Tọọzde Izu nke Abụọ n'oge na-adanyeghi n'emume Emerentiana - Green

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Heb 7: 25-8: 6
-
Abụọma na azịza ya
Ps 40: 7-8a. 8b-9. 10. 17
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaMk 3: 7-12
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ : Heb 7: 25-8: 6
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Hibru
N'ihi nke a, o nwere ike izoputa ndi niile si n'aka ya abiakwute Chineke mgbe niile, ebe o bu na o na-adi ndu mgbe niile, na-ariotara ha arịrịọ. Ọ bụ ihe ziri ezi na anyị ga-enwe ụdị onye nnukwu ụkọchukwu a, onye dị nso, na-enweghi ntupu nke o na-enwe atụrụ njọ. E si n'etiti ndị njọ kewapụta ya, ka ọ dị elu karịa eluigwe niile. Ọ dịghị ya mkpa ịkpụ aja kwa ụbọchị n'ihi njọ ya niile na n'ihi njọ nke ndị ozi dị ka ndị ụkọchukwu mgbe ochie. Ọ mere nke a otu mgbe site n'iji onwe ya chụo aja zuru ezu. N'ezie, iwu na-ahọpụta ndị mmadụ n'adịghị ike ka ha buru nnukwu ụkọchukwu. Ma okwu nke jụọ ikpe a nke na-esote iwu, họputara Nwa a, onye e mere ka ọ zuo oke ebeebe. Isiokwu nke ihe anyị na-ekwu bụ nke a: anyị nwere nnukwu ụkọchukwu dị otu a: onye na-anọdụ n'aka nri nke ocheeze onye kacha elu n'eluigwe. Onye na-efe ofufe n'ebe nso na n'ezi ụlọikwu nke na-abụghị mmadụ rụrụ, kama ọ bụ Yahweh rụrụ ya. N'ihina a na-echi onyeisi ụkọchukwu ọ bụla ka o na-eche onyinye na aja dị iche iche n'ihu Chineke. Ya bu na ọ dịịrị mkpa na onye ụkọchukwu aghaghị inwe ihe ọ ga-eji na-achuaja. Ọ bụrụ na ọ nọ n'ụwa, ọ gaghị abụ ụkọchukwu ma ọ bụ, ebe ọ bụ na e nwere ụkọchukwu ndị na-achuaja dị ka iwu si dị. Ha na-egosi nnomi na onyonyo ebe nsọ nke eluigwe n'ihina mgbe Mosis na-acho jiri ụlọikwu ahụ, Chineke duru ya otu si, "Hụ na ị mere ihe niile n'usoro ahụ e gosiri gị n'elu ugwu." Ma otu ọ dị, Kristi natara ọrụ onye ụkọchukwu nke dị elu karịa nke ochie dị ka ogbugbandu ohuru ahụ nke o dobere dịka onye ogbugbo n'etiti Chineke na mmadụ si kara mma, n'ihina e dobere ya na nkwa ahụ kacha mma.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA : Ps 40: 7-8a. 8b-9. 10. 17
Azịza: A nọ m ehee a, a bịa ra m ime uche gị!
1. Anaghị m achọ ịkpụ aja ma ọ bụ ihe nrunye kama ntị ghee oghere.
Anaghị m achọ ịkpụ aja n'usoro ọkụkú ma ọ bụ maka njọ.
Kama ekwuru m sị, "A nọ m ebe a, ana m abịa."
N'ime akwụkwọ iwu e dere na m tosi ime uche gị.
Chineke m, ahụrụ m iwu gị n'anya,
Ejim obi m niile hụ ya n'anya.
Azịza: A nọ m ehee a, a bịa ra m ime uche gị!
2. Ekwuputala m ezi omume nke Onyenwe anyị na nnukwu ogbako.
Lee, emechighi m ọnụ m, ị maara nke a Okwu Onyenwe anyị.
Azịza: A nọ m ehee a, a bịa ra m ime uche gị!
3. Ka ha jupụta na-anụrịrị bụ ndị niile na-achọ gị
Ka ha na-ekwu oge niile si,
Onyenwe anyị dị ukwuu.
Azịza: A nọ m ehee a, a bịa ra m ime uche gị!
Mbeku:
Alleluia, Alleluia:
Ana m eche Onyenwe anyị,
mkpụrụ obi m na-eche ya,
na nkwa ya ka m nwere nchekwube.
Alleluia
OZIỌMA : Mk 3: 7-12
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere
Jesu na ndị na-eso ụzọ ya siri ebe ahụ pụọ, gaa n'akuku osimiri. Oke igwe mmadụ si na Galili sọrọ ya; si kwa na Judia, na Jerusalem, Idumia na ala dị n'ofe osimiri Jodan, ruo obodo ndị dị Taya na Sidon nso, mgbe ha nuru ihe niile o mere. O gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha dozie ya otu ugbo mmiri, ka oke igwe mmadụ ahụ ghara ikpagbu ya; n'ihina o gwoola ọtụtụ mmadụ, nke mere na ndị niile nwere ọrịa dị iche iche ji achọsi ike ka ha metụ ya aka. Ma oge ọ bụla ndị mmụọ ọjọọ ji hụ ya, ha na-ada n'ala n'ihu ya na-eti mkpu si, "Ị bụ Nwa Chineke!" Jesu nyere ha iwu ike ka ha ghara ime ka a mata ya.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu