Fraide Izu nke abụọ n'oge na-adanyeghi n'emume Francis de Sales, M - White

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Heb 8: 6-13
-
Abụọma na azịza ya
Ps 85: 8 and 10. 11-12. 13-14
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaMk 3:13-19
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ : Heb 8: 6-13
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Hibru
Ma otu o dịrị Kristi natara oru onye nchuaja nke dị elu karja nke ochie dị ka ogbugbandu ohuru ahu nke o dobere dị ka onye ogbugbo n'etiti Chineke na mmadụ si kara mma, n'ihina e dobere ya na nkwa ahu kacha mma. Ọ bụrụ na ogbugbandu nke mbu enweghi ntupo, a gaghịrị enwe ohere maka nke abụọ. Ma Chineke tara ndị nke ya ụta mgbe o kwuru si, "Lee, ụbọchị ndị ahụ ga-abịa," Yahweh na-ekwu, "mgbe m na ezinuulo Izrel na Juda ga-abịa n'ogbugbandu ohuru. Ọ gaghi adị ka ogbugbandu nke m na nna ha gbara mgbe m kpooro ha n'aka si n'ala Ijipt duga ha. Ha anọgideghị n'ogbugbandu nke m na ha gbara. M onwe m wee leghara ha anya, ọ bụ Yahweh na-ekwu. Nke a bụ ogbugbandu nke m na ụlọ Izrel ga-agba mgbe ụbọchị ndị ahụ gachara dị ka Yahweh si kwuo. Aga m etinye iwu m n'obi ha, aga m abụ Chineke ha, ha abụrụkwa ndị m. Mgbe ahụ, ọ dịghịkwa onye ọ bụla ga-akụziri ibe ya, ma ọ bụ onye ga-akụziri nwanne ya si, 'Mara Onyenweanyi'; n'ihi na ha niile ga-amata m site n'onye nta ruo n'onye ukwu. Aga m emere ha ebere na njo ha niile, a gaghi echetakwa njo ha ọzọ." Mgbe o na-ekwu maka ogbugbandu ohuru ahu, o na-ewe ogbugbandu ochie ahu ka ihe na-abaghị uru. The ọ bụla nke na-abaghị uru, nke na-akawanye nka na-esi n'anya apụ ngwangwa.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA : Ps 85: 8 and 10. 11-12. 13-14
Azịza: Irubeisi ga-esi n'ala pulite, eziomume ga-esi n'elu ledata anya.
Gosi anyị ịhụnanya gị dị okpu, O Onyenweanyi, nyekwa anyị nzoputa gị,
N'ezie, nzoputa ya dị nso maka ndi na-aturu ya egwu, anyị.
Ka ebube ya wee nogide n'ala anyi.
Azịza: Irubeisi ga-esi n'ala pulite, eziomume ga-esi n'elu ledata anya.
Ihụnanya na okwukwe amakuola, eziokwu na udo ebiela mma,
Irubeisi ga-esi n'ala pulite, eziomume ga-esi n'elu ledata anya.
Azịza: Irubeisi ga-esi n'ala pulite, eziomume ga-esi n'elu ledata anya.
Ee, Onyenweanyi ga-enye anyị oganiihu, ala anyị ga-amita mkpụrů bawanye.
Eziomume ga-aga n'ihu ya, udo ga na-eso nzo ukwu ya.
Azịza: Irubeisi ga-esi n'ala pulite, eziomume ga-esi n'elu ledata anya.
Mbeku:
Anaghị m akpokwa unu ndjodibo ọzọ,
n'ihi na odibo anaghị ama ihe Nna ya ukwu na-eme.
Kama ana m akpozi unu ndị enyi,
n'ihi na agwala m unu ihe niile m nuru n'onu Nna m.
Alleluia
OZIỌMA : Mk 3:13-19
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere
Jesu rigooro n'elu ugwu, bia kpoo ndị o choro ka ha biakwute ya; ha wee biakwute ya. O hoputara mmadụ iri na abuo, ndị o kporo ndịozi; ka ha na ya noro, ya na ka o zipukwa ha igbasa ozioma, ma nwekwaa ike jchu ajọmmụọ: Ha bụ Sajmon, onye o kporo Pita; Jemis na nwanne ya Jon, ụmụ Zebedi, ndị o kporo Boanajis, nke putara, ụmụ egbe eluigwe; Andru na Filip, Batolomiu, Matiu, Tomos, Jemis nwa Alfeus, Tadius, Sajmon onye Kana, na Judas Iskariot, onye raara ya nye.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu