SONDE: UKA NKE ABỤO NA-OGE ADANYEGHI N'EMUME. Psalter Week 2 – Green

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Is 62: 1-5
-
Abụọma na azịza ya
Ps 96: 1-2. 2-3. 7-8. 9-10
-
Ihe ọgụgụ nke abụọ
1 Cor 12: 4-11
- OziọmaJn 2: 1-12
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ : Is 62: 1-5
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Aịzaya
Maka Zayon, agaghị m agbachi nkịtị; maka Jerusalem, agaghị m ezu ike ruo mgbe ikpe nkwụmoto ya ga-achawapụta dịka ìhè ụtụtụ, nzọpụta ya ana-enwu dịka ọkụ. Mba niile ga-ahụ ikpe nkwụmoto gị, ndị eze niile ga-ahụ ebube gị. A ga-akpọ gị aha ọhụrụ nke Yahweh ga-enye. Ị ga-abụ okpueze mara mma n'aka Chineke, okpueze nke ike ọchịchị n'aka Chineke gị. A gaghi ewekwa gị dịka onye a jụrụ ajụ. Ala gị agaghị abụkwa ihe tọrọ n'akpụkpọ. Kama a ga-akpọ gị "Omasiri m", a ga-akpọkwa ala gị "Nwanyị e jiri gbaa akwụkwọ", n'ihi na ị masiri Chineke. Ala gị ga-agbakwa akwụkwọ. Dịka nwa okorobịa si alụ nwa agbọghọ na-amaghị nwoke, otu ahụ ka ụmụ gị ndị nwoke ga-esi alụ gị. Dịka nwoke lụrụ nwaanyị ọhụrụ si enwe obi ụtọ na nwunye ya, otu ahụ ka Chineke gị ga-esi enwe obi ụtọ n'ebe ị nọ.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA: Ps 96: 1-2. 2-3. 7-8. 9-10
Azịza: Kwuputanu ọrụ itunanya nke Dinwenu n’etiti mmadụ niile.
1. Kweerenu Dinwenu ukwe ọhụrụ.
Mba niile, kweerenu Ya ukwe gozie aha Ya.
Azịza: Kwuputanu enyemaka Ya kwa ụbọchị;
Kwuputanu ọrụ itunanya Ya n’etiti mmadụ niile.
Azịza: Kwuputanu ọrụ itunanya nke Dinwenu n’etiti mmadụ niile.
2. Ezinụlọ mmadụ niile nyenu Dinwenu,
Nyenu Dinwenu otito na ike.
Nyenu Ya otito dịrị aha Ya.
Azịza: Kwuputanu ọrụ itunanya nke Dinwenu n’etiti mmadụ niile.
3. Sekpọrọnu Dinwenu n'ime ụlọ Nsọ Ya;
Uwa niile, tuwa Ya egwu,
Kwuputanu na mba niile na "Chineke bụ eze".
O ga-eji aka ikpe nkwụmoto kpee mmadụ niile ikpe.
Azịza: Kwuputanu ọrụ itunanya nke Dinwenu n’etiti mmadụ niile.
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ : 1 Cor 12: 4-11
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Pọl dị asọ degaara ndị Kọrintias
Onyinye amara dị iche iche dị, ma otu Mmụọ Nsọ ahụ na-enye ha niile. E nwekwara ụdị ọrụ di iche iche, ma ọ bụ otu Dinwenu ahụ ka a na-ejere ozi. Ụdị ike dị iche iche nke e ji arụ ọrụ, dịkwa, ma otu Chineke ahụ na-etinye ike ndị a n'ime onye ọbụla iji jee ozi. O na-enyekwa onye ọbụla amara igosi ike nke Mmụọ Nsọ maka ọdịmma mmadụ niile. Otu o di, otu Mmụọ Nsọ ahụ na-enye otu onye ike ikwuputa ihe ọmụma, site n'otu Mmụọ ahụ. Otu Mmụọ Nsọ ahụ na-enye otu onye okwukwe siri ike, na-enyekwa onye ọzọ ike igwọ ndị ọrịa. O na-enyekwa onye ọzọ ike iji rụọ ọrụ ebube, na-enyekwa onye ọzọ ike ibu amụma, na-enyekwa onye ọzọ ike ịtụle mmụọ dị iche iche. O na-enye otu onye ike ịsụ asụsụ dị iche iche. Onye ọ bụla n'ime ha na-enweta ikike site n'otu Mmụọ Nsọ, dịka o si họrọ.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
Mbeku:
Alleluia, Alleluia:
Ekene dịrị ChukwuOnyenweanyi,
okwu gị bụ mmụọ; ha bụ ndụ.
O bụ gị ji okwu nke ndụ ebighị ebi.
Alleluia
OZIỌMA : Jn 2: 1-12
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere
N'ụbọchị nke atọ, e nwere oriri agbamakwụkwọ na Kena, Galili, nne Jesu gara ebe ahụ. E zikwara Jesu na ndị na-eso ụzọ ya n'oriri agbamakwụkwọ ahụ. Mgbe mmanya gwụchara, nne Jesu gwara ya, "Ha enweghizi mmanya." Jesu zara ya sị, "Nwanyị, kedụ ka nke a si gbasara mụ na gị? Oge nke m erubeghi." Nne ya gwara ndị na-eje ozi, "Mee ihe ọbụla ọ sịrị unu mee." Dika omenaala nke Juu siri dị, ite mmiri nkume isii dị n'ebe ahụ. Ọ bụla n'ime ha na-eri ihe dị ka udu mmiri iri abụọ ma ọ bụ iri atọ. Jesu gwara ha sị, "Gbajupụta ha n'ọnụ." O sịrị ha, "Ngwa, gbanwee udo a bugara onye isi oriri." Mgbe onye isi oriri detụrụ mmiri ahụ e mere ka ọ bụrụ mmanya, o maghị ebe o si pụta (ma ndị na-eje ozi maara ebe ọ si). Ọ kpọpụtara nwoke a na-alụ nwanyị, sị ya, "Onye ọbụla na-ebute mmanya dị ụtọ mbụ, mgbe ndị mmadụ juputara, ọ na-ebute nke na-adịchaghị mma. Ma gị onwe gị hapụrụ ibute mmanya dị ụtọ ruo ugbu a." Nke a bụ ọrụ ebube mbụ n'ime ọrụ ebube ya niile. Ọ rụrụ ya na Kena nke Galili, o gosipụtara ebube ya, ndị na-eso ụzọ ya kwekwara na ya. Mgbe nke a gasịrị, Jesu gbadara na Kapanaum, ya na nne ya, ụmụnne ya na ndị na-eso ụzọ ya. Ha nọrọ ebe ahụ ụbọchị ole na ole.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu