MONDE Emume Ncheta nke Cyprian M.I. Tansi dị Ngọzị – White

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Philippians 2:1-11
-
Abụọma na azịza ya
Ps Is 12:2-3, 4bcde, 5-6
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaMatthew 13:44-46
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ : Philippians 2:1-11
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Pọl dị asọ degaara ndị Filipians
O burụ na e nwere agbamume n'ime Kristi, ihe na-akpalite ịhụnanya, mmekọta n'ime Mmụọ, obi ebere na ihe ọ bụla dị gịrịgịrị, mejuputa m obi site n'inwe otu obi, otu ịhụnanya, ịdị n'otu, na inwe otu uche. Unu emela ihe ọ bụla n'ịchọ ọdịmma nke onwe unu, ma n'obi umeala, hu onye ọzọ ka o buru unụ elu. Ka onye ọ bụla n'ime unu ghara ịnọchọ naanị ọdịmma nke onwe ya, kama ịkọwa ọdịmma nke ndị ọzọ. Nwee ụdị obi dị na Kristi Jisus n'etiti unu. Onye agbanyeghị na ọ dị n'ụdị Chineke, ma o wepụtaghị onwe ya na ya na Chineke hà dịka ihe ọ ga-ejide aka. Ọ butere onwe ya ala, were onwe ya n'ọnọdụ ohu, a mụọ ya n'ụdị mmadụ. A hụrụ ya n'ọnọdụ mmadụ, ọ butere onwe ya ala wee rubere isi ruo n'onwụ, onwụ n'obe. Maka nke a, Chineke buliri ya elu, nye ya aha kacha elu n'aha niile, ka ọ bụrụ na n'aha Jisus, ikpere niile ga-egbughị n'ala, ma ndị dị n'eluigwe, ma ndị dị n'ụwa, na ndị dị n'okpuru ụwa, na ire niile ga-ekwupụta na Jisus Kristi bụ Dinwenu maka otito nke Chineke Nna.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA : Ps Is 12:2-3, 4bcde, 5-6
Azịza: Unu ga-eji ọṅụ kuru mmiri n'úmi nke nzọpụta.
Lee, Chineke bụ onye nzọpụta m;
enweghị m nchekwube, egwu agaghị egbu m;
n'ihi na Yahweh Chineke bụ ike m na abụ m,
Ọ bụ onye nzọpụta m.
Unu ga-eji ọṅụ kuru mmiri n'úmi nke nzọpụta.
Azịza: Unu ga-eji ọṅụ kuru mmiri n'úmi nke nzọpụta.
Nyenu Chineke ekele, kpọkuonu aha ya,
mee ka a mara aka ọrụ ya n'ebe mba niile nọ,
kwupụta aha ya dị elu.
Azịza: Unu ga-eji ọṅụ kuru mmiri n'úmi nke nzọpụta.
Bụrụọnụ Yahweh abụ ọma,
n'ihi na Ọ rụrụ ọtụtụ ọrụ ebube;
mee ka ụwa niile nụ ya. Tisị m mkpu ike,
kwere nu ukwe ọnụ, unu ndị bi na Zayon,
n'ihi na Onye nọ n'etiti unu bụ nnukwu Onye Dị Nsọ nke Izrel.
Azịza: Unu ga-eji ọṅụ kuru mmiri n'úmi nke nzọpụta.
Mbeku:
Alleluia, Alleluia:
Ọ mebiri onwụ, wetara anyị ndụ,
bụ onye mere ka anyanwụ pụta ihe site n'ozioma ahụ.
Alleluia
OZIỌMA : Matthew 13:44-46
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
O kwuru kwa ha okwu ọzọ n'ụkàbụlị sị, "Alaeze eluigwe dị ka akụ e zoro n'ubi nke otu nwoke hụrụ, wee kpuchie ya ihe; ọ lara n'obi ọṅụ ree ihe niile ọ nwere, wee zụta ubi ahụ.
"Alaeze eluigwe dịkwa ka onye na-azụ ahịa nke na-achọ ụlàrị ọma. Mgbe ọ hụrụ otu ụlàrị dị oke ọnụ, ọ lara ree ihe niile ọ nwere, wee zụta ụlàrị ahụ."
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu