Emume Ncheta Nke Vincent of Saragossa/Vincent Pallotti - Green

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Heb 7: 1-3, 15-17
-
Abụọma na azịza ya
Ps 110: 1, 2, 3, 4
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaMk 3: 1-6
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ : Heb 7: 1-3, 15-17
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Pọl dị asọ degaara ndị Galeshịa
Melkizedek, eze nke Salem, onye nchuaja nke Chineke kacha elu, zutere Abraham ka o si agha o gburu ndieze na-alota, ma gozie ya. Abraham nyekwara ya otu ụzọ n'ịbụ iri ihe niile nke ọ nwere. Ọ bụ onye mbụ site na ntughari nke aha ya, "Eze nke eziomume." Ọ bụkwa eze nke Salem, nke bụ, "eze nke udo." Ọ nweghi nne ma ọ bụ nna, nke ọ na-enwe agburụ. Ọ nwekwaghi isi mbido, nke ọ na-enwe isi njedebe. Ọ yiri Nwa nke Chukwu. Ọ ga-abugide onye nchuaja ruo ebeebe. The anyi na-ekwu putara ihè karja mgbe onye nchuaja ọzọ yiri Melkizedek putara. Onye bụụrụ ukochukwu n'esiteghi n'ochicho nke iwu, gbasara omumụ nke any ahụ, kama, ọ bụ site n'ike ndu na-enweghi mbibi. A gbara akaebe banyere ya n'akwukwo nso si, "Ị bụ ukochukwu ebeebe, n'usoro nke Melkizedek."
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA: Ps 110: 1, 2, 3, 4
Azịza : Ị bụ ukochukwu ebeebe n'usoro nke Melkizedek.
1. Dinwenu gwara gi nna m ukwu si,
"Noro ala n'aka nri m,
aga meme ndiiro gi ihe mgbakwasa ukwu gi."
Azịza : Ị bụ ukochukwu ebeebe n'usoro nke Melkizedek.
2. Onyenweanyi, ga-amanye ndiiro gi niile,
ka ha noro n'okpuru ochichi gi na Zayon.
Azịza : Ị bụ ukochukwu ebeebe n'usoro nke Melkizedek.
3. Ugwueze bụ nke gi bido n'ubochi
a muru gi n'elu ugwu di nso;
ị bụ eze site n'afo, bido n'isi ututu nke ndu gi.
Azịza : Ị bụ ukochukwu ebeebe n'usoro nke Melkizedek.
4. Onyenweanyi anuola iyi nke na o gaghi ala azu na ya;
ị bụ ukochukwu ebeeben'usoro nke Melkizedek.
Azịza : Ị bụ ukochukwu ebeebe n'usoro nke Melkizedek.
Mbekụ:
Alleluia, Alleluia:
Nye m nghọta ka m nwee ike iji obi m niile debe iwu gị.
Alleluia
OZIỌMA : Mk 3: 1-6
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Jesu banyere ozo n'ulonzuko ha, ma otu nwoke aka ya kponwuru akponwu nọ ebe ahụ. Ufodụ mmadu nọkwa ebe ahụ na-eche ka ha mara ma o ga-aru oru igwo mmadu n'ubochi Sabat, ka ha wee bo ya ebubo. Jesu siri nwoke ahụ aka ya kponwuru akponwu, "Bia ebe a." Ọ wee juo ndị ahụ si, "O ziri ezi n'iwu ime iheoma n'ubochi Sabat ka ọ bụ ime ihe ojoo, ịzoputa ndu ka ọ bụ ila ya n'iyi?" Ma ha gbara nkiti. Jesu jiri iwe lezuo ha anya. Ọ wutere ya n'ihi obi ikponku ha. Ọ sirị nwoke ahụ, "Gbatia aka gi." Ọ gbatiri ya, aka ya wee dikwa mma ọzọ. N'ihi nke a, ndị Farisii siri n'ulonzuko pụọ; ha na ndị otu Heroda gbara izu ozigbo ahụ otu ha ga-esi gbuo Jesu.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu