị Juu niile bi na Damaskos na-asopuru. Nwoke a biakwutere m guzoro n'akuku m si: 'Sol, nwanne m, ka Chineke mee ka ị hụ ụzọ.' N'otu mgbe ahụ, asaghere m anya, hụ ya. O siri m, 'Chineke nke nna anyị ha ahọputala gị ka ị mara uche ya, ka! hụ onye eziomume ahụ, nu okwu si n'onu ya pụta. N'ihi na ị ga-abụ ya onye akaebe n'ebe mmadụ niile nọ, igwa ha ihe niile ị hụrụ na nke ị nuru. Ugbu a, gịnị ka ị na-eche? Bilie, ka e mee gị mmirichukwu, ka a sachapukwa mmehie gị niile, site n'ikpoku aha ya.'
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA : Ps 117: 1bc. 2
Azịza:Gaanu na mba niile, gbaasa ozioma nke Onyenweanyi
1. Toonu Onyenweanyi, mba niile,
Toonu ya, ndị mmadụ niile.
Az.Azịza:Gaanu na mba niile, gbaasa ozioma nke Onyenweanyi
2. N'ihina jhunaanya ya siri ike
nkwudosi ike ya na-adi okpu.
Azịza:Gaanu na mba niile, gbaasa ozioma nke Onyenweanyi
Mbeku:
Alleluia, Alleluia:
Ọ bụ gị na m hooro, kama ahọọrọ m gị;
weputakwa gị iche ka gị gaa mja otutụ mkpuru,
mkpuru nke ga-anogide.
Alleluia
OZIỌMA : Mk 16:15-18
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Jesu bjakwutere ụmụazu iri na otu, O gwara ha si, "Gaanu n'ụwa niile, kwusaaranu ihe niile e kere eke ozioma. Onye nke kwerenu, e mekwaa ya mmirichukwu, ka a ga-azo-puta, ma onye nke na-ekwenyeghi ka a ga-ama ikpe. Ihe jiri mba ndị a ga-esokwa ndị kwerenu: ha ga-achupu ajọ mmuo n'aha m; ha ga-ekwu okwu n'asụsụ dị iche iche. Ọ bụrụ na ha achiri agwọ n'aka, m ọ bụ na ha na-eweta onwu, ọ gaghi emery ha ahụ. Ha ga-ebikwasakwa ndị orja aka, ahụ ha adịkwa ha mma."
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu