Satode Izu nke mbu n'oge na-adanyeghi n'emume St. Emilie de Vialar - Green (JAN 18 SATURDAY)

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Heb 4:12-16
-
Abụọma na azịza ya
Ps 19: 8, 9, 10, 15
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaMk 2:13-17
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ : Heb 4:12-16
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Pọl dị asọ degaara ndị Hibru
Okwu Chineke dị ndụ, dị ike, o di nko karịa mma agha ihu abụọ. Ọ na-amịba ruo na njikọ mkpụrụobi na mmụọ, nkwonkwo na ụmụjọọkpụkpụ. Ọ bụkwa ihe nwere ike nyochaa echiche na ebumnuche nile nke obi. Ọ dịghị ihe e kere eke zoro ezo n’ihu Chineke, kama ihe niile gba ọtọ, gherekwa oghe n’anya ya. Ọ bụkwa ya ka anyị ga-aza ajụjụ banyere onwe anyị. Ebe ọ bụ na anyị nwere nnukwu onye isi nchụàjà, onye nke gafereala n'eluigwe, Jesu, Nwa Chineke, ka anyị jidesie okwukwe anyị ike. Onye isi nchụàjà anyị nwere abụghị onye na-enweghị obi ebere n’ebe adịghị ike anyị nọ, kama anyị nwere onye isi nchụàjà nke e nwalela n'ụzọ niile otu e si anwa anyị, ma o meghị ihe ọjọọ. Ya mere, ka anyị were ntukwasi obi bịaruo nso n’ocheeze nke amara, iji nata ebere na ịchọta amara n’oge ọ bụla anyị nọ n'ọnọdụ mkpa.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA: Ps 19: 8, 9, 10, 15
Azịza: Okwu ndi m gwara unu bu mmụọ, burukwa ndụ.
1. Iwu nke Onyenweanyi zuru oke,
O na-enye mkpụrụobi ndụ ọhụụ;
Atụmatu Onyenweanyi kwesiri ntukwasi obi,
O na-enye ndị dị umeala amamihe.
Azịza: Okwu ndi m gwara unu bu mmụọ, burukwa ndụ.
2. Iwu nke Onyenweanyi bụ eziokwu,
O na-enye obi anuri;
Iwu nke Onyenweanyi pụtara ihe,
ọ bụ ihe e ji ahụ ụzọ.
Azịza: Okwu ndi m gwara unu bu mmụọ, burukwa ndụ.
3. Ịtụ egwu Onyenweanyi bu ihe dị mma,
O na-adị ebeebe;
Ikpe nke Onyenweanyi bụ eziokwu;
Ha niile bụ otu.
Azịza: Okwu ndi m gwara unu bu mmụọ, burukwa ndụ.
Mee ka okwu niile si n'onu m apụta n'oge niile,
na echiche obi m niile dị mma n'ịhụ gị,
Onyenweanyi nkume m, na Onye nzọpụta m.
Azịza: Okwu ndi m gwara unu bu mmụọ, burukwa ndụ.
Mbeku:
Alleluia, Alleluia:
Oseburuwa! Ike gị na-enye eze anuri.
Alleluia
OZIỌMA : Mk 2:13-17
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere
Jesu laghachiri ọzọ n'akụkụ osimiri, igwe mmadụ ahú niile wee gbakọọ ya gburugburu, ọ malitere ịkụziri ha ihe. Ma ka Ọ na-agafe, ọ hụrụ Levi, nwa Alfeus, ka ọ nọ n'ụlọtụ na-anakọta ụtụ; ọ sịrị ya, "Sobe m." Ọ biliri wee soro ya. Ma ka Jesu nọ n’oche nri n’ụlọ Levi, ọtụtụ ndị onwe ha tọhapụrụ na ndị omenjo soro Jesu na ndị na-eso ụzọ ya nọ ebe ahụ. Mgbe ndị odeakwụkwọ nke ndị Farisii hụrụ na Jesu nọ na ndị onwe ha tọhapụrụ na ndị omenjo eri nri, ha jụrụ ndị na-eso ụzọ ya sị, "Gịnị mere ya na ndị onwe ha tọhapụrụ na ndị omenjo ji eri nri?" Mgbe Jesu nụrụ ya, ọ sịrị ha, "Mkpa dibịa anaghị akpa ndị ahụ dịrị ná mma, kama ndị ahụ na-adịghị mma. Ezigbo mmadụ abịaghị m ịkpọ, kama ndị mmehie."
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu